Saturday, April 27, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ílo úhe ò nwèrè íké íbèlátá ḿmádụ̀ ị́ghà àhụ́, mà wépù ńsògbú úchè?

Ílo úhe ò nwèrè íké íbèlátá ḿmádụ̀ ị́ghà àhụ́, mà wépù ńsògbú úchè?
October 03
17:55 2022

Edemede é bipụtara nà Twitter kwùrù sị́ nà ílo úhe, nke ndị bekee na-akpọ semen, nwèrè íké ịhazi ụra, wepụ mmadụ ịgha ahụ, belata nchekasị, ma kwalite ọnọdụ uche. 

“Ílo úhe nwere ike inye aka merie ịda mbà n’obi. Ílo úhe nwere ike ikwalite ọnọdụ. Ilo úhe nwere ike iwepu ahụ mgbu. Ílo úhe nwere ike ibelata nchekasị. Ílo úhe nwere ike hazie ihi ụra,” nke a bụ ihe mmadụ dere n’usoro òjíkọ́ọ̀hà Twitter.

Ndị ókwú a masịrị karịrị puku asatọ na narị asaa. Ndị kegharịrị yá karịrị puku anọ na narị atọ.

E kere okwu a na ásáfè nke Facebook ọtụtụ mmadụ, mà nke ótù onye bụ nwaanyị nọọsụ.

Advertisement

Úhe bụ íhé dị ka mmiri ara na-esi n’amụ nwoke apụta mà yá nà nwaanyị nwee mmekọrịta.

Ó bù mkpụrụ àdị́mè, nke ndị bekee na-akpọ sperm, nke nwere ike itụwa nwaanyị ímé.

Nya bụ úhe bùkwà ọtụtụ ihe ndị ọzọ dịka vitamin c, vitamin b12, ascorbic acid, calcium, citric acid, fructose, lactic acid, magnesium, zinc, potassium, sodium, fat, na protein.

KÈDÚ ÍHÉ ŃNYÒCHÁ NÀ-ÈKWÚ?

Advertisement

N’agbanyeghị na sayensị enyochabeghị ókwú gbasara úrù ahụike dị na ílo úhe, o nwere ọtụtụ edemede dịgasị na ịntanetị na-akọwa ótù ihe à.

Ọtụtụ ókwú ha kwùrù gbasara úrù ahụike há sị dị n’ilo úhe na-akọwa ihe dị iche iche nọ n’ime ya, ma úrù ha bàrà na ahụ n’otu n’otu.

Nnyocha TheCable mèrè zikọrọ na ótù n’ime edemede sayensị dị iche iche nke ha jì wèré kwalite mbipụta a sì n’afọ 2002.

Ó metụtara ụmụ nwaanyị narị abụọ na iri itoolu na atọ na-enwe mmekọahụ. Ọ tụrụ aro màkà njikọ dị n’etiti úhe na ọnọdụ uche.

Advertisement

Nya bụ edemede sayensị zikọrọ na ụmụ nwaanyị, ndị ha na úhe nwere mmekọ, nwere obere mgbaàmà nke ịda mbà n’obi.

Ótú ọ dị, edemede a lekwasịrị ányá na òtú ịkpụ sì anabata úhe, karịa úrù dị na ítinye ya n’ọnụ. Ọ dọrọkwara áká ná ntị, sị na mpụta nya bụ nnyocha bụ ókwú ndị ọkachamara ahụike ekwekọrịtabeghị na ya.

Advertisement

Ọzọ n’ime edemede sayensị nke na-apụtakarị màkà ị́kwàdó ókwú gbasara úrù dị́ na ílo úhe bụ ótù ǹkè e dèrè n’áfọ̀ 2015. Ọ kọwara na úhe bù homonụ nke a na-akpọ melatonin, nke na-akpalite ụ́ra.

Nya bụ edemede sayensị kọwara úrù dị na melatonin màkà nwóke ịtụwa nwaanyị íme.

Advertisement

Mànà ò zíkọ̀rọ̀ ótú nya bụ melatonin dị na úhe sì bàárá ahụike uru mà nwaanyị ṅụọ ya aṅụo.

KÈDÚ ÍHÉ ŃDỊ́ Ọ̀KÀCHÀMÁRÁ KWÙRÙ?

Advertisement

TheCable kpọtụrụ ndị ọkachamara ahụike dị iche iche ịchọpụta mà ènwèrè ihe akaebe sayensị ị́kwàdó okwu a.

Best Ordinioha, prọfesọ na-agụ màkà ahụike ọha na ọgwụ obodo, sị na okwu a abụghị eziokwu.

“Ọ bụrụ na enwere uru dị na ya, ọ ga-esite na omume mmekọahụ. Ọ bụghị na ilo úhe n’onwe ya. Úhe nwèrè ụfọdụ úrù dịkwa na ihe nri. Mànà úru à bụ màkà ịnye úhe aka tụwa nwaanyị ime. Uru nri a erughị nke imelite ahụ,” nke a bụ ihe o kwuru.

“Ọ masịghị ọtụtụ ndị mmadụ itinye amụ n’ọnụ, ma ṅụọ úhe n’etiti mmekọrịta nwoke na nwanyị. Onye kwuru okwu a na-agbalị kà o melite óbì ndị mmadụ n’ebe udiri mmekọahụ ndị ọzọ nọ̀.”

Ayo Ajeigbe, ọka n’akparamàgwà mmadụ, sị na okwu a abụghị eziokwu. Ọ sị na onweghị ihe akaebe.

“Ọbụrụ na onwere Ihe akaebe, ọ karụ ịbụ ọgwụgwọ nsogbu ahụ ndị mmadụ na-agabiga. Ndị ọkachamara karụ imepụta ọgwụ nke úhe dị na ya,” ihe a kà Ajeigbe kwuru.

Nya bụ ọkà n’akparamàgwà mmadụ kwukwara sị na ọtụtụ nnyocha sayensị a nke ha jì akwado ókwú a nwere obere mmadụ sonyere ya, nke na-ezughị òkè iji méé udiri mkpebi áhụ̀. Ọ sị na úhe si n’ahụ nwoke dị obere, nke nri ya ínwe mmetụta na ahụike mmadụ ma nwaanyị maọbụ nwóke lọ ya.

ÍKPÉ

Mbipụta na-akọwa na ilo úhe nwèrè íké nyere aka merie ịda mbà n’obi, bulie ọnọdu uche, belata nchekasị, ma hazie ụra enweghị nkwado. Enweghị nyocha sayensị zuru òkè ikwado ókwú a.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.