Friday, April 26, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

CBN èkwùrù na ha ga-akwụsị Form-A màkà ịkwụ ụgwọ akwụkwọ mba ofesi?

CBN èkwùrù na ha ga-akwụsị Form-A màkà ịkwụ ụgwọ akwụkwọ mba ofesi?
July 01
14:02 2022

Akụkọ na mgbasa ozi ọha na-ekwu na, na njedebe nke afọ 2022, ụlọ akụ étíti na Naijiria nke ndị bekee na-akpọ Central Bank of Naijiria (CBN) ga akwụsi inye Form-A.

Form-A bụ ihe ùgwù na-enye ndị Naijiria nọ ọbọdọ oyibo áká ịkwụ ụgwọ akwụkwọ.

Site na inye Form-A, ndị Naijiria na-agụ akwụkwọ na ọbọdọ oyibo nwéré ike inweta mgbanwe mba ofesi ná ọnụego gọọmenti, kama ha ga-achọ ya na nyìrí ahịa nke ka dị ọnụ.

Advertisement

Ndị Naijiria nọ na mgbasa ozi Twitter na eziko na há ná enwe nchegbu gbàsárá ozi á nkè ná atụ arọ ná ịkwụ ụgwọ akwụkwọ gá adị ọnụ, bídó ná ọnwa Jenụwarị na afọ 2023.

Onye ọ̀hà na-aza Adewale Adetona n’usoro mgbasa ozi Twitter dere sị: “Agụrụ m na bídó ná ọnwa Disemba na afo 2022, ụlọ akụ nkè étíti na Naijiria gá akagbu Form A. Ụmụ akwụkwọ si na Naijiria n’ele ányá ịgụ akwụkwọ na obodo oyibo ga enweta FX ha ga eji kwụ ụgwọ akwụkwọ si na nyìrí ahịa.”

Ndị kere ozi ya rụrụ otu narị na iri asaa na itoolu. Ndị kwuru okwu gbàsárá ihe odere rụrụ iri abụo na abụo. Ndị ọ masiri rụrụ narị atọ ná ịrị ịsị ná asatọ. 

Nya bụ akụkọ pụtara na Twitter ma na Facebook. 

Advertisement

Nseta ihuenyo màkà ebubo a nà-àgbá na Twitter. Ọ gosịrị ihe Mahadum Manchester dere màkà ozi a.

Advertisement

Nzaghachi sị Mahadum Manchester

Advertisement

TheCable kpọrọ njikwa nke Mahadum Manchester ichọpụta ma nya bụ ebubo o sì n’aka ndị isi nya bụ ụlọ akwụkwọ.

Onye na-ekwuchite ọnụ Mahadum Manchester sị ná há ghọtara na ọbá ego ụlọ akụ étíti Naijiria gá-adọrọ Form A nkè ná ébé égo na njedebe nke afọ a. 

Advertisement

Ha sị na nchọpụta a bụ ihe kpatara ha ji were nye umuakwụkwọ ha ǹdụ̀mọ̀ọ́dụ́ màkà igbochi onwe ha.

Nchọpụta

Advertisement

Osita Nwanisobi, onye nduzi corporate communications department nke ụlọ akụ étíti Naijiria, sị na ndụmọdụ Mahadum Manchester nyere enweghị isi. 

Nwanisobi sị na onweghị ozi ụlọ akụ étíti nke Naijiria zìrì màkà nya bụ Form-A.

Ọ dọrọ ndị nne na nna, ma ụmụ akwụkwọ uche na eche, aka ná ntị.

Ọ sị ha ka ha leghara ndụmọdụ maka ịkwụ oke ụgwọ site na Flywire tupu ụbọchị ịrị atọ na ọtụ na ọnwa Disemba, 2022.

Ikpe

Ulọ akụ étíti Naijiria ekwubeghị iwu ọchịchị màkà ịkwụsị Form-A na njedebe afọ 2022.

Mgbarakwa ekwuru màkà ụlọ akụ étíti nke Naijiria bụ adịgboroja.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.