Tuesday, April 23, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Lawan ọ̀ hápụ̀rụ̀ APC gáwá PDP?

Lawan ọ̀ hápụ̀rụ̀ APC gáwá PDP?
June 21
18:50 2022

Ubọsi iri na asaa n’onwa June, akụkọ wùrù na Ahmad Lawan, onye isi óche sineti, gbanwere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ụfọdụ ihe ndị mmadụ dere na Twitter na-akọwa na Lawan hapụrụ otu na-achị nke bụ All Progressive Congress (APC) gáá Peoples Democratic party (PDP).

Onye ọha na-aza Mustapha Kehinde dèrè na Twitter sị: “Ahmad Lawan hapụrụ APC gaa PDP ka o naghachie n’oche ya. Ọ bụghị na ọ chọ̀rọ̀ ị́rụ ọrụ na mpaghara ya. Ihe mmụta nke mbụ: Sọ̀ àkpà há dị ha ḿkpà.

Advertisement

É kèrè edemede a ugboro otu puku na narị anọ ná ịrị anọ na asatọ. Ndị ozi a masịrị rùrù puku anọ na narị ise na asatọ.

Ndị ọrụ mgbasa ozi na Twitter bụ́ Goldmyne TV gbásàrà ozi a. Ndị ná-ésò ha karịrị puku iri ise.

Advertisement

 

NDABERE OZI

Na mbụ, Abdullahi Adamu, onye isi óche APC, kwuru na Lawan bụ onye ndọrọ ndọrọ oche onyeisi nke ọ̀tụ́tụ́ ndị òtù APC kwènyèrè.

Lawan mèchàrà soro zọ́ọ́ votu na ntụlị aka nke mbụ.

Advertisement

Ọ́ pụtara onye nke anọ, nwee votu otu narị na iri ịse na abụọ.

Bola Tinubu, onye bụ onye ịsị óche mbụ na Lagos, napụrụ onye ịsị óche sineti ike.

Votu ya niine bu otu puku na narị abụọ na iri asaá na ọtụ.

NCHỌPỤTA

Advertisement

Oge akụkọ a nà-àgbá okirikiri na Twitter, akwụkwọ akụkọ TheCable chọpụtara na onweghị usoro mgbasa ozi kwesịrị ntụkwasị obi déré màkà ebubo nruhie Lawan.

Ubosi Satodee, n’okwu Ola Awoniyi, onye ndụmọdụ pụrụ iche nya bụ onye ịsị óche sineti, sị na ozi banyere nruhie Lawan abụghị eziokwu.

Advertisement

Na mbụ n’izu, Lawan kwùrù màkà senator abụọ bụ ndị Kebbi ógè a na-eme plenary na ubọsị iri na anọ n’ọnwa June.

Yahaya Abdullahi, senator nọchiri anya Kebbi north, na Adamu Aliero, senator nọchiri Kebbi central, dere edemede íkwu maka nruhie ha. Há sì nà APC bànyé PDP.

Advertisement

Awoniyi sị na ọ bụ ihe onyonyo ébé onye ịsị óche sineti gụ̀rụ̀ edemede senator Aliero dèrè butere echiche ezighị ezi.

Ọ gàrà n’ihu ịkọwa na ihe onyonyo nke ezigbo nke Lawan gụrụ édémédé Aliero dere lụrụ nkeji atọ na sekọnd iri atọ.

Advertisement

Ọ si na onyonyo ahụ ka e deziri lụọ sekọnd iri abụọ na isii.

E were onyonyo ahụ nke n’ezuhi ezu were na atụrụ ndị ọha asị.

IKPE

Akụkọ na onye ịsị óche sineti Ahmad Lawan hapụrụ APC wéé gaa PDP bụ okwu adịgboroja.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.