Thursday, May 16, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Íhé ńkírí ébé ńdị́ ágha nà-ègósị̀pụ̀ égbè há ésiteghị nà Niger Republic

Íhé ńkírí ébé ńdị́ ágha nà-ègósị̀pụ̀ égbè há ésiteghị nà Niger Republic
August 08
15:52 2023

Ótù ihe nkiri na-agbasà nà intanetị àkpọ́lá ndị agha na-egosịpụ égbè há ndị agha obodo Niger.

N’ime ihe nkiri nke pụtara nà TikTok, a hụrụ kà ndị agha bu egbe, ma na-eme kà ha ano n’ogbo agha, n’ihe dịka ha na-akwado ije agha.

A nụrụ kà ndị agha a na-agụ egwu agha kà ha na-azọwa ije, dịka ndị obodo ha kwụ n’ótù akụkụ na mmasị ebe ọtụtụ nọ n’ujọ.

 

Advertisement

N’ụbọchị Friday, @VictorC26525018, onye ji usoro mgbasa ozi bụ Twitter ezisa ozi, bipụtara ihe ngosị a mà yọ ndị Naijiria kà há kpere ndị agha obodo anyị ekpere dịka ha na-aga ị́lụsò ndị agha Niger ọgụ, ndị “kara dị nkwado maka agha.”

“Kpere ndị agha anyị ekpere màkà ndị agha Niger Republic kàrà kwádó ịlụso ndị íro ha agha. Lee ihe ngosị a.

Ekwenyekwela n’agha. Africa ibuso onwe ya agha. Ihe a bụ ihe ndị ọcha chọrọ, ka ha nwee ike ịresị ha ńgwá agha. Africa, ọ bụzi maka gịnị?” Ihe a bụ ihe  ozia mmadụ narị kirigoro kwuru.

Gbadebo Rhodes-Vivor, onye ji òtù Labour Party (LP) zọọ ọkwa ọchịchị gọvanọ nà Lagos steeti, bipụtakwara ihe ngosị a na Twitter.

Advertisement

N’agbanyeghị na Rhodes-Vivour ekwughị na ndị agha a sì Niger, ozi  onye ndọrọndọrọ ọchịchị gbadoro ụkwụ na nsogbu di n’obodo dị nà West Africa.

Ihe a kà o kwuru: “N’adịghị kà ndị ọzọ, ọ bụ naanị ótù akwụkwọ ikikere ime njem passport kà m nwere. Onweghị obodo ọzọ m ṅụrụ iyi ikwado. Nigeria bụ ihe m nwere.

“ị́lụ̀ agha megide ndị ná-ákwàdó ótù ebumnuche, ná-àchọ́ nwere onwe màkà akụ n’ụba obodo ha, mà ná-àchọ́ ísi n’aka ndị ọcha na-emegbu ha pụta, ga-enwe ezigbo nsonazụ nye òtú mba ndị ọzọ sì ahụta anyị dịka isi ndụ mba Africa. Ó nwere ike ibute nnukwu ihe iyi egwu nye nchekwa obodo anyị.”

Kà anyị na-ede akụkọ a, ozi Rhodes-Vivour n’igwe Twitter enwetala ntunye ọnụ ruru ótù puku na otu narị nà atọ, ma  nwetakwa nkesa puku atọ, narị abụọ, nà iri n’asaa.

Advertisement

Ndị ókwú a masịrị ruru puku asaa na narị asaato n’otu. Nchekwa màkà ịgụ mgbe ọzọ nke ndị oyibo kpọrọ bookmark ruru narị ano na iri n’isii, tinyere ndị hụrụ nya bụ ókwú di ótù nde na ụma mmadu nari puku asatọ.

Ihe ngosị a nke nwere ótù isi okwu kà anyị hụtakwara n’ọtụtụ ebe n’ọba ozi Facebook.

Advertisement

Open Nigeria, ótù asafe nọ nà Facebook nke uche óbì ha abụghị ikpata ego, bipụtara ihe ngosị a, ma kwuo sị na ndị obodo Niger enweghị ihe ha ga atufu mà ha gaa agha.

Ọ dere sị: “Ebu m n’obi na Seyi Tinubu, Yusuf Bichi, Umar Ganduje, Hope Uzordinma, Festus Keyamo, Muhamadu Buhari, Femi Gbajabiamila, Tony Elumelu, Aliko Dangote, Akpabio, Orji Uzor Kalu na ụmụ ndị niile kwadoro ọchịchịrị ga-anọ n’ogbo agha, megide obodo Niger ndị n’eweghị ihe ha ga atufu n’agha a, dị ka nke ndị ocha na-alụ imegide ndị Africa.”

Ihe nkiri a n’abia dika  onye isi-ala bụ Bola Tinubu kwuputara ebumnuche ya izipu ndị agha obodo Naijiria ịga Niger n’etiti ogbaghara dị na nya bụ obodo.

Tinubu, onye bụ onye isi oche ndị Economic Community of West African States (ECOWAS), kwuru na mkpebi iji ike eweta udo bụ nke òtù ECOWAS kwekoritara site n’ogbako ha nwere n’ụbochị Sunday na Abuja.
ECOWAS enyela Niger ótù izu ụka, bido n’ụbọchị Sunday, itighachi onye isi-ala ha bụ Mohamed Bazoum n’ọchịchị. Mà ha emeghị nke a, o nwere ike ibute ntaramahụhụ siri ike.

K’osidị, ọtụtụ obodo gunyere Russia na ndị ọnụ na-eru n’okwu dịka ndị isi ECOWAS akpọla mkparitụka dịka ụzọ iganihu, karịa ibido ọgụ na mgba.

ŃCHỌ́PỤ̀TÁ

Thecable nyochara akụkụ niile nke ihe ngosị a nwere, iji chọpụta mgbe izizi ihe nkiri a pụtara na ịntanetị.

Nchọpụta nnyocha a gosịrị na ihe nkiri a bu ụzọ pụta n’ọba ozi YouTube n’ubọchị anọ nke ọnwa April. Ụbọchị obodo Senegal na-eme mmeme màkà ncheta ụbọchị nwere onwe.

Ihe ngosi a nke isi okwu ya bụ “April 4: Commandos ensures show | Ubochi nwere onwe ndi Senegal | 2023” gosịrị ebe ndị agha site na ńkwàdó ndị obodo ha, na-egosị ọtụtụ amansi ndị agha, iji kwàdó mmemme ncheta nwere onwe obodo ha.

Ngagarị ndị agha a, iji kwàdó ụbọchị nwere onwe obodo ha, bụ nke mbụ ha na-enwe na Darkar, nke bụ isi obodo Senegal, n’ime ọnwa anọ kamgbe ntiwapụ ọria COVID-19 n’ụwa nille.

Enwela akụkọ ọgbaghara n’etiti ndị nchekwa obodo na ndị na-ámà gọọmenti nọ n’ọchịchị aka n’obodo Senegal izu ụka gara aga, tupu mmemme ncheta nwere onwe afọ iri isii na atọ, n’aka obodo France.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Ozi ndị ahụ na-egosị ndị agha nọ n’ime ihe nkiri a dịka ndị agha Niger bụ asị.

Ndị agha nọ n’ime ihe ngosị ahụ bụ ndị agha Senegal na-eme ngagarị dịka ha n’echeta ụbọchị nwere onwe obodo ha. Ọzọkwa, okoloto ndị oyibo kpọrọ flag dị nnọọ n’ihe ngosị ahụ abụghị nke ndị Niger. Kama, ọ bụ nke ndị Senegal.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.