CHECK AM FOR WAZOBIA

Borno steeti ọ̀ bụ̀ ńhá ńjíkọ́tá UK nà Sweden, dị́kà Osinbajo kwùrù?

BY Mmachukwu Anyakora

Share

Yemi Osinbajo, òsòté onye isi Naijiria, sị na Borno steeti bụ nha UK na Sweden mà é jikọta ha abụọ ọnụ, mà ọ̀ bụ̀ UK nà Denmark.

Laolu Akande, onye na-ekwuchitere Osinbajo, kpughere na ụmụ akwụkwọ ndị Harvard Business School (HBS) bịara ịhụ nya bụ òsòté onyeisi na Aso Rock Villa n’ụbosị iri abụọ na asatọ, n’ọnwa Ọgọstụ.

Ka ya na ụmụ akwụkwọ bịara njem nlegharị ánya Africa na-enwe mmekọrịta, Osinbajo sị na, obụrụ na ḿbà ụwa ga-aghọta mgbagwoju anya nke gbasara akụ na ụba na nchekwa Naijiria, ọ dị mma ítinye ńhá obodo n’échìchè.

Osinbajo kwùrù sị: “Ótú bụ na ọ dị mkpa ịghọta nha obodo. Ọ ga-enye áka ịghọta ihe bụ nsogbu. Dịka omumaatụ, Borno dị ka nha UK niine na mgbakọta Sweden ma ọ bụ Denmark.”

Advertisement

“M̀gbè a kọrọ nà íhé íke na-eme na Naijiria, o nwèrè ike ịbụ íhé mere n’ebe dịpụrụ adịpụ na obodo. Ọtụtụ mmadụ nọ na Abuja na Lagos ga-anụ màkà ya na mgbasa ozi ọha. Nke a bụ nha obodo Naijiria.

“Ha na-ekwu okwu màkà akụ na ụba, e jì anyi atụnyere obere obodo dị na Afrịka. Mana anyị nwere steeti iri na Naijiria nke GDP ya karịrị obodo ndi ahụ. Anyị bụ nnukwu ebumnuche ndị ahịa.”

Borno steeti ò nwere àlà karịa UK niine na mgbakọta Sweden, ma ọ bụ UK na Denmark?

Advertisement

E bipụtara akụkọ a n’akwụkwọ ozi dị iche iche.

NCHỌPỤTA

TheCable gbakọrọ nha Borno, steeti dị n’ugwu ọwụwa anyanwụ. E kepụtara ya n’ọnwa Febụwarị n’afọ 1976, wee kewaa ya ọzọ n’afọ 1991, oge Yobe steeti sì nà yá pụta.

Advertisement

Ewezụga íhé íke mégóró na ya bụ steeti, áhà ọzọ e jìrì mátá Borno bụ “àlá udo”. Na ọdịda anyanwụ ya bụ ébé Yobe steeti nọ. Yá nà Republic Niger nwèkọ̀rọ̀ ókè-ala n’ebe úgwu. Lake Chad (na Republic of Chad) dị Borno steeti n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ. Cameroon dị ya n’ebe ọwụwa anyanwụ.

Webụsaịtị Borno steeti gọọmenti kpughere na nha àlà ya bụ steeti bụ puku iri isii na otu na narị anọ na iri atọ na ise (61,435sqkm). Nke a mèrè ya steeti abụọ kasị úkwúù na Naijiria mà á gachaa Niger steeti.

Ị́dàbéré nà ḿgbàkọ́ NBS (National Bureau of Statistics) bipụtara n’ọnwa 2020, NPC (National Population Commission) zikọrọ na ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ nọ na Borno n’ọnwa 2019 tinyere ha nà nde 5.7.

Àlà UK gụnyere agwaetiti Great Britain niine nke nwere England, Wales, Scotland, na akụkụ ùgwù nke agwaetiti Ireland.

Mgbakọ ọba ego ụwa, World Bank, n’ọnwa 2021 tinyere àlà UK241,930 km².

Ụlọ ọrụ nke National Statistics na UK, nke kachasị ebipụta íhé ḿgbàkọ́ màkà ọnụ ọgụgụ gọọmenti, kwùrù na obodo UK nwèrè mmadụ nde iri isii na asaa.

Advertisement

Obodo Sweden dị na Scandinavian Peninsula, n’ugwu Europe. Ísí obodo yá nọ̀ nà Stockholm kamgbe 1523. Sweden na Norway nwèkọ̀rọ̀ àlà na Scandinavian Peninsula, mànà òkè Sweden ká íbù.

Mgbakọ ọzọ ọba ego ụwa, World Bank, mèrè na 2021 kpughere na oke àlà nke Sweden nwere ugbu a bụ 407,310 km². Ọnụ ọgụgụ mmadụ nọ na nya bụ obodo pụtara nde 10.4.

N’afọ 2021, mbipụta ọba ego ụwa kọwara na oke àlà Denmark bụ 40,000 km². Ọ nwèrè mmadụ nde 5.8.

Borno nwere nnukwu ana. Ọ kà Denmark, ma nwee ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ka yá. Mana Borno kà nọ́tèrè áká n’ebe Sweden na UK nọ, mà á bịa n’ọkwu ọnụ ọgụgụ mmadụ ma ọ bụ íbù àlà yá.

Ńlélé nke TheCable mèrè kpughere na àlà na mmadụ nọ na sọ̀ UK karịrị nke Borno steeti nke úkwúù, ma ewezụga ịgụnye Sweden ma ọ bụ Denmark.

Borno United Kingdom  Sweden Denmark United Kingdom Sweden United Kingdom + Denmark
Landmass (km²) 61,435 241,930  407,310  40,000  649,240  281,930
Population 5,751,590 67,081,000 10,415,811 5,856,733 77,496,811 72,937,733

ÍKPÉ

Ókwú nke osote onyeisi oche Naijiria, Yemi Osinbajo, kwùrù màkà Borno ịnwe ala dị ka ijikọta UK na Sweden ma ọ bụ UK na Denmark bụ okwu adịgboroja. O kwubigarụ ókwú ókè.

This website uses cookies.