Saturday, April 27, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ọ̀ bụ̀ sọ̀ ńdị́ òtù APC kà é búsòrò ághá nà Imo, dị́kà Uzodinma kwùrù?

Ọ̀ bụ̀ sọ̀ ńdị́ òtù APC kà é búsòrò ághá nà Imo, dị́kà Uzodinma kwùrù?
January 11
08:00 2023

Hope Uzodinma, gọvanọ Imo, sị na ọ bụ sọ̀ ndị òtù All Progressives Congress (APC) na ndị nọ ọchịchị ya ǹsó kà ndị na-eyi ọha égwù busoro agha na steeti ahụ. 

Uzodinma kwukwara na ọ bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpata enweghị nchebe na Imo.

Nya bụ gọvanọ Imo kwuru okwu a ụbọchị Thursday na Channels TV.

Advertisement

“Ụbọchị ta, na mkparịta ụka mụ na ndị ọzọ ókwú metụtara na Imo state, e mere m ka ha mara nke ómá na ndị na-akpata enweghị nchebe na Imo steeti bụ ndi ndọrọ ndọrọ ọchịchị,” ihe a bụ ihe Uzodinma kwuru.

“Íji maa atụ, na ngosị m nyere, a pụtara m nke ọma; kwuo na ndị niile e busoro agha na Imo steeti, ụlọ niile ha mụrụ ọkụ bụ nke ndị òtù APC na ndị nọ ọchịchị m ǹsó.

“I le ya anya, onweghị onye ọtú ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ ha na-ebuso agha na Imo steeti; onweghị onye ọtú ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ ha mụrụ ụlọ ha ọkụ. Nke a anọgidena na-eme.

“I kwuru màkà onye bụbu gọvanọ, Ikedi Ohakin. Ka ụbọchị atọ gara mgbe ọ kpọchara nri abalị pụrụ iche nke ndị bụ ndị isi na Imo, ọ gbara ha ume sị ka ha kwàdó gọọmenti APC. Ka ụbọchị abụọ gachara, ha busoro ya agha, ma gbuo ndị nchekwa ya.

Advertisement

“A gwago m ndị Imo okwu a. Anyị ejidego ụfọdụ ndị isi ndị na-eme mpụ a.

“A gwago m ndị nchekwa Imo steeti ka ha me ka ọha na eze mata ozugbo ozugbo, mpụta nnyocha ahụ, ma kpo aha ndị na-egbu ndị mmadụ na Imo steeti.

“Òtú m si kwuo ya ka ha ga-eme. Agaghị m eji nchekwa Imo steeti wéré mee egwuregwu ndọrọ ndọro ọchịchị.”

NCHỌPỤTA

Advertisement

N’izu gara aga, TheCable dere akụkọ gbasara usoro mbuso agha ndị oji egbe, nke metụtara ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Imo state.

Ụbọchị ole na ole gara aga, ndi oji egbe wakporo ụgbọ ala Ikedi Ohakim, onye bụbu gọvanọ Imo steeti. Nke a butere ọnwụ ndị uwe ojii anọ.

Advertisement

N’ọnwa Desemba na afọ 2022, ndi oji egbe mụnyere ọkụ n’ụlọ ikpe magistrate nke dị na Owerri LGA na ụlọ ikpe dị elu na Orlu LGA na Imo steeti.

N’ọnwa Desemba na afọ 2022, ndi oji egbe gburu Christopher Eleghu, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour party (LP) nke mpaghara Onuimo nke ụlọ ọgbakọ omebe iwu Imo steeti.

Advertisement

Na úbọchị iri na abụọ na ọnwa Desemba, ndị oji egbe buru agha na isi ụlọ ọrụ Independent National Electoral commission (INEC) na Owerri.

IKPE

Advertisement

Okwu Uzodinma kwuru na só só ndị òtù APC na ndị nọ ọchịchị ya ǹsó bụ ndị omempụ busoro agha abụghị eziokwu.

Christopher Eleghu, onye ndoro-ndoro ọchịchị Labour Party na mpaghara Onuimo, takwara afụfụ a, ma nwụọ mgbe ndị oji egbe busoro ya agha na bé nna ya na Imo.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.