Tuesday, May 14, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Ọ̀ bụ̀ ézíókwu nà ńdị́ ùwé ójíi kpọ̀chìrì Naira Marley nà Sam Larry nà ǹgá?

Ọ̀ bụ̀ ézíókwu nà ńdị́ ùwé ójíi kpọ̀chìrì Naira Marley nà Sam Larry nà ǹgá?
September 21
19:40 2023

Ótù ókwu á gụ̀tàrà n’ọba ozi soshal midia ekwuola sị na ónyé na-eti égwu á màrà ọfụma bụ́ Naira Marley, yana onye na-akwalite égwu bụ́ Samson ‘Sam Larry’ Balogun, bụ ndị uwe ojii kpọchiri ụbọchị ole n’ole Mohbad, onye égwu ọzọ, nwụrụ.

“A kpochiela ha, Naira Marley nà Sam Larry! A gà-àjụ́ ha ajụjụ ọnụ gbasara ihe nkiri na-ewu ewu nke gosịrị mmegide metụtara Mohbad,” ihe à kà onye kpọrọ onwe ya @mrklassiq_ dere.

Kamgbe ihe mbipụta à pụtara, o nwetala nkiri ruru puku atọ n’ụma narị atọ. Nya bụ ókwú masịrị mmadụ iri atọ n’ụma narị anọ, nke tinyere nkesa ya nà puku abụọ, narị isii n’iri abụọ n’abuo n’ọba ozi X, nke amaburu dịka Twitter.

Advertisement

Ewepu X, ahụkwara mbipụta dị otu à na Facebook, ebe há sị na ndị uwe ojii anwụchiela Naira Marley nà Sam Larry.

MOHBAD

Advertisement

Mohbad bụbu ótù n’ime ndị òtù égwu á màrà dịka Marlian Records, nke Naira Marley nwe. Mohbad, onye gbara naanị afọ iri n’asaa, nwụrụ n’ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa September. Há liri ya n’ụbọchị sotere ọnwụ ya.

Ọnọdụ ọnwụ Mohbad agaala n’ihu ịkpali ọtụtụ ntụnye ọnụ ndị mmadụ n’ọba ozi soshal midia. Ọtụtụ ndị Nigeria na ndị hụrụ egwu Mohbad na-akụ n’anya tụnyekwara ọnụ n’okwu.

N’ụbọchị ise nke ọnwa October, ọgụ egwu a nwụ́rụ́ ànwụ́ tipuru ḿkpụ́ enyemaka n’igwe ozi X, gbasara “mmekpa ahu” ọ sị ndị òtù Marlian Records na-emeso ya.

Advertisement

“Nanị màkà m chọrọ ịgbanwe onye nnekwata m, onye bụ nwanne ha nwoke, lee ihe ha mere m n’ụlọ ndị Marlian,” ihe a
kà o dere na Twiter, mà jiri ihe ngosị ọnya ọbara juru n’ahụ ya sonye nya bụ ozi.

Ọ gara n’ihu ịyọ enyemaka, sị: “A nà m ànwụ́ n’ime óbì m.”

Ọtụtụ mmadụ na-asị na ọgụ egwu à bụ onye ndị òtù Marlian Record na-akụ ihe, mà na-emegide n’otutu oge dị iche-iche.

K’osiladị, mkpesa nke ekpesara n’ụbọchị iri n’asaa nke ọnwa June nke afọ 2023 apụtala n’ọba ozị soshal midia ebe Mohbad kpesara mkpesa ịma ndụ ya aka, ịma ụma ebibie ihe onwe, ikụ ihe, yana mmegbu megidere ya site n’aka Sam Larry.

Advertisement

Mkpesa a bụ nke ezigara ụlọ uweojii Force Criminal Investigation Department (FCID) nke Alagbon dị na Lagos.

Sam Larry agala n’ihu wezuga ásáfè Instagram ya, dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-agwa ya okwu ọjọọ kà Mohbad nwụchara.

Advertisement

N’ebe Naira Marley nọ, ndị na-esobu nya bụ onye égwu gara n’ihu ịkwụsị ísò ókwú ya n’ọba ozi Instagram.

ÀKPỌ́CHÌBÈGHÌ NAIRA MARLEY NÀ SAM LARRY

Advertisement

Nnyocha TheCable mèrè gosịrị na ndị uwe ojii akpochibeghị Naira Marley maọbụ Sam Larry màkà ajụjụ ọnụ gbasara ọnwụ onye ọgụ égwu à.

“Ozi a bụ àsị́. Ọbụghị eziokwu. Onwebeghị onye akpọchiri,” Oluniyi Ogundeyi, onye nkwuchite ọnụ ụlọrụ FCID nà Lagos, kwuru.

Advertisement

TheCable adịla nà m̀bụ́ bipụta na ndị uwe ojii ebidola inyocha ọnwụ onye ọgụ egwu bụ́ Mohbad, onye amatabeghị ihe kpatara ọnwụ ya.

N’ụbọchị Monday, abalị iri na asatọ nke ọnwa September afọ 2023, ehibere mmadụ iri n’atọ ga-enyocha okwu a. Ha bịara kpebie na há ga-abọlite ózú ọgụ egwu a m’ọdị ḿkpà.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu a n’asị na ndị uwe ojii akpọchiela Naira Marley na Sam Larry n’ụlọ nga bụ àsị́. Ndị uweojii ka na-enyocha ya bụ okwu. Onwebeghị onye há kpọchiri kamgbe.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.