Advertisement

Ḿbà, íhé ńkírí à ábụghị ǹké gosịrị ọ̀gụ̀ ḿmégwárá ńdị́ ágha ímegide Okuama

Ótù ihe nkiri e biputara na soshal midia na-akọwa na ndị agha Naijiria busoro ndị Okuama nà Delta ọgụ mmegwara màkà ogbugbu ndị soja iri na isii n’obodo ahụ.

Ndị mmadụ ejila ihe ngosị à bóó ndị agha ebubo ọgụ mmegwara.

N’ụbọchị iri na anọ nke ọnwa March, ọtụtụ ndị agha—nke mejupụtara onye lieutenant colonel, ndị major captain abụọ, na ndị agha iri n’abụọ—ezigara ọrụ na Okuama ka ndị ntorobịa obodo ahụ gburu.

Ọnwụ ndị agha a kpaliri iwe ọtụtụ ndị—ya na ọtụtụ ebubo. Otu n’ime ebubo ndị a bụ na ndị agha nụsoro ndị Okuama ọgụ mmegwara site n’ịgba obodo ahụ ọkụ.

ADVERTISEMENT
Advertisement

“Okuama nke dị na Delta steeti bụ nke ndị agha soja na-agba ọkụ n’ụtụtụ a. Ndị agha Naijiria ekwupụtala agha n’ogige ahụ,” ótù onye na-aza Emekagift100 na X dere, ma jiri ihe ngosị ahụ sochie okwu ya.

Onye a ji X ezịsa ozi kwuru na ọ bụ onye na azọtara ndị mmadụ ọnụ ha, bụ human rights activist, ma bụrụkwa “onye nchekwa ùgwù” ndị Indegenious People of Biafra (IPOB), òtù nkewa obodo a mapụrụ amapụ.

Advertisement

Ozi a, nke ebiputara n’ụbọchị iri n’asatọ nke ọnwa March, enwetala nkiri puku iri itoolu n’asaa na narị abụọ (97,200), nkesa narị asaa n’isii (706), nkwenye narị ise na iri asatọ n’otu (581), na ntụnye ọnụ otu narị na iri asatọ n’otu (181).

Ihe ngosị nke ịhe nkịrị ahu @EmekaGift100 bịputara

N’ime ihe ngosị nkeji iri ise n’anọ a, a hụrụ ka ọ́kụ́ na-agba ụgbọ mmiri n’elu mmiri ebe nnukwu aṅụrụ si na ya abanye n’elu ígwe.

Advertisement

“Ọ dị mma?” otu nwoke jiri asụsụ pidgin jụọ ugboro-ugboro, dịka ọkụ à nà-àgbá.

“Lee, nnukwu mmanụ fuel na-agba ọkụ. Ihe a bụ ihe anyị n’agabiga n’afọ ọbụla, mana ndị mmadụ amaghị. Ha chere na anyi na-enwe obi aṅụrị. Obi adịghị anyị mma.”

Dịka EmekaGift100 kwuru, ndị agha soja mụnyere ọkụ a iji “gba ụmụ aka, ụmụ nwanyị, na ndị kara nka n’enweghị enyemaka” ọkụ.

Advertisement

Somto Okonokwo, onye ọzọ ji X ezisa ozi, kwuru sị́ na ndị agha na-eji ụzọ n’ezighi ezi emegide ndị mpaghara ọdịda anyanwụ ma na-echekwa ndị Naijiria bi n’ugwu.

Mgbe anyị dere akụkọ a, ozi a enwetala nkiri otu narị na iri atọ n’atọ (133,600), nkesa otu puku na narị anọ (1,400), nkwenye otu puku na narị abụọ (1,200), ntụnye ọnụ narị abụọ na iri ise n’isii (256), ya na nchekwa ịgụ mgbe ọzọ iri asatọ n’isii (86).

Advertisement

ŃNYÒCHÁ

TheCable jiri ńgwá ọrụ Reverse Image Search nyochaa ya bụ ihe ngosị, ma chọpụta na ebiputala otu ihe ngosị a na TikTok na ngwụcha ọnwa Januwari—ihe chọrọ iru ọnwa abụọ tupu e gbuo ndị agha a na Delta.

Advertisement

Mgbe ebiputara nya bụ ihe ngosị, a sịrị na ọbụ ọkụ ọgbụgba na Nembe Waterside n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Port Harcourt na Rivers steeti.

“Ọkụ ọgbụgba ọzọ na Nembe Waterside nke dị so na Creek Road, n’ime Port Harcourt,” edere n’okpuru ihe ngosị a.

Advertisement

Ihe ngosị a nwere ótù okwu n’ime ya, dịka nke a na-ekesa na Twitter k’egbuchara ndị agha a na Delta.

Nnyocha okwu anyị mere gosịrị na ebiputala ozi ọkụ ọgbụgba a n’onwa Junuwarị nke afọ 2024 nke mebiri ọtụtụ ahịa ndị mmadụ na Rivers steeti.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe nkiri a egosịghị na ọ bụ ọgbụgba ọkụ obodo Okuama na Delta steeti

Add a comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: Content is protected from copying.