Thursday, April 18, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Onye na-azụ atụrụ ònyèrè Peter Obi éfí na àlà?

Onye na-azụ atụrụ ònyèrè Peter Obi éfí na àlà?
July 20
20:20 2022

Akụkọ etinyere na Facebook sị na onye Hausa na-azụ atụrụ nyèrè Peter Obi efi iri ise na ala atọ na Kaduna iji kwàdó ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya.

Nya bụ akụkọ biputara foto abụọ. 

Otù n’ime foto abụọ ahụ na-eziko efi ọcha nọ n’ọhịa. Nke ọzọ na-egosị ngwakọta efi dị ọcha na aja aja nke nọ na ahịhịa ndụ.

Advertisement

Otù nwoke dị ọcha sò nọrọ na foto nke abụọ. N’okwu mmechi nya bụ akụkọ dị na Facebook, a sị na Danladi, nwoke ọcha nọ na foto a, dere sị na ọ ga-enwe udo ma onye Igbo bụrụ onye isi Naijiria.

E bipụtara ozi a n’ụbosị ịrị abụọ n’ọnwa Julaị na Facebook page nke aha ya bụ “Obidient”. Ndị okwu a masịrị rùrù pụkụ atọ.

Ndị dere ìhè banyere ya ruru narị isii na ịrị na asatọ. Ndị kere ya ruru narị asaa na ịrị asatọ na atọ. E bipụtakwara nya bụ ozi na Facebook page ndị ọzọ.

Advertisement

Otù onye dere ihe banyere ya na Facebook kwuru sị: “Ọ na-emetụta m na uche ugbua. Chineke emela ya n’obodo a.”

Nchoputa 

Anyị ji Yandex, ngwá ọrụ digitalụ nke eji achọpụta ebe foto sì na foto ndị yiri ya, were nyoo nya bụ foto. Ọtụtụ foto na-apụta maka nwoke a ndị ọha na-kpo Danladi zikoro na foto ahụ anọgo na ịntanetị Kemgbe ọnwa March na afọ 2021.

Anyị chọpụtara na foto ahụ bụ nke etinyeburu n’isi akụkọ dị na website Daily Trust Newspaper ụbọchị ịrị abụọ n’ọnwa Maachị, n’afo 2021. Isiokwu ya gụrụ sị: “Dauda sì n’ịzụ ahịa atụrụ banye ịbụ onye nkụzi na mahadum.” 

Advertisement

Kedu Onye  Bu Adamu Dauda?

Akụkọ Daily Trust kpughere njirimara nwoke etinyere foto ya na Facebook, si na aha ya abụghị Danladi. Ọ sị na aha ya bụ Adamu Dauda Garba. Edemede ahụ kọwara na a mụrụ Adamu ụbọchị ịrị n’ọnwa Ọktoba na afọ 1985.

Dauda bidoro ka onye na-azụ atụrụ na Taraba steeti na afo isii. O jikotárá ịgụ akwụkwọ na ịzụ atụrụ. Na afọ 2009, o nwetere National certificate of Education (NCE) na Taraba State College of Education, Jalingo.

Ka ọ gụchara akwụkwọ, ọ nụrụ na mahadum étíti nke dị na Wukari na-ewe ndị nche. O tinyere maka nya bụ ọrụ, ọ were dabaara ya nke ọma. E were ya n’ọrụ.

Advertisement

Dauda rụrụ ọrụ nche afọ anọ tupu a nabata ya na mahadum ahụ ịgụ Sociology. Ka ọ gụchara akwụkwọ, a nabata ya ka onye nkụzi enyemaka. 

Omume Adamu Banyere Mbiputa Ugha. Ka anyị chọrọ na Twitter, o gosịri anyị akaụntụ Adamu amachiri nwa oge. Adamu kọwara onye ọ bụ na akaụntụ ya.

Advertisement

Ọ sị na onweghị onye ọ kwadoro iji foto ya wee gbasaa akụkọ adịgboroja. Ọ dọrọ ọha aka na ntị, sị ka ha leghara akụkọ adịgboroja gbasara ya anya. Ọ sị kwa na ha ga-ahụ ihe okwu a ga-apụta n’ụlọ ikpe.

Advertisement

Ikpe

Nyocha okwu gosịrị na ezigbo njirimara nwoke ndị ọha na-akpo Danladi bụ Adamu Garba. Onyeghị Peter Obi efi iri na ise na ala atọ na Kaduna maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya. Mgbarakwa a bụ okwu adịgboroja. 

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.