Sunday, April 28, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ọ̀ bụ̀ íhé ìwú ákwàdòghị̀ kà NNPC kwụ́nyé égó ó rètàrà ná ḿmánụ́ àlà n’ímé CBN — dị́kà Atiku kwùrù?

Ọ̀ bụ̀ íhé ìwú ákwàdòghị̀ kà NNPC kwụ́nyé égó ó rètàrà ná ḿmánụ́ àlà n’ímé CBN — dị́kà Atiku kwùrù?
February 15
11:14 2024

Atiku Abubakar, onye bụburu onye osote onye isi ala, kwụrụ na ntụziaka gọọmenti nyere ụlọrụ Nigerian National Petroleum Company (NNPC) ịkwụnye ego há rètàrà na mmanụ àlà n’ime ụlọ akụ Central Bank of Nigeria (CBN) bụ̀ nke ìwú akwadoghị.

Atiku kwuru íhé a dịka Olayemi Cardoso, gọvanọ CBN, kọwara nà CBN, na ngalaba na-ahụ maka ego obodo, na NNPC ga-arụkọ iji hụ na “eweghachitachara ego mba ofesi niile n’ọba ego CBN”.

Itunye ọ́nụ n’okwu Cardoso kwuru, Atiku sị na mkpebi ahụ megidere ụsoro ọrụ ụlọrụ NNPC.

“N’agbaghaghị nà ihe ọma nwere ike pụta na mkpebi gọọmenti etiti inye CBN ike ichekwa ego érètàrà na mmanụ àlà nke ụlọrụ NNPCL, e kwesịrị ikwu ya kpọm kwem na ụ́zọ̀ há sì achụ nya bụ ókwú bụ nke ìwú akwadoghị,” Atiku kwuru.

Advertisement

“Ọ́ bụ̀ echiche ǹkị́tị́ nke nwere ike imebi nwere onwe ụlọrụ NNPCL.”

Atiku gwara gọọmenti kà há “kwanyere iwu àlà anyị ùgwù, ma kwe ka ụlọrụ NNPCL rụọ dịka ụlọrụ nọrọ onwe ya”.

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

Advertisement

NNPC gbanwere ịbụrụ ụlọrụ na-akpata ego bụ limited liability company n’ọnwa Julaị nke afọ 2022, n’usoro iwu Petroleum Industry Act (PIA).

Dịka nke a, NNPC nwetara ikike igbanwe dịka ụlọrụ bú n’uche ịkpa ego n’okpuru Companies and Allied Matters Act (CAMA) n’ọnwa Septemba nke afọ 2021.

Muhammadu Buhari, onye bụbu onye isiala, kwuru n’ụbọchị mmepe ụlọrụ à na NNPC ga-arụ “n’enweghị ntinye anya nke iwu ụlọrụ gọọmenti ọbụla dịka Treasury Single Account, public procurement, na Fiscal Responsibility Act”.

K’osiladị, gọọmenti bụ ya nwe òkè niile nà NNPC — ọbụladị ka ụlọrụ a na-akwadọ ikwe ka ndị mmadụ zụrụ òkè nà nya bụ ụlọọrụ n’ọdịnihu.

Advertisement

GỊ́NỊ KÀ ÌWÚ KWÙRÙ?

NNPC, dịka iwu ụlọrụ na-emetụ ta mmanụ ala bụ́ PIA kwuru, bụ nke atụrụ anya idebe ụma ego eretara na mmanụ ruru pasentị iri abụọ (20%), ebe pasentị iri asatọ (80%) bụ nke a ga-akwunye n’akpa gọọmenti.

Nkebi 53 (7) nke iwu PIA kwuru na NNPC na mpaghara niile o nwere gà-àkwádó ọrụ ha n’usoro ụlọrụ bú n’uche ịkpa ego” n’achụghị enyemaka gọọmenti.

Ịgbakwụnye, o kwuru na NNPC ga-arụ dịka ụlọrụ na-achụ ego dịka obodo deputara nà iwu Companies and Allied Matters Act. Nke a pụtara nà há ga-ekwuputa ego ha retara nye sọ ndị nwere òkè n’uloru há, ma hapụfọ pesenti iri abuo (20%) n’ego há retara iji kwalịte ùtó ụlọrụ ha”.

Advertisement

Iwu kwukwara na ebe NNPC nwere ụma úrù ruru pasenti narị na mgbazinye ọbụla, uloru a ga-akwụ ụgwọ ha niile n’onwe ha.

Iwu à gara n’ihu kwuo na NNPC bụ ụlọrụ nwere ikike ịmịpụta mmanụ n’ala ọbụla, nke akpọrọ “production-sharing contracts (PSC)”, ya na íkè uru ha nwetara na ihe ize ndụ ọbụla ga-adakwasa nya bụ ụlọrụ, n’aha Naijiria.

Advertisement

Dịka nkebi 64 (C) nke PIA kwuru, NNPC nwere iwu ịkwalite, mà ree mmanụ n’okpuru nkwekọrịta à, site n’ọnụ ego obodo kpebiri nà há ga-akwụ màkà njikwa.

Ewepuchaa mmefu na ego há ji emepụta mmanụ, ụlọrụ NNPC na ndị nsonye ya ga-abịazie kee uru ọbụla há retara.

Advertisement

N’ime úrù niile ụlọrụ à ga-enweta, pasenti iri atọ ga-aga n’ịchọ mmanụ ọfụrụ n’ala ebe amịbeghị mmanụ nà Naijiria mbụ, ihe bekee na-akpọ “frontier basin”.

Ewepuchaa nke ahụ, ụlọrụ a bụ nke iwu mabidoro ịkwụnye ego fọrụ n’ime akpa gọọmenti etiti — nke nwere ike isite n’ọba ego CBN maọbụ ụlọ akụ ndị ọzọ nke NNPC na gọọmenti kwekọtara nà yá.

Advertisement

GỊ́NỊ KÀ ŃDỊ́ Ọ̀KÀCHÀMÁRÁ KWÙRÙ?

Ịtụnye ọnụ n’okwu a, Oyeyemi Oke, onye osọnwere n’ụlọrụ AO2LAW, kwuru na NNPC bụ ụlọrụ ofu onye nwe, nke a kporo “private limited liability company”.NNPC strikes deal with CBN over revenue management, to continue (thecable.ng)

“Íhé ọ pụtara bụ na ọbụghị ụlọrụ ọtụtụ mmadụ nwe n’usoro iwu CAMA Act. NNPC Limited bụ nke ụlọrụ Ministry of Finance Incorporated (MOFI) na Ministry of Petroleum Incorporated (MOPI) nwè, ndị nke bụ ụlọrụ gọọmenti nwe,” o kwuru.

“Anyị tụlee ya n’anya ụlọrụ ótù onye nwe, ọbụrụ n’ọbụ ótù onye nwe ụlọrụ, ọ bụ ndị nwe òkè n’ụlọ ọru ahụ (MOFI na MOPI) ga-ekwu ótú a ga-esi mee ihe gbasara ego n’ụlọ ọrụ ahụ. Ọbụrụ na ụlọrụ abụọ a kwekọtara na ha chọrọ ka ego há retara gaa n’ụlọ ọrụ CBN, echeghị m na ọ dara iwu nke ụlọrụ a.”

Ka e mechara ọgbakọ na Abuja n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Febrụwarị nke afọ 2024, ụlọrụ NNPC na CBN kwupụtara na ha “ewoghariala iwu itinye okpurukpu ego érètàrà na mmanụ n’ime ụlọ akụ CBN”.

N’ihe mbipụta nke ụlọrụ abụọ à dere, ha kwuru na ha etinyela anya n’ihe gbasara ego érètàrà n’ụlọ ọru ahụ, mana sị na ha agaghị akwụsị itinye ego n’ụlọ akụ ndị ọzọ.

Cardoso, n’ụbọchị ise nke ọnwa Febrụwarị nke afọ 2024, tụnyeturu na, ewepu NNPC, ụfọdụ ụlọrụ ndị ọ̀zọ́ sò ná ndị “ga-ahapụ ihe gbasara ego ha n’aka CBN”.

Ụlọrụ ministry ndịa (MDAs) na ụlọrụ na-akpata ego bụ́ “revenue generating agencies” (RGA) na-akwụnye ụgwọ n’ime akpa gọọmenti bụ “federation account”.

Ego a bụ nke a ga-emecha kesaa site n’ọba ego federation account allocation committee (FAAC), nke a ga-emecha kesaa nye mpakala gọọmenti n’atọ.

“Ego ụlọrụ a kwesịrị ịga n’oba ego Naijiria. Ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ bụ, kedụ ụlọ akụ ego Naijiria nọ n’ime ya? Ọ nọ n’akpa ụlọ akụ ótù onye nwe kaọbụ CBN? CBN kwesịrị ịbụ ndị na-ejide ego ala Naijiria,” Oke kwuru.

Ọburu na nke a bụ nkwekọrịta NNPC na CBN, ọ ga abụ ihe n’ezighi ezi ka ụlọrụ abụọ ziga ego n’ime akaụntụ Naijiria ebe ọbụ na ọnọ na CBN.

Onye ọzọ bụ Jide Pratt, onye ọkachamara na ihe gbasara mmanụ crude kwuru na mkpebi CBN bụ nke iwu kwadoro, ọ gara n’ihu kwuo na n’agbanyeghị na NNPC bụ nke ofu onye nwe n’ọbụ kwa ụlọrụ gọọmenti nwe.

Dịka nke a, o kwuru na iwu Nigeria Upstream Petroleum Regulatory Company (NUPRC) “ga-emetụta ha”.

“Asim kwụọ, enwere ụdị ịkwụba aka ọ́tọ́ ahụtabeghị na NNPC. N’afọ ndị gara-aga, ọtụtụ ihe bụ nke ekpuchiri, site na DSDP nke mere ka ọ ghara ịdị mfe ịmata ego ole fọdụrụ na-akpa ego ḿbà ofesi anyị,” o kwuru.

Ayodele Oni, osoachị n’ụlọ ọrụ Bloomberg LP, kwuru na nkwekọrịta NNPC na CBN bụ nke ziri ezi iji nwe ọba ego etiti na-echekwa ego ụlọ ọba ego ọzọ nke akporo “correspondent banking”.

Ọbụgodị nà á ghọtara uche óbì inwe ụlọ akụ etiti na-ejide ego ụlọ akụ ndị ọzọ, ọ gaghị ememila ụ̀kọ́ ego ḿbà ofesi na Naijiria.

Ini gbakwunyere na gọvanọ CBN “ekwupụtala nà ọ̀tụ́tụ́ ndị sonyere na ndị azụmahịa na-achọ ego ḿbà ofesi abụghị ndị ziri ezi.”

N’ọnwa December nke afọ 2023, Mele Kyari, onye isi ụlọrụ NNPC, kwuru na ụlọrụ a akwụnyela ego ruru tari Naira anọ na ụma ijeri ise (₦4.5 trillion) n’ime akaụntụ Naijiria, site na ọnwa January ruo Ọktoba nke afọ 2023.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ọkwụ Atiku na ozighi-ezi itinye ego érètàrà na mmanụ ala n’ime ụlọ akụ CBN bụ asị.

Gọọmenti so na ndị nwe nya bụ ụlọrụ na-emeputa mmanụ, ma nwerekwa òkè pasenti iri asatọ n’uru ụlọrụ a.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.