Thursday, April 25, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Nwúnyè TB Joshua ò Kwèrè Peter Obi ńkwà vótù ǹdè àsátọ

Nwúnyè TB Joshua ò Kwèrè Peter Obi ńkwà vótù ǹdè àsátọ
August 04
17:40 2022

Ọtụtụ mbiputa ndị mmadụ na-eke na mgbasa ozi ọha na-akọwa na Evelyn Joshua, nwunye TB Joshua, kwere Peter Obi, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour Party (LP), nkwa votu nde asatọ.

Ha na-ekwu na Evelyn kwadosiri Obi ike maka ntụlị aka onyeisi oche nke na-abia na 2023.

E biputara akụkọ a na onyonyo nke e tinyere na YouTube akaụntụ News Express Nigeria TV. Nya bụ akụkọ pụtara ụbọchị iri na asaa n’onwa July.

Isi okwu nya bụ onyonyo gụrụ sị: “2023 onyeisi oche: Evelyn TB Joshua kwere Peter Obi nkwa inye ya votu nde asatọ.”

Advertisement

Ndị lere ya gáfèrè narị ise na iri atọ.

Akụkọ a zikoro na ọtụtụ akaụntụ Facebook.

Advertisement

O nwere onye akụkọ nọ na Facebook áhà ya bụ Nolly Roll  dere màkà yá. Ndị na-eso ya karịrị nde atọ. Ndị mbiputa a masịrị karịrị puku iri. Ndị dere okwu maka ya ruru otu puku na narị atọ. Ndị kere ya ruru narị asaa na iri abụọ na anọ.

Ọtụtụ mmadụ na Facebook kere mbiputa a nwere okwu yiri onwe ha. Ihe sonyere ya na-abụ foto TB Joshua, ma ọ bụ nke nwunye ya, ma ọ bụ nke ha abụọ.

Okwu edere ugboro ugboro màkà nya bụ akụkọ na Facebook kọwara na Evelyn kwuru sị: “M ga-enye Peter Obi votu nde asatọ si na uno ụka m. Adịghị m akwado ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mana Peter Obi karịrị onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ ije n’onwe ya, onye Naijiria ga-eji dị nnukwu ọzọ.”

Advertisement

E kerekwara mbiputa a na Twitter.

Nchoputa 

TheCable kpọtụrụ Synagogue Church of All Nations (SCOAN) ịchọpụta mmeghachi omume ha gbasara nya bụ ókwú, ma jụọ ha ma ọ bụ uno ụka ha gbasara mgbarakwa a.

Advertisement

Ha azaghị ma ekwentị ha, ma ozi anyị zigara.

Anyị nyoro anya na mgbasa ozi ọha nke nya bụ uno uka, ma nke TV Joshua n’onwe ya.

Advertisement

Nnyocha a gosịrị na TB Joshua Ministries biputara ókwú mmeghachi omume gbasara ebubo wuru ewu na mgbasa ozi ọha nke kwuru na Evelyn Joshua buru amụma na ótù onye ndọrọ ndọrọ ga-enwe mmeri na ntụlị aka 2023.

Nya bụ ókwú mmeghachi omume pụtara na ụbochị iri na ise n’onwa July site na Facebook na Instagram akaụntụ ha.

Advertisement

Mbiputa ahụ kwuru sị: “Anya anyị eruola ihe edere na mgbasa ozi oha nke na-ekwu na Pastor Evelyn Joshua  kwuru na onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ga-enwe mmeri na ntụlị aka Naijiria na 2023.

“Biko leghara mbiputa a anya. Onweghị mgbe Pastor Evelyn Joshua ji buo amụma a. Anyị chọrọ ichetara gị na ezigbo ozi si na The SCOAN na-eziko so na Emmanuel TV na mgbasa ozi anyị”.

Advertisement

Anyị chọrọ na Facebook TB Joshua ministries wee chọpụta, na ụbọchị iri abụọ na ọnwa June, ekere  kpọmkwem mbiputa a.

Otu ọ dị, onweghi okwu edere na ya.

TheCable kpọtụrụ Julius Abure, onye isi LP.

Dịka ọ si kwuo: “Ndị mmadụ na-akwado Peter Obi na udi nke ha. Anyị agaghị emegide ezigbo nkwado. N’eziokwu, ndị Naijiria chọrọ mgbanwe”.

Iza mgbarakwa banyere nkwa inye nde asatọ, Abure sị na ụka synagogue akpotubeghi Labour Party ma ọ bụ Peter Obi na ụzọ ọbula.

Ikpe

Mgbarakwa na Evelyn Joshua kwere nkwa inye onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Labour Party votu nde asatọ bụ okwu adịgboroja.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.