Friday, April 19, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ndi n’eyi ọha egwu èkwùrù na ha ga atụ bọmbụ n’uno ụka niine?

Ndi n’eyi ọha egwu èkwùrù na ha ga atụ bọmbụ n’uno ụka niine?
June 17
18:43 2022

Ihe onyonyo nkè gosiri Ayuba Elkana, kọmishọna ndị uwe ojii na Zamfara Steeti, apụtago ozoo na mgbasa ozi ọha nke ndị bekee n’akpoo “social media”.

O n’egosi ebe Elkana kwèrè na ọ natara akwụkwọ ozi iyi egwu nke ndị uwe ojii zitere sị ka emechie ụno ụka niine dị na Zamfara rụọ ọnwa àtó.

Ekere ihe onyonyo a na mgbasa ozi ọha dị iche iche, na nsonye Facebook, Twitter, WhatsApp.

Ubosi iri na anọ, n’ọnwa June, na afọ 2022, ihe onyonyo a putara na Facebook igosị na ndi uwe ojii kwere na ha natara akwụkwọ ozi nke sị ka emechie ụnụ ụka niine dị na obodo Naijiria ruo ọnwa àtó. 

Advertisement

Akaụntụ Facebook nke nwere mmadụ karịrị otú na ịrị na abụọ n’eso ya ahụgo ihe onyonyo a, opekempe ugboro otụ na iri isii na ise.

Ihe edere banyere ihe onyonyo a karịrị asaa na iri ise.

Ekere vidiyo a ugboro puku asato na abụọ. 

Advertisement

Nnyocha okwu ụfọdụ ndị na-atughi anya ndi oru Facebook Zukoro na ha nụrụ akụkọ ụgha nke sitere na vidiyo a na nkọwa okwu ya.

NCHOPUTA

Akwụkwọ akụkọ bu TheCable leru anya wéé chọpụta na vidiyo a dịgo na mgbasa ozi ọha nke anakpọ YouTube Kembe afọ 2021. 

Vidiyo a bu nke ekere na Zamfara mgbe Elkana gwara ndị nta akụkọ okwu ubosi ịrị atọ n’ọnwa Novemba, afọ 2021. 

Advertisement

Na Gusau bu isi mbido, Elkana gwara ndị nta akụkọ na onatara akwụkwọ ozi iyi egwu nke ndị ori enyo enyo dere si kaa emechie ụnụ ụka niine dị na Zamfara rụọ afọ atọ n’ihi ize ndụ ibido ha agha. 

Kọmishọna ndị uwe ojii kwuru si na ha amaghị ndị debere akwụkwọ ozi ahụ n’ihu ọnụ ụzọ ha.

Oge ndị ụlọ ọrụ nche na atụ atụmaatụ iche obodo ha, onye isi uwe ojii kwuru aha ụnụ ụka ndụ edere na akwụkwọ ozi iyi egwu nke dị na mpuga isi mbido nke ha g’ebụso agha oge ụka tupu afọ 2021 agwu.

TheCable kpọrọ Iliya Tsiga, onye bu onye isi mkpakọrịta ndị ụka na Naijiria (CAN) na Zamfara.

Advertisement

Na okwu ya, Tsiga si na vidiyo ahu bu nke ochie Kembe ọnwa Novemba 2021. 

Ọ si na onye ọbụna n’agbasa vidiyo a bu onye na eme ihe ọjọọ chọrọ esemokwu n’obodo. 

Advertisement

“Akwụkwọ ozi iyi egwu a bu nke edere ndị ụka niine noo na Zamfara,” Tsiga sara.

“Onwegi onye ha dere iche. Anyị na si ka ndị mmadụ leghara vidiyo na foto na agbasa ka ha me ihe omume ha kwa ụbọchị.”

Advertisement

IKPE

Vidiyo nkè a n’agbasa bu nke ochie sitere n’afọ 2021. 

Advertisement

Ihe ndị mmadụ n’ekwu na ndị ohi enyo enyo si ka uno ụka niine dị na Naijiria mechie rụọ ọnwa àtó abuhi eziokwu.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.