Monday, April 29, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Obasanjo a kwàdòrò Peter Obi, ma kwa kpọ ya onye nwere ùgwù?

Obasanjo a kwàdòrò Peter Obi, ma kwa kpọ ya onye nwere ùgwù?
June 18
09:58 2022

Otu akaụntụ mgbasa ozi ọha nọ na Twitter nke n’aza aha Olusegun Obasanjo, onye ịsị mbụ Naijiria, kwuru na Peter Obi, onye chọrọ ịbụ onye isi obodo, bu mmadụ nwere ùgwù.

Ụbọsị iri na anọ, n’ọnwa June, kà ọ gbasara ozi a.

Ozi ọ gbasara bù foto Obi, ma kwa buru nke Obasanjo.

“Ọ bụrọ ónyé nsọ. Mana n’ime ndị ndọrọ-ndọrọ ọchịchị niine, o nwere ùgwù,” akaụntụ ahụ dèrè.

Advertisement

Nya bụ akaụntụ nwere mmadụ puku ise n’eso ya oge ọ edere maka Obi.

Ndị n’eso ya ugbua elugo puku iri.

Ndị ozi ya masịrị karịrị puku iri atọ na atọ.

Advertisement

Ndị kere ozi ya karịrị puku asatọ.

Ihe ndị mmadu dere banyere ya karịrị narị itoolu.

Ụfọdụ ndị mgbasa ozi ọha hụrụ edemede a kwere na ọbụ Obasanjo dere ya.

Ha jara Obasanjo mma maka nkwàdo ha sị na o nyere Obi.

Advertisement

Onye ọha Twitter na aza Festus Agene kwùrù sị: “Òtùtó ọma si n’ọnụ OBJ.”

Onye ọzọ aha ya bụ Dave Saint tụnyere ọnụ sị: “Ùgwù dị ụkọ n’ime ndị ndọrọ-ndọrọ ọchịchị nke taa. Mmadụ dịka Peter Obi nwere ya nke úkwú. Daalụ, Olusegun Obasanjo, maka okwu ọma gị.”

NCHỌPỤTA

Onwerọ usoro mgbasa ozi kwesịrị ntụkwasị obi nke dere maka ihe ha sị na onye isi mbu obodo Naijiria kwuru.

Advertisement

TheCable kpọrọ Kehinde Akinyemi, ọnụ n’ekwuchitere Obasanjo.

Ọ sị na onwerọ mgbe nya bụ onye isi mbụ obodo Naijiria ji wee kwuo nya bụ okwu.

Advertisement

NKPEBI

Okwu pụtara na mgbasa ozi oha, nke sị na Obasanjo kwadoro Peter Obi, abụghị eziokwu.

Advertisement

Akaụntụ nya bụ okwu sì pụta abụghị nke Obasanjo.

Advertisement

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.