Saturday, April 20, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Sanusi èdèrè edemede ná-éwù màkà ebumnobi ndọrọ ndọrọ ochịchị Atiku, Tinubu, na Obi?

Sanusi èdèrè edemede ná-éwù màkà ebumnobi ndọrọ ndọrọ ochịchị Atiku, Tinubu, na Obi?
June 21
11:09 2022

Ótù edemede nke na-ewu na mgbasa ozi ọha kọwara ebumnobi ndị ndọrọ ọchịchị ntuli aka nke 2023.

Ndị mmadụ nà-èkwú na ọ bụ Sanusi Lamido Sanusi, onye ịsị mbụ ụlọ akụ étíti, dere ya.

Nya bụ edemede na-akọwa na onwere onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ ịchị Naijiria maka ego.

Ńkèjí edemede nke izizi ya kwuru sị: “Ihe pụrụ ichè na mmadụ atọ nọ n’elu na azọ ị́nọ̀ n’isi óche bụ na ọnwere onye n’ime ha na azọ ya maka ego.”

Advertisement

O kwuru na Atiku Abubakar, onye ndọrọ ndọrọ Peoples Democratic Party (PDP), amịpụtana ihe ọma dị na obodo a, naanị ihe ọ choro bụ ịza onye ịsị site n’ụzo niile.

Nkewa okwu ọzọ ya dekwara sị: “Bola Tinubu, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke All Progressives Congress (APC), chọrọ imezu iwu na ndụ ya ịbụ onye ịsị. N’ógè ikpeazụ, o ga-egosi anyị nrụrụ aka dị egwu.”

Gbàsárá Peter Obi, onye ndọrọ ndọrọ Labour Party (LP), o dere na nya bụ gọvanọ mbụ Anambra Steeti bụ nwoke afọ juru.

Advertisement

Ọ sị na Obi weputara onwe ya ịbụ onye ịsị ọbọdọ Naijiria ka o nwe ike izọpụta onwe ya na nsogbu ọ nọ.

Ndị mmadụ nọ na Twitter, Facebook na usoro mgbasa ozi ndị ọzọ ekebego edemede a Kemgbe ubosi iri na itoolu n’ọnwa June.

Ubosi ịrị na itoolu n’ọnwa June, ebuputara édémédé a na akaụntụ Facebook ǹkè a na kpọ Celesylv Updated.

Ndị na eso akaụntụ a ruru puku iri asaa.

Advertisement

E kere édémédé a ugboro puku atọ.

Ndị ọ masiri ruru otu puku na narị asatọ.

Ihe edere n’okpuru ya karịrị otu puku na narị anọ.

Onye mgbasa ozi na Twitter bu Fame Kid buputara edemede ahụ otu ubosi ahụ ébé elekere abụọ na iri abụọ n’itoolu.

Advertisement

Ndị omasiri karịrị puku abụọ. Ndị kere ya ruru otu puku na narị atọ na otu.

Max Vayshia, onye ọrụ ọzọ buputara edemede a. Ndị ọ masịrị karịrị otu puku na narị atọ. Ndị kere ya ruru narị asatọ na iri asaa ná atọ. Ndị kwụrụ ọkwụ n’okpuru ya rụrụ iri ise na asaa.

Advertisement

Ụfọdụ ndị ọrụ mgbasa ozi ọha kwere na akụkọ a bu eziokwu. Ọ pụtara ìhè ka esi kele odee a maka ihe ha kpọrọ “ezigbo olụ ya”.

NCHỌPỤTA

Advertisement

TheCable lere anya wee chọpụta na onwere usoro mgbasa ozi kwesịrị ntụkwasị obi buputara edemede a wee dee aha Sanusi na ya.

Oge TheCable jụrụ Sanusi maka nya bụ edemede, ọ jụrụ ókwú nke na agba okirikiri.

Advertisement

Ọ sị na obụrọ ya dere ya.

Ọ gwàrà TheCable na okwu ahụ bụ asị.

NKPEBI

Edemede a ebuputara gbasara ebumnobi Atiku, Tinubu na Obi maka ịbụ onyeisi oche bu okwu adịgboroja.

Ọ bụrọ Sanusi Lamido Sanusi dere ya.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.