Tuesday, April 30, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ambode ohápụ̀rụ̀ APC, gáá Labour Party?

Ambode ohápụ̀rụ̀ APC, gáá Labour Party?
July 15
22:51 2022

Ọtụtụ edemede na mgbasa ozi ọha na-ekwu na Akinwunmi Ambode, onye bụ gọvanọ nke ochie na Lagos, banyere Labour party (LP).

Dịka akụkọ ahụ siri kọwa, nya bụ gọvanọ mbụ bu n’obi ikwu maka ọchịchọ ọchịchị ya n’otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị LP na afọ 2023.

 

Advertisement

Advertisement

 

Ụbọchị ịse n’afọ July, ndị nta akụkọ a na-kpọ Leadership Scorecard dèrè edemede sitere na ebubo na-ewu ewu gbasara Ambode.

Nya bụ edemede na-akọwa na Ambode dèrè okwu, sị ka ndị okorobịa na agbọghọbịa nwete kaadị ntụli aka maka ntụli aka nke na-abịa.

Okwu ahụ gụrụ sị: ” Ụmụ okorobịa na agbọghọobia na-abia. Ike dị n’aka ha. Gaa nụ nwete kaadị ntuli aka ụnụ. Ọdịnihu ụnụ bụ ugbua.”

Advertisement

Ụbọchị asaa n’ọnwa Julaị, mkparịta ụka pụtara na Ambode ịbanye party ọzọ so ná akụkọ nọ n’etiti otu na ịrị na Twitter.

Nchoputa

Advertisement

Mgbasa ozi ọha éjị achọ ihe kpughere na okwu Ambode kwụrụ banyere ndị okorobịa na ụmụ agbọghọobia inwete kaadị ntụlị aka ha bụ nke ọ tinyere na Twitter page ya ụbọchị izizi n’onwa Febụwarị, 2022.

Anyị gara n’ihu ichọ Facebook, Twitter, na Instagram account ya nke dị verified mana anyị ahụghị ébé o dere na ọ ga-ahapụ All Progressives Congress (APC) ịga LP.

Advertisement

Ndị nta akụkọ kwesịrị ntụkwasị obi kwesịrị ide maka udiri ije ndọrọ ndọrọ ọchịchị a, mana onweghị ihe edere maka ya.

TheCable kpọtụrụ onye enyemaka Ambode na Julius Abure, onye ịsị Labour Party. Ha abụọ azaghị ekwentị ha. Anyị ga-emelite akụkọ a ma ha zaa anyị okwu.

Advertisement

Premium Times jụrụ Ifagbemi Awamaridi, onye ịsị Labour Party na Lagos state, ajụjụ. Ọ sị na ebubo na-akọwa na Ambode gàrà LP abụghị eziokwu.

Awamaridi kwùrù sị: “Ambode ka nọ APC. Ọ bụ ezigbo onye òtù APC. Ọ ga-arụ ọrụ ọma gbasara ónyé ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke APC.”

Ikpe

Ebubo edere sị na Ambode anago Labour Party bụ okwu adịgboroja.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.