Saturday, April 20, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Kola Abiola kwùrù nà kansụl ǹché Naijiria ézukọ̀bèghị̀ kém̀gbè 1999. Ǹké à àbụ̀ ézíókwu? 

Kola Abiola kwùrù nà kansụl ǹché Naijiria ézukọ̀bèghị̀ kém̀gbè 1999. Ǹké à àbụ̀ ézíókwu? 
November 18
08:01 2022

Kola Abiola, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Redemption Party (PRP) maka ntuli aka nke 2023, kwuru na National Security Council (NSC) ezukọbeghị ótù ụbọchị kemgbe afọ 1999.

Abiola kwuru ókwú à na nzukọ ndi na-azọ ọchịchị mere, nke Arise TV na Centre for Democracy and Development (CDD) haziri, na Abuja.

Abiola bụ̀ ótụ̀ n’ime mmadụ anọ na-azọ oche onyeisi obodo gara nya bụ nzukọ ìzìzì, nke ndị kwadoro ya kpọrọ presidential town hall meeting, n’ụbọchị nke isii n’ọnwa Novemba.

Ndị gakwara nzukọ à bụ Peter Obi, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour party (LP); Rabiu Kwankwaso, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị New Nigeria Peoples Party (NNPP); na Ifeanyi Okowa, osote onye ndọrọ ndọrọ ọkwa onyeisi oche Peoples Democratic Party (PDP) nke bụ Atiku Abubakar.

Advertisement

Ha niile turu aro maka nchekwa obodo, ma nye atụmatụ gbasara akụ n’ụba, ǹkè há bù n’uche imejuputa ma ọ bụrụ na ha banye ọchịchị.

Reuben Abati, onye jụrụ ha ajụjụ, jụrụ ihe pụrụ iche ha ga-eme ma ọ bụrụ ha nọ n’ọkwa onye isi mgbe ndị ohi wakporo ụgbọ oloko gbara ụzọ Kaduna-Abuja na Maachị 2022.

Ka Abiola na-aza ajụjụ gbasara nchekwa obodo, ọ sị na NSC ezukọbeghị kemgbe 1999.

Advertisement

Ọ sị na okwu nchekwa bụ nke kachasị enye obodo Naijiria nsogbu.

“Ọ dị ḿkpà ka anyị nagachie azụ, ma dozie òtù ndị nche anyị niile,” ihe a kà Abiola kwuru.

ŃCHỌ́PỤ̀TÁ

TheCable nyochara section 153, subsection 25 nke akwụkwọ iwu 1999. Nya bụ ìwú guzosiri ike ndị na-achị NSC.

Advertisement

Dịka ngalaba siri kọwaa: “NSC ga-agụnye (a) onyeisi obodo ga-abụ onyeisi oche; (b) osote onyeisi obodo ga-abụkwa osote onyeisi oche; (c) onyeisi ndị ọrụ nchekwa; (d) minista na-ahụ maka ihe gbasara ime obodo; (e) minista na-ahụ maka nchekwa; (f) minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi; (g) onye ndụmọdụ nchekwa obodo; (h) onye nyocha izugbe nke ndị uwe ojii; na (I) ndị ọzọ onyeisi oche nwere ike ihọpụta site n’uche ya.”

Subsection 26 kọwara na kansụl a ga-ahụ maka inye onye isi ala ndụmọdụ n’ihe gbasara nchekwa ọha, “gụnyere ihe gbasara òtù ọbụla ìwú guzosiri maka nchekwa obodo.”

TheCable kọrọ akụkọ n’ụbọchị iri na anọ na ọnwa Oktoba mgbe Muhammadu Buhari, onye isi Naijiria, chịburu ọgbakọ NSC na presidential villa na Abuja.

Akụkọ a dere na osote onyeisi bụ Yemi Osinbajo na ọtụtụ ndị isi nchekwa nọ na nzukọ ahụ.

Advertisement

Nakwa, ụbọchi iri atọ na otu n’ọnwa Oktoba, a kọrọ na onyeisi Naijiria kpọkọtara ọgbakọ nchekwa na mberede.

E mere nzukọ ahụ na Abuja iji nyochaa òtù nchekwa dị iche iche na Naijiria.

Advertisement

ÍKPÉ

Okwu Abiola kwùrù na NSC ezukọbeghị kemgbe 1999 bụ okwu adịgboroja. Onyeisi Naijiria kpọkọtara ndị otu NSC na Abuja na ụbọchị iri atọ na otu n’ọnwa Oktoba, na afọ 2022

Advertisement

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.