Thursday, May 2, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Fòtó ìgwé mmadụ̀ à ò sì nà Osun PDP rally?

Fòtó ìgwé mmadụ̀ à ò sì nà Osun PDP rally?
July 26
13:44 2022

Okwu na-ewù na mgbasa ozi ọha na-akọwa na Foto igwe mmadụ a sì na ḿgbákọ òtu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) na Osun state.

Ụbọchị Thursday, PDP hàzìrì mgbakọ òtù nke ndị bekee na-akpo rally na Osun steeti tupu ụbọchị ndọrọ ndọrọ nke edokwara ga-eme na Saturday, ụbọchị ịrị na isii n’ọnwa Julaị.

Abban Atiku, onye mgbasa ozi na Twitter na-aza @abbalala3, kere foto were dee n’okpuru ya sị: “Osun steeti abụghị ọgbọ gị.”

Foto ahụ zikọrọ igwe mmadụ nọ n’okporo ámá, ébé osisi dị iche iche dịgasị.

Advertisement

Ndị nya bụ foto masịrị rùrù pụkụ atọ na narị ịtọolu. Ndị kèrè ya rùrù narị ise. Ndị dere ìhè màkà ya rùrù narị ịse na iri ise na abụọ.

Anyị nyochara akaụntụ Twitter nya bụ onye mgbasa ozi, were hụ na ọ bụ onye kwụdosịrị PDP ike.

Nya bụ foto agbasago ebe niine. E jiri ya were kọwaa na rally ikpeazụ nke PDP mèrè na Osun state gàrà nke ọma.

Ndị mmadụ nọ na Twitter nere ya anya, were tòó igwe mmadụ ha sị bịara nya bụ ḿgbákọ̀.

Advertisement

Otu onye dèrè sị: “Obi dị m ụtọ ma ọ bụrụ na ọ bụ Osun. PDP masịrị m ugboro iri karịa APC ndị ori. Ọ bụrụ na onye ndọrọ ndọrọ Labour Party (LP) enweteghi [ọchịchị], ka senator PDP nke ma agba égwu nweta ya. Obi ga-adị ndị kwadoro Peter Obi ụtọ ma Adeleke bụrụ onye isi.”

Onye ọzọ tụnyere ọnụ sàrà ya okwu sị: “Tiketi efu ga-adị íji kiri Davido na ndị égwu ọzọ. Kedụ ihe ga-eme na ndị mmadụ agaghị agbakọta? Senator ma agba égwu ga-agbara ndị mmadụ egwu ofụọ. Abụm onye na-akwàdó LP mana obụrụ na m ga-aga Osun steeti echi, m ga-aga nwere onwe m obi ụtọ.”

E bipụtara nya bụ okwu na Facebook.

Advertisement

Nchoputa

TheCable ji ngwá ọrụ digitalụ nke a na-akpo Labnol iji chọpụta ebe foto a si na nke yiri ya.

Advertisement

Anyị chọpụtara na foto ahụ bụ nke e sere na Ilorin na Kwara steeti. Ọ̀ bụghị na Osun ka esere ya, dị ka ndị mmadụ kwùrù.

Anyị gara n’ihu ime nnyocha, wee chọpụta na foto ahụ bụ nke esere na èkpéré Eid-el-kabir, nke e mere na Kwara steeti.

Advertisement

E buru ụzọ gbasaa ya n’ụbọchị ịtoolu na ọnwa Julaị.

E bipụtara foto ahụ na akaụntụ gọọmenti Kwara steeti nke Twitter kwadoro.

Advertisement

Ihe e dere gbasara ya gụrụ sị: “Ndị na-efe ofufe na Ilorin, isi ọbọdọ Kwara steeti, ụbọchị Saturday pụtara nnukwu iso Governor @RealAArahman ikpe ekpere Eid-el-kabir ndebe ala nke ọma maka udo.”

TheCable chọpụtara na onye mgbasa ozi na Twitter kere foto dị iche iche nke zikoro ekpere Eid-el-kabir emere nso nso a na Ilorin.

 

Nke a gosịrị na foto a esighi na rally ndị PDP mere na Osun.

Ikpe

Foto a na ekegharị iji gosi na igwe mmadụ nọ na rally ndị PDP meere na Osun State na eduhie ụzọ.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.