Saturday, April 20, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

CBN èbípụ̀tálá ákwụ́kwọ́ égo ₦5000 na ₦2000, dị́kà ákụ́kọ́ wuru èwù sìrì kọ́wáá?

CBN èbípụ̀tálá ákwụ́kwọ́ égo ₦5000 na ₦2000, dị́kà ákụ́kọ́ wuru èwù sìrì kọ́wáá?
November 19
08:05 2022

Onyonyo na-egosi akwụkwọ ego nde naira ise na nde naira abụọ na-agbasa na intanetị.

Na onyonyo ahụ, nke e kere na Twitter ụbọchị iri abụo na asaa n’ọnwa Ọktoba, ótù nwa agbọghọbịa zikọrọ ngwugwu nde naira ise na nde naira abụọ.

Nwanyị ahụ kwuru na otu nwoke na-ayị ala bịara ịkwụnye ego ahụ na ụlọ akụ ebe ọ na-arụ ọrụ.

“A tụrụ m anya na ihe a bụ ihe egwuregwu”, nke a bụ ihe ótù onye kere onyonyo a dere.

Advertisement

Ndị hụrụ onyonyo a ruru puku iri atọ na atọ.

Ndị ọ masịrị ruru ótù puku na iri abụọ na asatọ. Ndị kere ya ruru narị atọ na iri isii na asaa.

E keela onyonyo a na usoro mgbasa ozi ndị ọzọ dịka Instagram na Facebook, na akaụntụ dị iche iche, ebe ndị Naijiria na-atụghị anya ya gosipụtara ụjọ màkà yá.

Ụbọchị iri abụo na isii n’ọnwa Ọktoba, Godwin Emefiele, onyeisi ụlọ àkụ̀ etiti Naijiria (Central Bank of Nigeria, CBN), sị na nya bụ ụlọ akụ nke kachasị kwuru okwu maka imegharị ụfọdụ akwụkwọ ego.

Advertisement

Emefiele sị na ego ọhụrụ a, nke gụnyere narị naira abụọ, narị naira ise, na otu puku naira ga-adị n’ọha site na Desemba nke afọ 2022.

Nya bụ onyeisi ụlọ akụ sị na mbipụta ego ọhụrụ a bụ maka ihe isi ike dị iche iche nke na-emetụta njikwa ego n’obodo.

NCHỌPỤTA

TheCable jì ngwa ọrụ a na-akpọ Invid were nyochaa onyonyo a, iji chọpụta ma ọ bụ nke ziri ezi. Mfokasị a zikọrọ na onyonyo a adịla na Facebook na YouTube kemgbe afọ 2020.

Advertisement

Site na nlebanya, otu akụkụ nde naira ise ahụ bù foto nwoke yi okpu. Na akụkụ ọzọ bụ foto umunwanyị atọ e tinyere na akụkụ onwe ha.

Ọchịchọ isiokwu màkà ego a na Google zikọrọ na, n’ọnwa Ọgọọst na afọ 2012, ụlọ akụ etiti kwuru na ha chọrọ iwebata nde naira ise.

Advertisement

Sanusi Lamido, onye bụbu onyeisi ụlọ akụ etiti, sị na a ga-etinye ihu ụmụ nwaanyị atọ ọha ma na-agba mgbọ n’ego ọhụrụ ahụ.

Lamido kọwara na iwebata nde naira ise ga-eme ka ogo akwụkwọ ego dị mma, maghị tinye njirimara na ya maka ndị kpụrụ ìsì. Ọ sị na nke a ga-ebelata ọnụ ahịa mbipụta, nkesa, na mkpofu akwụkwọ ego.

Advertisement

Ótú ọ dị, ọtụtụ mmadụ anabataghị okwu a mgbe ahụ. Ụlọ akwụkwọ nke Institute Chartered Accountants of Nigeria (ICAN) sị na iwebata nde naira ise nwere ike ibelata ike ahịa akwụkwọ ego Naira.

Gọọmenti Naijiria, n’agbanyeghị na ha kwenyeburu n’okwu imepụta nya bụ ego, kwụsịtụrụ iwebata nde naira ise “iji mee ka ụlọ akụ etiti kọwara ọha mkpa dị na ya.”

Advertisement

Ụlọ akụ etiti gwara ndị Naijiria na Twitter ụbọchị iri atọ na otu n’ọnwa May n’afọ 2020, ka ha leghara ihe onyonyo adịgboroja anya.

Onyonyo ndị mmadụ na-eke na mgbasa ozi ọha bụ nke ochie na atụmanya etiti Desemba nke afọ 2022, ụbọchị CBN kwesịrị iwepụta ego ha megharịrị.

Ka ọ dị ugbu a, ụlọ akụ etiti kwuru maka imegharị narị naira abụọ, narị naira ise, na otu puku naira. CBN ekwughị na ọ chọrọ iwebata nde naira abụọ na nde naira ise.

ÍKPÉ

Onyonyo ndị mmadụ na-ekesa na gọọmenti etiti chọrọ iwebata nde naira abụọ na nde naira ise bụ okwu adịgboroja. Onyonyo ahụ, nke na-eduhie ọha, adịla kemgbe afọ 2020.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.