MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Ọ̀ bụ̀ ézíókwu nà Buhari árụghị ụ́zọ̀ ụ́gbọ́ òlòkó nà ọ́dọ̀ ụ́gbọ́élu dị́kà Jimoh Ibrahim kwùrù?

Ọ̀ bụ̀ ézíókwu nà Buhari árụghị ụ́zọ̀ ụ́gbọ́ òlòkó nà ọ́dọ̀ ụ́gbọ́élu dị́kà Jimoh Ibrahim kwùrù?
December 31
17:36 2023

Jimoh Ibrahim, ónyé sịnatọ na-anọchite anya ndị Ondo South, kwuru nà ónyé bụ́bu onye ísíàlà bụ Muhammadu Buhari árụghị ọ́dọ̀ ụgbọelu maọbụ ókpóró ụ́zọ̀ ụgbọ òlòkó sì àgá, mgbe ọ na-achị.

Ibrahim kwuru nà ọdọ ụgbọ elu nà ụ́zọ̀ ụgbọ oloko, nke Buhari mepere, bụ ndị Goodluck Jonathan rụ̀rụ̀ mgbe ọ́ nà-àchị́.

Dịka o kwuru n’ihe mkparịtaụ́kà Channels Television Politics Today, ónyé azụmahịa a kwùrù na ọnọdụ ákú n’ụ́bá àlà anyị “gbádàrà” n’ọ̀chị́chị́ Buhari.

“Afọ abụọ kà Buhari bàtàchàrà n’ọchịchị, akụ n’ụba bịara gbádà rụọ ijeri dollar ịrị n’asaa($17). Íhé niile gbadara n’ọchịchị Buhari, ị́hé niile mébìrì,” Ibrahim kwuru.

Advertisement

“Ọ́dù úgbọ́ ólókó niile n’ọ́dù ụgbọelu ndị a bụ Jonathan rụ̀rụ̀ ha. Ónwéghị́ ótù ọ́rụ́ ọ bụla dị ótù ijeri dollar aga-asi nà Buhari kwadoro.”

ÓKWÚ: BUHARI ÁRỤGHỊ Ọ́DỌ̀ Ụ́GBỌ́ ÉLÚ NÀ ÚZỌ̀ Ụ́GBỌ́ ÒLÒKÓ; JONATHAN RỤ̀RỤ̀ HÁ

Ị́NYÒCHÀ ÓKWÚ À

Advertisement

N’ọnwa Septemba nke afọ 2021, Femi Adesina, ónyé bụ bụrụ onye ndùmọ́dụ́ nye Buhari n’ihe gbasara mkwupụta ókwú nà mbipụta , gụpùtàrà “ọtụtụ ọrụ arụ́tụ̀bèghị̀ mbụ” ọchịchị Buhari rụrụ.

Adesina gụ́pùtàrà ọ kpọrọ ụzọ ụgbọ òlòkó sị̀-aga nkè dị nà Itakpe-Warri, Abuja gáwá Kaduna, ọ́gúpụ̀takwàrà Abuja Metro line, yá nà Lagos Ibadan rail line Dịka ọrụ árụ̀gásị̀rị̀ mgbe Buhari nọ̀ nà ọchịchị.

Ị́rụ́chá ụzọ ụgbọ òlòkó ndị a, nwetara ọtụtụ ntúnye ọnù nye ọchịchị bị́dọ́ró há bụ ọrụ, ọ kachasị ọ kpọrọ ụzọ ụgbọ òlòkó sị-ágá dị nà Abuja gáwá Kaduna.

ÍHÉ Ị́ KWÈSỊ̀RỊ̀ Ị́MA MÀKÀ Ụ́ZỌ̀ Ụ́GBỌ́ ÓLÓKÓ ǸKÉ SI ABUJA GÁWÁ KADUNA

Advertisement

Ụ́zọ̀ ụgbọ òlòkó nke si Abuja gawa Kaduna bụ̀ ụ́chè nchepụta ọnye bụbu ónyé ị́sí àlà Olusegun Obasanjo, ónyé chị́rị́ òbòdó anyị sìté n’afọ 1999 na 2007. Nkwekọrịta nke atụmatụ ọ́rụ́ à, bụ̀ nke e nyere ụlọrụ na-árụ́ ókpóró ụ́zọ̀ bu China Civil Engineering Construction Corporation Ltd (CCECC), nke gbakọtara ijeri dollar asaato na uma nde nari ato($8.3 billion), nke aga-éjị́ égó ebìtere na China rụọ.

Ókpóró ụ́zọ̀ à ụgbọ òlòkó sị̀-ágá sị Abuja gawa Kaduna bụ nkè ébù ụzọ tụọ árò k’ósónyé atụmatụ ụzọ ụgbọ sị Lagos gawa Kano nke akpọrọ Lagos standard guage modernisation project(SGRMP),mà nà ị́hé gbasara égó ejị arụ yá mèrè k’akwusị nya bụ atụmatụ.

Òrúrú ókpóró ụ́zọ̀ à ụgbọ òlòkó sì-ágba sịtere Abuja gawa Kaduna bụ nke ébidoro n’ọnwa Febrụwarị 2011, mà kwụsị n’ọnwa December n’afọ 2014.

Jonathan chịrị dịka onye nnọchịte ányá onye isiala sị́té n’ọnwá Febrụwarị rụọ ọnwa May 2010, nà dịka onye ịsị àlà sịte n’ọnwa May nke afọ 2010 rụọ May 2015.

Advertisement

Akụkụ ụzọ á sị́ Abuja gawa Kaduna bụ ụzọ ụgbọ òlòkó sị ágbá nke mbụ ánà-árụ́ site n’ụzọ nke sị Lagos gawa Kano sị́té n’átụ̀màtụ̀ SGRMP.

Ị́ZỤ́TÁ ŃGWÁ-Ọ́RỤ́ ÉJỊ̀ ÁRỤ́ Ụ́ZỌ̀ À Ụ́GBỌ́ ÒLÓKÓ N’ÁGBÁ SỊ́ ABUJA GÁWÁ KADUNA

Advertisement

N’ọnwa Ọktoba nke afọ 2014, ngalaba federal executive council kwadoro ọnù égó nde dollar isii n’uma pụku narị isii ị́jị́ zụta ụgbọ òlòkó abụọ nke ókpóró ụzọ ụgbọ òlòkó sị̀-aga sịtere Abuja gawa Kaduna. Jonathan nyere Buhari ọchịchị n’ubochị iri abụọ n’itolu nke afọ 2015 mà mechaa rụ́chá nya bụ̀ ụzọ.

BUHARI BÌDÒRÒ Ị́RỤ Ụ́ZỌ̀ Ụ́GBỌ́ ÓLÓKÓ ABUJA-KADUNA

Advertisement

N’ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Julaị, Buhari bidoro ị́rụ́ ókpóró ụzọ ụgbọ òlòkó sị ágá sịtere Abuja gawa kaduna n’ọdụ ụgbọ òlòkó dị nà Idu, Mgbè ánà-é.épé nyá bụ ọ́dụ̀ ụgbọ òlòkó, Buhari kwupụtara ńkwádó yá ị́hụ́ n’árụ̀chàrà atụmatụ ọrụ niile ésị̀ n’ọ́chị́chị́ Jonathan búbàtá.

Ọ́RỤ́ Ụ́ZỌ̀ Ụ́GBỌ́ ÓLÓKÓ ŃDÍ Ọ̀ZỌ́

Advertisement

Atụmatụ ụ́zọ̀ kilomịtà narị iri na iri ise na asaa ụgbọ òlòkó sị-ágá sịtere Lagos gawa Ibadan sò n’ótù ụzọ ụgbọ òlòkó sị̀-ágbá nke ọchịchị Buhara mepere, mana ọ lee ọchịchị bịdóró yaà?

Ụgbọ mbụ sịrị Lagos gawa Ibadan bụ̀ ná mbịdó afọ 1900, mgbè ọchịchị ịke ndị Britain, ụzọ a ụgbọ òlòkó sị ágbá sị́ Lagos gawa Ibadan sò n’ụzọ̀ ndị ọchịchị Britain rụrụ mgbè há n’áchí Nigeria n’íké bụ nkè ọchịchị Naijiria mechara nwéré.

Kà ọ́tụ́tụ́ afọ site mgbè Naịjiria nwetara nwere onwe ha bù Independence gasịrị, ndị njem kà n’énwórị́ ụ́gbọ́ òlòkó ndị ọchịchị Britain rụ̀rụ̀, K’osiladị n’afọ 2003, ụ́zọ̀ ndị a bịara mebie, ọchịchị Jonathan gbalịrị kà há mezie yá bụ ụ́zọ̀ sịrị Lagos gawa Ibadan.

N’ọnwa June nke afọ 2012, n’ọ́chị́chị̀ Jonathan, ọgbakọ federal executive council kwadoro égó rụ̀rụ̀ otu ijeri dollar n’uma nde iri na itolu($1.49 billion), màkà ị́mézì ụzọ ụ́gbọ́ òlòkó sị́rị́ Lagos gawa Ibadan.

Ụlọrụ China ná-árú ụzọ bu CCECC nwetara ọ́rú à.

K’ọnwá abụọ gachara, ọchịchị Naijiria nwere nkwekọrịta nghọta n’etiti hà n’ulorou CCECC ị́rụ́ ụ́zọ̀ ụ́gbọ́ òlòkó.

Idris Umar, ónyé bụ onye minịsta n’áhụ́ maka njem mgbe ahụ kwụrụ sị nkwekọrịta a, gósị̀rị̀ úchú ọchịchị Naijiria imeziga sị ụzọ̀ ụ́gbọ́ òlòkó sị-agba na Naijiria. Umar kwụrụ n’ọrụ ndị CCECC kwesịrị ị́bụ́ ọnwa iri atọ n’isii,nke ọchịchị China ga-eso etinye e’égò nà yá, sịte n’ego mbịte ga-esị nà China Exim Bank.

Ọ́rụ́ à ébị́dóghị́ n’ọ́chị́chị́ Jonathan, mànà n’ọnwa 2016, dịka ọchịchị Buhari nwètàrà mkpébị̀ ọhụrụ n’étị́tì há n’ọ́chị́chị́ ha.

N’ÒKPÓRÙ Ọ̀CHỊ́CHỊ́ BUHARI, ÉNWÈTÀRÀ ÉGÓ Ọ́ZỌ́ Ị́KWÀDÒ Ọ́RỤ́ Ụ́ZỌ̀ Ụ́GBỌ́ ÓLÓKÓ ǸKÉ SÍ LAGOS GÁWÁ IBADAN

N’ọnwa Januarị nke afọ 2017, ọchịchị gometị Nijiria kwụrụ nà ó nyépụ̀lá ijeri naira iri asaa n’abuọ dịka, nsòyé égó ịkwado ọ́rụ́ ókpóró ụ́zọ̀ sị́ Lagos gawa Ibadan.

N’ọnwa march nke afọ 2017, ónyé bụ́ bụ́rú òsòtè ónyé ị́sí àlà Yemi Osinbanjo, mepere nya bụ ụ́zọ̀ ụgbọ òlòkó sị́ Lagos gawa Ibadan. K’afọ anọ gachara, Buhari mepere ya bụ ókpóró ụgbọ òlòkó si ágá màkà Ị́bú ndị njem n’ọdụ ụgbọ òlòkó dị́ nà Mobolaji Johnson, n’Ebute Metta, Lagos.

Ụ́ZỌ̀ Ụ́GBỌ́ ÓLÓKÓ ITAKPE-WARRI

N’ọnwa Septemba, nke afọ 2020 Buhari mèpèrè ókpóró ụ́zọ̀ kilomịta narị atọ n’iri abụọ n’isii (326KM) sị́rị́ Itakpe gawa Ajaokuta, bịa gawa Warri.

Ọ́rụ́ a nke bị́dóró n’afọ 1987, n’ókpúrù ọchịchị ndị ághá mị́lị́trị̀ nke Ibrahim Babangida, k’árụ̀rù ịji n’èbú ígwè Iron ore sịté n’ulọrụ ébé ana-emeputa yá nke dị na ókíríkírí Itakpe gawa Ajaokuta steel ébé ana-edozi ya.

Áhápùrù ọ́rú a k’árùchàrà kilomita narị abụọ n’iri ise n’anọ maka ụ́kọ́ égó. Mànà ọchịchị Jonathan bìdòrò nya bụ̀ ọ́rụ́ ọ́zọ́ ébé ọchịchị Buhari rùchàrà ya.

N’ọnwá Novemba nke afọ 2009, ọchịchị Naijiria kwadoro ịkwụ ijeri naira iri ato n’ato maka ị́dózí n’irụ́chá okporo uzo a. Team Nigeria na Julius Berger nwetara ọrụ ịrụzi ụ́zọ̀ ahụ, n’atumanya na-aga arụcha ya n’afọ 2013.

Aruchaghị ya tupu enwe ọchịchị ọhụrụ n’afọ 2015. N’afọ 2017, ọchịchị Nijiria nke Buhari nọ̀ n’isi ya kwupụtara uche óbì ya ị́dózị́ghárị́ nya bụ ụzọ úgbọ́ sì-aga ébé enyere Julius Beger ọrụ ịdozị nya bụ ụzọ ndị mechara pụọ n’ọrú ahu.

N’afọ 2019, ọchịchị Buhari banyere na nkwekọrịta inye ụlọrụ China Railway Construction Corporation Limited ọrụ ịrụ ókpóró ụzọ ụgbọ òlòkó sị àgbá jikọrọ Abuja, Itakpe na Lokoja nke égó rụ̀rụ̀ ijeri dollar atọ n’uma nde itolu($3.9bn).
Emechara rụchaa nyá bụ ókpóró ụgbọ òlòkó si-agba n’ọchịchị Buhari kamgbe ọ́tụ́tụ́ afọ a hapụrụ nya bụ ụ́zọ̀.

Ọ́DỌ̀ Ụ́GBỌ́ÉLU

N’ógè ọchịchị Jonathan, gọọmenti Nijiria bịdoro ịrụ ụfọdụ ụ́zọ̀ nke gụnyere ịrụgharị, n’igwogharị ụfọdụ ọ́dụ̀ ụgbọelu na Nijiria. Ọchịchị Jonathan, bịdoro ọrụ ndị à ịjị́ kwalịte ọnọdụ ọdụ ụgbọelu ọkachasị ị́rụ́ ọdụ ụgbọelu ọhụrụ.

N’ọnwa Septemba 2012, ọchịchị gọọmenti Naijiria, n’ókpụ́rù ọchịchị Jonathan kwadoro ijeri naira, otu nari na isii ịjị́ rụọ ọdụ ụgbọelu mba òfèsị́ iri n’otu na Nijiria.

N’ọnwa May nke 2013, Jonathan mepere mà nwogharia ọdụ ụgbọelu mbà òfèsị́ Akanu Ibiam dị n’Enugu, tụ́nyé ntụ́àlà ịrụ ọdụ ụgbọelu ọhụrụ ébé ahụ.

N’ọnwá Julai n’afọ 2013, ọchịchị gọọmenti Nijiria nà China banyere ná nkwekọrịta mgbázị́nyé égó ijeri dollar narị ise, ịrụ ọdụ ụgbọelu n’Abuja, Lagos, Port Harcourt nà Kano. Gọọmenti Naijiria k’atụrụanya n’ọ́gà éwétá ijeri dollar otu narị dịka nsònyè ego.

N’agbanyeghị n’ọrụ a bị̀dòrò n’ógè ochichi Jonathan, onweghị nke arụchara n’ọchịchị yá.

Ọchịchị Jonathan, tụrụ ntụ àlà màkà ịrụ ọdụ ụgbọelu ndị a na Naijiria. Mgbè Buhari banyere n’ọchịchị n’afọ 2015, ọ gara n’ihu n’ọ́rụ́ ndị́ ọchịchị ndị ọzọ hapụrụ nà ngàlàbà ụgbọ élú.

Na Oktoba 2018, Buhari mèpèrè ọdụ ụgbọelu ọhụrụ n’ọdụ ụgbọelu Port Harcourt, nke dị ṅà Port Harcourt na Rivers stéétị̀.

N’ọnwá March 2022, Buhari mèpèrè ọdụ ụgbọelu ọzọ nọdụ ụgbọelu Murtala Muhammed dị na Lagos.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ọ gaghị abụcha eziokwu ịkwụ nà Buhari arughị ọ́dụ̀ ụgbọelu n’ụgbọ òlòkó. Ébé ọchịchị bụ chịrị gáwá, Buhari nwèrè ịke ịnárá otị̀tó màkà ịrụcha ọdụ ụgbọelu n’ụgbọ òlòkó ndị a, ndị ahapụrụ arụchághị arụcha.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.