Monday, April 29, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Bill Gates èbúbàtàrà óríà diphtheria nà Naijiria?

Bill Gates èbúbàtàrà óríà diphtheria nà Naijiria?
July 19
20:29 2023

Ị́dọ áká n’ńtị̀: Ákụ́kọ́ à nwèrè fòtó na-awụ ákpátá óyi

Ọbụrụ nà ị́bụ̀ onye Naijiria márá ịhe akụkọ na-ekwu, ó nwèrè ike pụ̀tá nà ịnụla màkà ọrịa Diphtheria ǹké na-efè nà Abuja.

Diphtheria bụ ọrịa bakteria nke na-egbu egbu. Ụdị bakteria na-akpata ya bụ nke a na-akpọ Corynebacterium, nke na-emetụta imi, akpịrị, ma anụ ahụ mmadụ ụfọdụ m̀gbè.

Njirimara na-egosi nà mmadụ bù diphtheria gunyere ahụ ọkụ, imi ịgba mmiri, ọ́nyá akpịrị, ụkwara, anya ịcha obara-obara, akpịrị ịza-aza ya na nsogbu íkù ímé.

Advertisement

Ibelata ọrịa a, ulọrụ màkà mgbochi ọrịa ụmụaka bụ́ Nigeria Childhood Immunisation Schedule họpụtara ọgwụ vaccine atọ màkà ụmụ ntakịrị izu ụka isii, iri, na iri n’ano.

N’agbanyeghị na ọchịchị etịtị, site n’ụlọ ọrụ màkà njikwa ọrịa bụ́ Nigeria Center for Disease Control (NCDC) na-agba mgbọ igbochi ọha, ụfọdụ mmadụ na-atụ aro na ọ bụ Bill Gates, onye òsò-àchị́ ǹké Bill and Melinda Gates Foundation, nwere áká na ntiwapụ ọrịa diphtheria na Naijiria.

N’ọnwa June, Gates bịara Naijiria ka ya na ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu kpaa gbasara ahụ ike nke ụwa niile na mmepe obodo.

Advertisement

Njem ya bidoro n’Abuja ebe ya na Bola Tinubu, onyeisiala Naijiria, nwèrè nzukọ. Gates mèchàrà gaa obodo Niger Republic, maghị naghachita Lagos isonye na mmemme ndị ntorobịa.

N’ubochi atọ nke ọnwa Julai, dịka Gate naghachiri mba US, Federal Capital Territory Administration (FCTA), ngalaba ọchịchị màkà ịsị obodo bụ Abuja, kwuputara okwu sị nà ọrịa diphtheria etiwala nà Abuja.

FCTA sị na ha chọpụtara nke a site na nnyocha ha mèrè màkà ótu obodo dị ǹsó na mkpaghara Abuja nke a na-akpọ Dei-Dei.

Sadiq Abdulrahman, onye ntụziaka FCT n’ime ngalaba màkà ahụike ọha, kwuru na nwatakịrị dị naani afọ anọ nwụrụ màkà nya bụ ọrịa.

Advertisement

N’ihi na Gates bịara Nigeria na nsonso a, ọtụtụ mmadụ bịdọrọ kwube na obịbịa ya nwere áká ná ntiwapụ nya bụ ọrịa.

TheCable chọtara ọtụtụ okwu ụmụ afọ Naijiria na mgbasa ozi ọha soshal midia, nke n’atụ aka na Gates bubatara ọrịa a na Naijiria.

Advertisement

Nke a atụghị anyi n’anya, ebe ọ bụ na ọha atala Gates ụta mbụ n’obụ ya mepụtara COVID iji belata ọnụ ọgụgụ mmadụ ma nweta ego.

Ònwèrè kà njem Gates bịara na Naijiria sìrì gbasata ntiwapụ ọrịa diphtheria n’ala anyị?

Iji zaa nkea, anyị lere anya n’akụkọ mere-eme oge mbụ.

NTIWAPỤ ỌRỊA DIPHTHERIA ABỤGHỊ IHE ỌHỤRỤ

Diphtheria abụghị ọrịa ọhụrụ n’obodo Naijiria. Abuja abụghị steeti mbụ a na-ahụta nya bụ ọrịa.

N’afọ iri na abụọ gara-aga, n’etiti ọnwa Febụwarị na ọnwa Novemba nke 2011, ọrịa diphtheria tiwara n’obodo Kimba nke dị na Borno steeti, yana gburugburu  ya.

Achọpụtara na mmadu iri itoolu na asatọ bụ ndị butere nya bụ ọrịa. Mmadụ iri abụọ  na ótù nwụrụ n’oge ahụ.

M̀gbè ahụ, ulọrụ NCDC kwuru na ihe kpatara ntiwapụ ọrịa a na ọtụtụ ọnwụ ha hụrụ bụ ọgwụ mgbochi nke n’ezughị ebe niile, ma igbu oge n’ichọpụta nya bụ ọrịa.

N’ọnwa Dezemba nke 2022, ulọrụ NCDC chọpụtara ntiwapụ ọria diphtheria ọzọ na Kano, Lagos, yana ọtụtụ steeti ọzọ dịka Kastina, Crossriver, Kaduna, Osun, na FCT.

N’etiti ọnwa December nke afọ garara-aga na ụbọchị iri atọ nke ọnwa June, enwela ọnụ ọgụgụ mmadụ nari asaa na iri itoolu n’asato butere ọrịa diphtheria, ebe mmadụ iri asatọ anwụọla na local gọọmenti iri atọ na atọ dị na steeti asatọ.

Nanị ótù onye butere ọrịa a na Abuja. Nanị ótù onye nwụrụ na nya bụ isi obodo.

NCHỊKỌTA

Ebubo na Gates bụ onye butere ntiwapụ ọrịa diphtheria na Naijiria bụ asị.

Obodo Naijiria enwela ọtụtụ ọnụọgụgụ mmadụ butere ọrịa diphtheria na steeti Borno, n’afọ iri na abụọ gara-aga, ma kwuputakwa okwu na ńsó-ńsó a màkà ntiwapụ nya bụ́ ọrịa na steeti isii tupu Gates abịa Naijiria.

Nke a pụtara na akụkọ ụgha na-efegharị na Gates bubatara ọrịa a na Naijiria bụ otu n’ime m̀gbá òkpúrù éjì emegide nya bụ onye isi ụlọrụ Microsoft.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.