Friday, April 19, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ònyònyòó gosịrị Aregbesola n’égwú nà ńkàgbú ndọrọ-ndọrọ ọchịchị Oyetola ò nwèrè ńjíkọ́?

Ònyònyòó gosịrị Aregbesola n’égwú nà ńkàgbú ndọrọ-ndọrọ ọchịchị Oyetola ò nwèrè ńjíkọ́?
October 10
20:03 2022

Onyonyo zikọrọ Rauf Aregbesola, onye bụbu gọvanọ Osun steeti, kà ọ na-agba egwu pụtara na ojikọmba, internet.

Na Twitter, ha kere onyonyo a, were sị na nya bụ minista na-agba egwu aṅụrị maka ńkàgbú Gboyega Oyetola, govano Osun steeti, dịka onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressive Congress (APC) na ntụlị aka e mere nso nso a na Osun.

Onye kesara ozi a na Twitter bụ @IfedolapoOsun, ụbọchị Fraide n’ụbọchị iri atọ na ọnwa Septemba, otu ụbọchị ahụ ụlọikpe ukwu gọọmenti etiti nke dị na Abuja kagburu nhọpụta Gboyega Oyetola na onye na-eso ya bụ́ Benedict Alabi, dịka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke APC.

Ndị lere onyonyo a karịrị 23,400. Ndị ọ masiri ruru 879. Ndị kegharịrị ya ruru 352.

Advertisement

ŃDÀBÉRÉ ÓKWU

Emeka Nwite, onye isi oche n’ụlọ ikpe, nyere mkpebi n’ime uwe nwere á kàrà “FHC/ABJ/CS/468/2022” nke ndi People’s Democratic Party (PDP) gbara akwụkwọ.

Na akwụkwọ á gbara ha, Mai Mala Buni, onye bụbu onye nọchiri anya onyeisi oche na ndị anọ ọzọ bụ̀ ndị e borụ ebubo.

Nwite, n’ikpe ya, sị na nhọpụta Oyetola na onye na-esote ya bụ ihe iwu ákwàdòghị̀.

Advertisement

Ọ sị na nke a bụ maka Buni, onye nyere Independent National Électoral Commission (INEC) aha ha, mebiri ndokwa nke ngalaba 183 nke iwu obodo na ngalaba 82 (3) nke iwu omume ntụlị aka nke afọ 2022.

ŃCHỌ́PỤ̀TÁ

Nchọpụta TheCable mere zikọrọ na onye ọrụ Facebook na-aza Ajiboye Maroof Akinlabi, tinyere onyonyo ahụ na Monde, ụbọchị iri abụọ na isii n’ọnwa Septemba. Ihe o dere na ya bụ: “minista nke ime obodo Ogbeni Rauf Aregbesola na-eme mmemme ụbọchị ọmụmụ nke iri isii na abụọ nwunye ya Ìyáàfin Sherifat Aregbesola.”

Oge TheCable kpọtụrụ Kikiowo Ileowo, onye ọrụ nnyemaka Rauf Aregbesola, ọ sị na: “mmeme ahụ na mkpebi nke ụlọ ikpe mere maka ịkwatu Oyetola enweghị njikọ.” Ọ sị na e mere onyonyo ahụ ụbọchị gara aga oge ha na-eme mmeme ụbọchị ọmụmụ nwunye Aregbesola.

Advertisement

ÍKPÉ

Onyonyo nke na-ekwu na Aregbesola na-agba egwú maka nkwatu Oyetola na-eduhie ndị mmadụ. E bipụtara onyonyo a na Monde, ụbọchị iri abụo na atọ n’ọnwa Septemba, ka ụlọ ikpe na-ekpebi na Fraịde, ụbọchị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Septemba.

Advertisement

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.