Saturday, April 27, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Íhé ńkírí à ébé á gbatùrù ụ́gbọ́élu helikopta ágbasaghị ághá Isreal nà Hamas

Íhé ńkírí à ébé á gbatùrù ụ́gbọ́élu helikopta ágbasaghị ághá Isreal nà Hamas
November 02
20:50 2023

Onyonyoo ndị mmadụ na-ekesa nà sọshal midia egosila ebe ogbunigwe gbátùrù ụgbọ elu helikopta.

Ndị na-ekesa ya na-akọwa nà ọ́ bụ ụgbọelu Isreal ndị agha Hamas nke mba Palestine gbaturu n’agha obodo abụọ à na-alụ.

“Ụgbọelu Isreal kà há gbaturu,” bụ ihe ozi nke @Sentletse, onye ọba ozi X, deputara nye mmadụ puku abụọ n’iri asaa na atọ n’ụbọchị asatọ nke ọnwa October.

Mgbe anyị dere akụkọ a, ozi ahụ enwetala nkiri ruru nde iri na narị puku isii, mmasị karịrị puku asatọ, ntụnye ọnụ puku atọ, na nchekwa izisa oge ọzọ ruru ótù puku.

Advertisement

Advertisement

 

N’ụbọchị asatọ nke ọnwa October, Arun Gangwar, onye nta akụkọ sịrị nà ọrụọla n’ọtụtụ ụlọ nzisa ozi, nke gụnyere India Daily Live, sokwara zisaa ya bụ ozi, ma jiri ákàrà hashtag kwàdó obodo Isreal.

#HamasTerrorists, Ụgbọelu helikopta abụọ nke Isreal nwe bụ nke há gbaturu,” nke à bụ ihe Gangwat zipuru.

Ozi ya enwetala nkiri narị abụọ nà iri n’anọ, mmasị narị anọ n’iri asatọ n’itoolu, ntụnye okwu narị iri ise na itoolu, nkegharị iri itoolu n’ise, yana nchekwa ịgụ mgbe ọzọ ruru iri abụọ nà ise.

Advertisement

“Ndi agha Hamas gbaturu ụgbọelu abụọ ọ́zọ ndị Isreal na Gaza nke Palestine,” ka ótù ozi á hụrụ nà X nke @its_ishaq_khan kwùrù.

Advertisement

Ozi ahụ nwetara ihe nkiri ruru puku iri abụọ n’asaa, ntụnye ọnụ iri abụọ, na nkesa iri na anọ.

Advertisement

ŃDÀBÉRÉ ÓKWU

N’ubọchị asaa nke ọnwa October, ndị agha Hamas sì Gaza bàtá Isreal ibuso isreal agha. Ha sì n’elu, ala, na mmiri wèré bàtá, nke butere ọgbaghara ọhụrụ n’etịti Isreal nà Palestine.

Advertisement

Ka ńwákpò ahụ bịara ná njedebe, ihe ruru mmadụ ótù puku na narị anọ bụ ndị há gburu, ebe mmadụ narị abụọ bụ ndị há nwụ̀chìrì.

Gaza, nke ndị agha Hamas na-achị, bụ obere obodo nọ n’etiti Isreal nà osimiri Mediterranean, nke yana ọdịda anyanwụ ḿbà Isreal nwèrè àgbàtà óbì.

Ndị agha Hamas kpọrọ nwakpo ahụ “Operation Al-Aqsa Storm”. Há sị nà há àkwádólá ya kamgbe afọ abụọ gara-aga.

Ndị isi Hamas kwùrù sị́ nà há tụ̀rụ̀ ogbunigwe karịrị puku ise n’ime Isreal. Há sị̀ nà nke à bụ ibo ubo megide “mmerụ” Isreal merụrụ ebe ekpere Al-Aqsa nke dị nà Jerusalem. Hamas kwukwara nà nya bụ agha bịara ịkwụchiga Isreal ụgwọ màkà ọnwụ ndị Palestine rúrú ọ̀tụ́tụ́ narị.

Isreal, n’aka ǹkè há, ṅụrụ iyi site n’ọnu Benjamin Netanyahu, ónyé prime minister obodo há, nà há ga-ememila ndị agha Hamas. Há si ndị obodo Gaza pụọ be ha màkà na ndị agha Isreali Defence Force (IDF) ga-eji ike wákpò há.

Mana ihe onyonyo ahụ ahụtara na ịntanetị ò nwèrè ihe jikọtara yana ńwákpò Hamas wakporo Isreal?

ŃNYÒCHÁ

Anyị nyochara isi okwu ya bụ onyonyo n’ọba ozi X, nke gosịrị nà ihe nkiri ahụ gazuru ebe niile na ịntanetị n’ụbọchị asaa nke ọnwa October. Nke à bụ ụbọchị Hamas wakporo Isreal n’ike. Onyonyo a bịara bụrụkwa nke dịgoro na ịntanetị ruo kà ekesara ya ọzọ n’ụbọchị iri nke ọnwa October.

Nnyocha ọzọ, nke anyị jiri ngwa ọrụ á na-akpọ reverse image search mé, gosịrị nà ekesara ihe onyonyo ahụ m̀bụ́ n’ụbọchị atọ nke ọnwa October n’ọba ozi YouTube site n’aka Kazinka Warrior, asafe onyonyo egwuregwu.

“Ihe a, abụghị ihe ngosị dị ire. Ọ bụ nnọọ ihe aka mere,” ihe à bụ ihe onyonyo egwuregwu ahụ kwuru.

Nlele ihe mbipụta gásị́rị́ n’asafe egwuregwu ahụ gòsị̀rị̀ onyonyo ndị ọzọ dị ótú ahụ nke Arma 3, ihe egwuruegwu á nà-agba n’etiti ncheputa, dịkà ebe a na-alụ agha nà 2035.

N’afọ 2022, Bohemia Interactive, ndị nwe Arma 3, ebe á na-arụpụta ihe egwuregwu ndị ahụ, bipụtara ókwú sị na onyonyo ahụ dị́ ebeniile na ịntanetị bụ nke si na ihe egwuregwu ha rụpụtara. Há sị nà o metụtara há nà ndị mmadụ na-atụ asị amaghị àmá nà n’ ó sì n’agha Russia na-anụso Ukraine.

Iji weta òkè n’etiti ihe onyonyo egwuregwu nà ihe nkiri agha dị ire, Bohemia Interactive gwara ndị mmadụ kà há lepu anya màkà ihe ngosị n’apụtaghị ihe ọfụma, ngosi ihe n’adịghị ire dịka ịgosị ụfọdụ akụkụ eligwe k’ọnorọ onwe ya, ihe nkiri na-ama jìjìjì, yana nke n’eseteghị ndị mmadụ na-aga íjè ọfụma.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe onyonyo ahụ na-egosị ebe ogbunigwe gbaturu ụgbọelu helikopta abụọ enweghị kà ó sì gbasa agha dị n’etiti Isreal nà Hamas. Ihe ngosị ahụ bụ onyonyo ihe egwuregu ndị Arma 3 rụpụtara.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.