Saturday, April 27, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ókwú wuru èwù á sị̀ nà George Weah kwùrù gbàsárá ọ̀chị́chị́ ńdị́ ágha nà Niger ábụghị ézị́ókwu

Ókwú wuru èwù á sị̀ nà George Weah kwùrù gbàsárá ọ̀chị́chị́ ńdị́ ágha nà Niger ábụghị ézị́ókwu
August 11
15:05 2023

Akụkọ wùrù èwù nà ịntanetị gbàsárá okwu ndị mmadụ si na George Weah, onye isi àlà Liberia, kwụrụ, bu nke Ọtụtụ mmadụ kesagoro n’ọba ozi dị iche iche.

Ótù n’ime ozi ndị à anyị hụtara na Twitter, bù ihe ngosi nwere ihu onye isi ala Liberia.

“Ọ̀ bụ̀ eziokwu nà ónyé isi ala obodo Liberia kọ́tọ̀rọ̀ @officialBAT? Okwu ya àmásị́ká m,” bụ ótù isi okwu mmadụ dèrè gbàsárá ya, ǹkè mmadụ puku iri ise na isii hụgoro kamgbe ụbọchị atọ nke ọnwa August mgbe e bipụtara nya bụ ozi.

“N’ihi na ECOWAS nabatara ịnapụ ọchịchị n’ike anyị na-ahụta na ngalaba dị iche-iche, nke na-ákwàdó ndị isi ala ịchị obodo ná ndụ ha niile, anyị ga na-enwe inapụ ọchịchị n’ike ndị agha,” ihe a ka ozi à há sị na Weah kwùrù pụtara.

Advertisement

 

Ị́NAGHARA Ọ̀CHỊ́CHỊ́ N’ÍKÉ ŃDị́ ÁGHÁ NKÈ MERE NÀ ÒBÒDÒ NIGER

Advertisement

N’ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Julaị, ndị agha militri nọ n’okpuru ọchịchị Abdorahamane Tchiani chụpụrụ n’ọchịchị mà kpọchie onyeisi ala obodo Niger bụ Mohammed Bazoum nà ǹgá.

Nwantịtị oge ha naghara ọchịchị, Amadou Abdramane, onye na-ekwuchitere ọnụ ndị agha obodo Niger, kwuputara nà “òtù nchekwa àlà há ekwekọtala kà há kwụsị ọchịchị ndị mmadụ ma àmá.”

Advertisement

Kà ụbọchị abụọ gachara, Tchiani kwuputara onwe ya dịka onye isi ọchịchị ndị agha nke obodo Niger bụ National Council for the Safeguard of the Homeland (CNSP).

Niger, obodo osimiri agbaghị okirikiri, nwèrè uranium yana ola-edo nke úkwú. Há nwètàrà nnwere onwe ha n’aka France n’ụbọchị atọ nke ọnwa August n’afọ 1960.

Advertisement

Kamgbe ahụ, Niger enwela nnapụ ọchịchị n’ike n’obodo ha ruo ùgbòrò ise. Nke ka dị ǹsó bụ nke ha nwèrè n’ọnwa Julai. Nke mbụ bụ n’afọ 1974 kà ó mèrè. Ndị ọzọ megasịrị n’afọ 1966,1999, nà 2010.

Ọtụtụ obodo ndị ọzọ nọ́ Niger ǹsó, nọ̀ nà ọchịchị ndị ágha. Obodo ndị à gụnyere Mali, Burkina Faso, ya na Guinea, ndị bụgasị ndị òtù Economic Community of West African States (ECOWAS).

Advertisement

N’ụbọchị iri atọ nke ọnwa Julaị, Bola Tinubu, onye ǹdú Naijiria onye bụkwa onye isi oche nà ECOWAS, kpọrọ nzukọ n’Abuja gbàsárá nnaghara ọchịchị ndị agha ndị a.

Há kpàrà ńkàtá màkà ínwe ótù echiche gbasara ọnọdụ obodo Niger.

Na ngwụcha nzukọ à, ECOWAS nyèrè isi ọchịchị ndị agha militri à ótù ízù ụ́kà itigachi onye isi ala há bụ́ Bazoum há chụpụrụ n’ọchịchị, onye nke batara na ọchịchị site ná ntụliaka elu ọchịchị onye kwuo uche ya.

Ọzọkwa, n’ụbọchị iri atọ nke ọnwa Julaị, òtù African Union (AU) gwara ndị agha à kà há weghachita ọchịchị onye kwuo uche ya nke Bazoum, tupu ụbọchị iri na ise èrúó.

Izaghachi ECOWAS na ḿmádó iwu ótù izu ụka há nyèrè há, Abdramane, onye ndu ndị agha n’obodo ahụ, kwuru sị: ” Anyị chọrọ k’anyị chetara ECOWAS maọbụ òtù ọbụla màkà mkpebi anyị n’ichekwa obodo anyị.”

Okwu ahụ na-agbasà n’ọba ozi dị iche iche, nke ndị mmadụ sị nà Weah, onye n’agbaburu obodo yá bọọlụ ama-ama, kwùrù ná nzaghachi nye nkpebi ECOWAS gbasara Niger, pụtara: ”Anyị agaghị emegide ịnapụ ọchịchị n’ike nke ndị agha mà ọ bụrụ nà anyị emegideghị ndị na-akpachi ọchịchị n’íke ná ngalaba gọọmenti.”

Mana Weah òkwùrù ihe dị otu à kpóm kwèm? Lèé ihe anyị chọpụtara.

ŃYÒCHÁ

Sịte n’iji isi okwu enyocha akụkọ, TheCable chọpụtara, n’agbanyeghị nà okwu ahụ bidoro na-éwù n’ọ́bá ozi dị iche iche n’ọnwa August, nà ọtụtụ edemede ndị kọrọ ya bụ akụkọ ekwughị mgbe nà ébé Weah kwuru okwu ahụ.

N’inyomikwu anya kà anyị hutara ótù akụkọ nke e bipụtara na Sierra Leone Telegrah, nke isi okwu ya pụtara, “Ndị isi ECOWAS achụọla Guinea, mà sị́ n’ọbụ ndị agha milịtrị kà há mà gbasara nchekwa  onye isi ala ha bụ Conde.”

E bipụtara ozi a nwere ótù ísí okwu há sị Weah kwuru n’ụbọchị iri nke ọnwa Septemba n’afọ 2021, n’ọgbakọ ndị isi ala òtù ECOWAS nwere n’onyonyo.

Ihe ha kpara na nya bụ ọgbakọ gbadoro ụkwụ n’inaghara ọchịchị n’íké nke mere na Guinea Conakry, eji wee chụpụ Alpha Conde, onye dị afọ iri asatọ n’atọ mgbe há napụrụ ya ọchịchị.

N’ọgbakọ à, Weah kwùrù sị na, ịnara ọchịchị n’ike n’obodo Guinea, bụ nke nkwuputa Condo ịtụgharị ìwú ala há, ka ó nwé ike ịchị nke ugboro atọ kpaliri.

“Dika anyị na-akọtọ nnaghara ọchịchị n’ike nke ndị agha milịtrị a, anyị gà ejisie ike lebe anya n’ihe ndị na-akwalite inaghara ọchịchị n’ike. Ọ̀ bụ̀ màkà n’anyị anaghị edebe okwu anyị ịchị ugboro ole iwu ala anyị di iche-iche kwadoro,” nke à kà á sị̀ Weah gwara ndị ǹdú mba Afrịka n’afọ 2021.

N’agbanyeghị nà okwu ohuru ná-ágbásà, nke ndị mmadụ sị na Weah kwụrụ abụchaghị kpọm kwem ihe Weah kwuru n’ọgbakọ òtù ECOWAS n’afọ abụọ gara-aga, ozi dị na nya bụ okwu bụ nnọọ ótù ihe.

Ledgerhood Rennie, onye minista n’ahụ màkà ozi nke obodo Liberia, gwara TheCable nà okwu ahụ ná-ágbásà ebe niile nke ndị mmadụ sị na Weah kwuru abụghị “eziokwu”.

N’ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Julaị, gọọmenti obodo Liberia kwuru ókwú ịkọtọ nnaghara ọchịchị n’ike nke méré n’obodo Niger. Há kpebiri nà nya bu àgwà bụ imegide úchè ndị Niger jiri họpụta onye ndu ha site n’usoro ọchịchị onye kwuo uche ya.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Akụkọ nà onye isi ala mba Liberia nọ̀ ná ńkwàdó nnapụ ọchịchị n’ike ǹké mere n’obodo Niger bụ àsị́.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.