Thursday, April 25, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ọ̀ bụ̀ gọvanọ ńdị́ south-east kèrè ESN dị́ kà Obi sìrì kwúó?

Ọ̀ bụ̀ gọvanọ ńdị́ south-east kèrè ESN dị́ kà Obi sìrì kwúó?
November 01
10:51 2022

Peter Obi, onye ndọrọ ndọrọ Labour Party (LP), kwuru nso nso a sị na ọ bụ gọvanọ ndị nọ na south-east kere Eastern Security Network (ESN).

O kwuru okwu a n’ụbọchị iri na ise n’ọnwa October na afọ 2022, na mmekọrịta nke Arewa Joint Committee na Kaduna haziri.

Na onyonyo pụtara màkà nya bụ mgbakọ̀, otu onye na-ege ntị jụrụ sị: “kedu ihe ga-eme ka ndị ugwu Hausa tụkwasa gị obi, mgbe ị kwubeghị okwu otu ugboro maka mmanye iwu inọ n’ụlọ ụbọchị Monde na south-east?

“Kedu ihe ga-eme ka ndị nọ na ugwu Hausa tụkwasa gị obi, ebe nso nso a, kansụl mkpọsa ndọrọ ndọrọ ọchịchị gị na Sokoto na steeti ndị ọzọ dị na ugwu Hausa, na onyeisi oche mkpọsa gị bụ ụmụ nwoke Igbo?

Advertisement

“Kedu ihe ga-eme ka ndị nọ na ugwu Hausa tụkwasa gị obi, ebe anyị anụbeghị gị ebe ị na-akatọ otu dịka IPOB na ESN, ma ihe omume ha?”

Na nzaghachi ajụjụ ahụ, Obi sị na onweghị ka ọ ga-esi katọ omume ndị ESN maka na ọ bụ gọọmenti steeti ndị ọwụwa anyanwụ kere ya.

“Ị naghị eso mkpọsa ndọrọ ndọrọ ọchịchị m. E kwuola m okwu maka mmanye iwu ịnọdụ n’ụlọ na ọwụwa anyanwụ. Gaa chọpụta,” ihe a ka Obi kwuru.

Advertisement

Mana kedu ka nkwupụta ahụ siri bụrụ eziokwu banyere nguzobe nke ESN?

NCHỌPỤTA

Nnyocha TheCable mere kpughere na ESN bụ òtù Nnamdi Kanu, onyeisi Indigenous People of Biafra (IPOB), kere n’ọnwa Desemba na afọ 2020. 

IPOB nke Nnamdi Kanu kere na 2012 na-agbalị ka ha mee ka ala Igbo bụrụ obodo nọrọ onwe ya.

Advertisement

Ụbọchi iri na atọ n’ọnwa Desemba na afọ 2022, Kanu kwupụtara okwu gbasara okike nya bụ òtù ndị nchekwa. Ọ sị na isi ọrụ ha bụ ichekwa ndị ọwụwa anyanwụ màkà ndi omempụ na-eyi ọha égwù.

Tupu nke a eme, o nwere akụkọ pụtara maka ndị Fulani na-achị ehi, ma jide egbe ha ji awakpo ndị mmadụ ebe ha na-arụ ọrụ na ala ubi ha.

Kanu jiri òtù nchekwa ndị ọzọ dịka Amotekun nọ na ndịda ọdịda anyanwụ na Miyetti Allah nọ na mpaghara ugwu were maa àtụ̀.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọdịda nke gọvanọ ndi ndịda ọwụwa anyanwụ màkà ichekwa ndụ na ihe onwunwe ndi igbo bụ ihe kpatara o jiri kee ndị nche a.

Advertisement

Chetakwa na, n’afọ 2021, ndị isi ndịda ọwụwa anyanwụ niile bịakọrọ ọnụ wee kee ndị nchekwa ha kpọrọ Ebube Agụ, iji gboo maka enweghị nchebe na mpaghara ahụ.

Dave umahi, onye kwuchitere ọnụ gọvanọ ndị ọzọ, sị na e kere ndị nchekwa a maka nsogbu nchekwa na-akawanye njọ na mpaghara ahụ.

Advertisement

Umahi sị: “Nzukọ ahụ kpebiri ijikọta òtù nchekwa maka ndịda ọwụwa anyanwụ, nke anyị ga-akpọ Ebube Agụ. Isi ụlọ ọrụ ya ga adị n’Enugu.”

IKPE

Advertisement

Okwu Obi kwuru sị na ọ bụ gọvanọ ndịda ọwụwa anyanwụ niile kere ESN bụ okwu adịgboroja.

Ọ bụ IPOB kere ndị nchekwa a. Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị LP mere mgbagwoju ESN na Ebube Agụ.

Advertisement

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.