Sunday, April 28, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ńdị́ bu egbè èbúsòrò ụ́kà Celestial nke dị na Ọwọ ághá?

Ńdị́ bu egbè èbúsòrò ụ́kà Celestial nke dị na Ọwọ ághá?
June 24
12:40 2022

Ó nwèrè ihe onyonyo nà-éwù na mgbasa ozi ọha ebe ótù onye na-akọwa na ndị bu egbe busoro ụka Celestial nke dị na Ọwọ agha.

Ụbọsị nke ise n’onwa June, ndị bu égbè wakporo ndị òfùfè ótù ụka Catholic nọ na Ọwọ. Ha gbùrù ọtụtụ ndị mmadụ ebe ahụ.

Ónyé ọha na-aza Florence Omojesu bupụtara ihe onyonyo na mgbasa ozi TikTok ụbọchị gachara nya bụ mwakpo.

Advertisement

O dere na óbì yá na agba ọbara maka na ndị bu egbe busokwara  ụnọ ụka ọzọ bụ Celestial agha.

Ekere onyonyo a na WhatsApp. 

Advertisement

Na nke otu onye na aza Ebenezer Anu tinyere na TikTok, o dekwara sị: “Ndị Fulani busọrọ ụnọ ụka Celestial dị na Akure agha.”

Nya bụ onyonyo nkeji ịrị atọ gosịrị ụlọ ná acha ọcha na bluu. 

O gosịkwara ụmụ nwanyị na ụmụaka yi uwe ọcha toru ogologo na okpu ọcha.

Na ihe nkiri a, ọ nwere nwaanyị ku nwa na aka, ma jide nwa ọzọ aka were na agba ọsọ ndụ. 

Advertisement

Anụkwara ọṅụ nwaanyị na etimkpụ na asụsụ Yorùbá.

O kwuru sị: “Anyị agaghị alanwu. Kedụ ebe anyị ga ezo. Jesus.”

Ndị lere onyonyo a na Facebook karịrị puku asato na narị. Etinyere onyonyo a na Twitter.

Advertisement

NDABERE OZI

Ụbọchị Sonde bu ụbọchị ịse na ọnwa June kà ndị bu egbe busoro ụnọ ụka St. Francis nke dị na Owo LGA, Ondo Steeti agha.

Advertisement

Ọtụtụ nwụrụ, ọtụtụ merụrụ ahụ maka mgberede a.

Ụmụ aka nwụrụ maka agha ebusoro na nya bụ ụka.

Advertisement

Ákwàrà mmadụ ịrị anọ na efe ofufe na ụbọchị ịrị na asaá na onwa June. 

NCHỌPỤTA 

Advertisement

TheCable kpọrọ Funmilayo Odunlami, ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii na Ondo Steeti, ịchọpụta màkà ebubo mbuso agha na ụnọ ụka Celestial.

Ọ sị na ndị uweojii Ondo Steeti amaghị ihe ọbụla gbasara mbuso agha n’ụka Celestial nke dị na Ọwọ.

Òtù nnyocha anyị nèrùrù anya na usoro mgbasa ozi ndị ụka Celestial dị iche iche. 

Anyị kpọrọ ndị isi parish nke mbụ na abụọ.

Ha abụọ kwèrè na onyonyo ahụ bụ nke esere na parish nke abụọ Celestial Church of Christ na Owo.

Mana ha sị na onweghi mbuso agha mere ebe ahụ.

Joseph Oluwasegun, onyi isi parish nke abụọ nke Celestial Church of Christ, Owo, sị: “Egwù jùrù ndị òtù ụnọ ụka ahụ ụbọchị Sonde bu ụbọchị ịse na ọnwa June ka ha nụrụ mgbọ egbe nke si na St. Francis Catholic Church.”

Oluwasegun sị na, tupu ụda mgbọ egbe ahụ, ndị ụnọ ụka nọ na ọnọdụ mmemmé maka ụbọchị ahụ bụ juvenile harvest na ụnụ ụka Celestial niile dị na ùwà. 

Ọ kwere na ndị bu egbe ébusòrọ̀ ndị ụka ya agha. 

Ọ sị na ndị ụka ya niile nọ na ḿma.

IKPE

Esere Onyonyo nke gbásàrà màkà ndi na efe ofufe n’ụka Celestial na Owo ụbọchị ịse n’ọnwa June.

Mgbarakwa na ebusoro ụka Celestial agha bụ okwu adịgboroja.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.