CHECK AM FOR WAZOBIA

Nchụanwụ ọ ga-eme kà akụrụ dị ọcha?

BY Mmachukwu Anyakora

Share

Akụkọ dị na mgbasa ozi ọha nke ndi békèe ná akpọ Facebook na WhatsApp kwụrụ na  mmadụ nwèrè íké iji nchụanwụ were méé kà akụrụ dị ọcha ná enweghị ihe mgbu.

Ozi ochié ekegharịrị na Facebook kwuru sị: “Áfọ̀ nà-àgá. Akụrụ anyị na áyọ̀ ọbara, n’ewepu ńnú, ńsí na ihe ọbụla ga-enye nsogbụ na ahụ anyị.”

Ozi a na-ekwu na oge na-abịa mgbe ńnú ga-àdọ́kọ̀ n’akụrụ, chọọ ọgwụgwọ nhicha.

Ozi a dụrụ ndị mgbasa ozi ndụmọdụ, sị na otu ha ga-esi wéé hicha akụrụ ha bụ isi

Advertisement

akwụkwọ nchụanwụ n’ọkụ, ṅụọ tii ya azara aza.

Nya bụ ozi kọwara na ịṅụọ ótù iko n’ótù ubọchị, ị gà-ahụ na ńnú na nsi jùrù na akụrụ gị gá egosị ma ị chọọ ịnyụ mamịrị. A mara ya dịka ụzọ kachasị mma iji hicha akụrụ.

Aha sayensị ya bu Ocimum gratisimum. Aha békèe ya bụ “wild basil” ma ọbu “tree basil”.

Advertisement

Ndị Yoruba na-akpọ yá “Ewe Efinrin”. Ndị Igbo na akpọ yá Nchụanwu. Ndị Hausa na-akpọ yá “Daidoya”.

Etinyere ozi a na WhatsApp, wee sị ka ndị mmadụ gbásàá ya.

Akụrụ so na akụkụ ahụ mmadụ nke ka dị ḿkpà. 

Ọ bụ akụkụ kpụrụ agwa nọ na akụkụ abụọ ọ́kpụ́kpụ́ azụ, n’okpuru agaraahu.

Advertisement

Ọrụ akụrụ bụ ịyọ ọbara, iwepu ihe ọjọọ ma jikwa mmịrị itule na-ahụ mmadụ.

 

Nchoputa 

TheCable kpọrọ onye ọkachamara ahụ ịchọpụta màkà akụkọ nchụanwụ na nhicha akụrụ ònwèrè ihe ákáébe na sayensị.

Theophilus Umeizudike, dọkịta ọkachamara nke ndị bekee na-akpọ nephrologist na Lagos State Teaching Hospital, sị na onweghị ihe akaebe sayensị kwéré na nchụanwụ na-ehicha akụrụ.

Ọ gbárá ndị Naijiria ume sị ka ha kpachara anya ha màkà ozi ha na-enweta na mgbasa ozi ọha, karịsịa ọ bụrụ na osighị na aka ụlọ ọgwụ ámà àma.

Advertisement

 

Ilekota Akuru 

TheCable kpọtụrụ Awofeso Opeyemi, onye nnyocha na Harvard Medical School, na Dana-Farber Cancer Institute na Massachusetts, USA.

Ọ sị na onweghị akaebe na sayensị kwuru na enwerụ ike iji nchụanwụ wéé hicha akụrụ.

Ọ kwuru na otu esị eme ka akụrụ dị ọcha bụ ịṅụ mmiri zuru òkè.

Dị ka Awofeso sị kwuo, ihe na-eweta ahụike akụrụ bụ iri obere ńnu, ịṅụ mmiri zuru oke na igwọ ọbara mgbali elu n’ógè.

Dị ka osiri kwuo, ọbụrụ na a gwọ́ro ọbara mgbali elu, onwere ike imebi akụrụ.

 

Ikpe 

Mgbarakwa na nchụanwụ nwéré ike ihicha akụrụ bụ okwu adịgboroja. Onweghị ihe akaebe dị na sayensị iji kwàdó mgbarakwa a.

 

This website uses cookies.