Thursday, May 16, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

 Ḿbà, ọ́gwụ̀ ḿkpụ́rụ paracetamol énweghị ọ́rị́à ńjé Machupo

 Ḿbà, ọ́gwụ̀ ḿkpụ́rụ paracetamol énweghị ọ́rị́à ńjé Machupo
August 21
14:04 2023

Ótù ozi a hụtara n’ọ́bá ozi WhatsApp aduọla ọtụtụ ọ́dụ̀ màkà ịṅụ ọgwụ paracetamol, ọkachasị nke e dere “P/500” n’ahụ ya.

Ozi a dọrọ aka na ntị n’ọgwụ à nwere ọrịa nje Machupo. Ọ kọwara na onye ọbụla ṅụrụ ya ga-ebute  ọrịa a.

“Kpachara anya kà ị ghara ịṅụ Paracetamol nke e dere P-500 n’ahụ ya. Ọ pụtara ọhụrụ ma na-achakwa ezigbo ocha. Ndị dọkịta kwuru na o nwere ọrịa nje Machupo nke a sị na ọ bụ ótù n’ime ọrịa nje kacha egbu-egbu n’ụwa niile,” ihe à kà ọzị à kwuru.

Advertisement

Ọ bụghị naanị n’ọba ozi WhatsApp kà a hụtara ozi a. Ozi a pụtakwara na Facebook.

“Biko gbasaa ozi a kà ó rúó ákàrà ndị niile nọ na ekwentị gị, mà ndị ezinụlọ gị. Nke à bụ màkà ịzọ ndụ. Emego m nke dị m n’áká. Ugbua, Odizi gi n’aka ịme nke gị áká… Chetakwa na ọ bụ ndị na-enyere onwe ha nà ndị mmadụ áká kà Chineke na-enyere áká! Kesaa k’isi nweta,” ihe à kà ozi à kwuru nà Facebook.

Ọzị a ekwughị mà ònwèrè onye dọkịta m’ọbụ ụlọ mmepụta ọgwụ á kpọtụrụ màkà nya bụ ókwú, ịchọpụta ma ọ bụ eziokwu.

Advertisement

Paracetamol bụ ọgwụ na-akwụsị àhụ́ mgbu nke ndị dibịa oyibo ji àgwọ́kwá obere ahụ ọkụ. Ọnụ ọgụgụ ọgwụ paracetamol ǹkè okenye kwesịrị ịṅụ pụtara milligram narị ịse maọbụ ótù gram.

Machupo bụ ọrịa esi n’anụmanụ ebute nke amara dịka black typhus maọbụ Bolivan hemorrhagic fever. A chọpụtara ya n’ọnwa 1959 na Bolivia, mà kwupụta nà ndị butere nya bụ ọrịa nọ nanị n’obodo South Africa.

Dịka Mahadum Standford kwụrụ, ọrịa nje a na-agbasa site n’ikuku, nri, maọbụ mmekọrịta gị n’onye bu ọrịa a.

Advertisement

Mana mkpụrụ ọgwụ Paracetamol ò nwèrè nje Machupo n’ime ya?

ŃCHỌ́PỤ̀TÁ

Nnyocha TheCable mere gosịrị nà okwu à bidoro ń’éfèghárị́ n’ọba ozi dị iche-iche n’afọ 2017, nke mere kà ọtụtụ ndị mbipụta akụkọ kwupụta nà nya bụ ókwú abụghị eziokwu.

N’afọ 2017, ngalaba na-ahụ màkà ahụike n’obodo Malaysia kwùrù nà ozi a bụ àsị́.

Advertisement

Ngalaba à gbakwunyere sị nà ha enwetaghị ozi ọbụla nà paracetamol nwere ọrịa nje Machupo n’ime ya n’aka ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ịrụpụta ọgwụ n’obodo ha maọbụ obodo ndị ọzọ.

N’ụbọchị asaa nke ọnwa May, ngalaba na-ahụ màkà njikwa ọgwụ na Zambia, nke bụ Zambia Medicines Regulatory Authority, bipụtara ozi sị na ókwú a na-agbasa na soshal midia “bụ ókwú ụgha ma bụrụkwa nke ndị mmadụ ekwesịghị itinye uche na ya”.

Advertisement

Ngalaba à gbakwunyere na o nweghị ihe na-egosị na ndị niile ekwuputara bú ọrịa Machupu butere ya site n’ịṅụ ọgwụ paracetamol.

Nonso Odili, onye na-ere ọgwụ mà bụrụkwa onye ụlọrụ DrugIT, gwara TheCable nà ozi a bụ nnọ asị, mà bụrụkwa ozi n’ezighi-ezi nke ekwutọgoro ọtụtụ oge.

Advertisement

“Ozi a bụ ozi ochie. O nwere mgbe o na-efeghari ọtụtụ oge gara-aga. Anyị pụtakwara sị na ọbụghị eziokwu. Mgbe ahụ, WHO na NAFDAC ekwughị ihe ọbụla gbasara ya. O nwere ike bụrụ nà ọbaghị uru,” ihe à kà Odili kwuru.

“O dị mkpa ka anyị ṅụọ ọgwụ nwere ákàrà NAFDAC n’ahụ ya.”

Advertisement

Onye ọzọ tunyekwara ọnụ n’okwu a bụ Olusayo Akintola, onye na-ekwuchitere ngalaba na-ahụ màkà njikwa ọgwụ n’ala Naijiria bụ National Agency for Food and Drug Administration (NAFDAC), kwuru na e kwesịrị kà eleghara okwu à anya n’ihi na o nweghị nnyocha ndị oyibo sochiri ya bụ okwu.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ozi wuru èwù nà ọgwụ paracetamol nwèrè ọrịa nje Machupo n’ime ya bụ asị. Ókwú ụgha à nke na-apụta kwa mgbe kwa mgbe bụ nke e zisagoro n’ọtụtụ obodo, ma bụrụkwa nke ekwuputagoro ọtụtụ mgbe dịka asị.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.