Monday, April 29, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ònyònyò ébé ónyé ǹdú Zambia kwùrù nà ọ̀ gághị àzọ́ òchị́chị́ ọ̀zọ́ bụ̀ ákáọ́rụ AI

Ònyònyò ébé ónyé ǹdú Zambia kwùrù nà ọ̀ gághị àzọ́ òchị́chị́ ọ̀zọ́ bụ̀ ákáọ́rụ AI
October 17
08:36 2023

Òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị United Party for National Development (UPND) àgbághágó ihe nkiri na-akọwa nà onye isi ala Zambia bụ Hakainde Hichilema agaghị azọ ọchịchị nke ugboro abụọ ya n’afọ 2026.

N’ihe nkiri ahụ nke gazuru ebe niile, á hụrụ kà Hichilema yì ákwà suit, kwụrụ n’ihu ọkọlọtọ Zambia ikwuputa mkpebi ya nà ọ̀ gaghị àzọ́ ọchịchị na ntụli aka 2026.

“A chọrọ m ikwenye nà anyị hụrụ ihe isike n’ọchịchị m dịka onye ǹdú obodo a. Ọ́ bụ̀ n’atụghị àsị́ ọbụla kà m jì na-ekwuputa mkpebị m nà agaghị m azọ ọchịchị nke ugboro abụọ na ntulị aka 2026. Ekwenyere m nà mkpebi à bụ nke ga-abara obodo anyị
nà ọdịnihu ya uru,” bụ ihe onyonyo à kwuru.

Hichilema azọla ọ́kwá onye isi ala ugboro ise tupu o mecha merie n’afọ 2021.

Advertisement

Na Zambia, onye isi ala nwere ike ịchị afọ ise ugboro abụọ.

Site n’inyocha ihe nkiri ahụ ọfụma, mmegharị ọnụ ya, ịkwụsị mgbe kwa mgbe nke nya bụ ihe nkiri, ya na apụtachaghị ihe nke ọtụtụ ihe dị na nya bụ onyonyo mere nnọọ kà anyị mata n’ọbụ ihe nkiri ejiri ngwa ọrụ AI rụpụta.

Ihe nkiri a na-abịa n’oge mba Zambia na-enwe mkparịtụka gbasara ntulịaka obodo há nke afọ 2026.

Advertisement

Dịka na mba ndị ọzọ, n’oge ntụlị aka, a na-enwekarị ọtụtụ ihe ngosị na ozi n’abụghị eziokwu. Ozi ndị a bụ nke a na-ejikarị emegide ụfọdụ ndị mmadụ ya na uche obi ọtụtụ.

Onye secretary general òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị UPND bụ́ Batuke Imenda zigara ozi màkà nya bụ onyonyo.

Há bụ ndị nọ ọchịchị tàrà ndị nwere “njirimara ndị ohi” ụ́ta nà ha “jiri ńgwá ọrụ AI bipụta, mà na-ezisa ihe nkiri na-akọtọ onye isi ala há” iji dúhìè ndị mmadụ.

UPND dọrọ ndị mmadụ aka na ntị gbasara ihe ngosị ahụ nke ọ sị bụ “ịgosighe onye isi ala bụ Hichilema”.

Advertisement

“Anyị ghọtara obi ọkụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ kwụsị n’ebe há dị ńkwádó ime m̀pụ́ megidere onye ǹdú obodo niile họpụtara dịka onye isi ala,” ozi à gụpụtara.

“Anyị mara na ufọdu ndị ǹdú ọchịchị na-ama anyị aka nà ndị òtù há na-esonyezi n’ihe ga-akwatu onye isi ala á họputara site n’ọchịchị onye kwuo uche ya.

“Anyị ghọtara nà há na-achọ kà á hụta òtù há n’anya, mana anyị ga-achọ ichetara há ọzọkwa n’iwu ala anyị amaghị onye bụ onye.

“Ọ bụ ihe amara nke ọma na ufọdu n’ime ụnụ na-amara ụma na-esonye n’ihe adịghị mma nihu iwu ala anyị, nke ga-adọta ndị iweoji. Ọbụrụzie na ndị uwe ojii kpozie ụnụ maka ajụjụ ọnụ, ụnụ ebekarịa n’ákwá.

Advertisement

“Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị anyị chọrọ ịgwa onye ọ bụ nọ n’isi ibipụta ihe nkiri dị otu a nà ọ́ ga-akwụ ụgwọ ya mà ọbụrụ nà áká kpàrá ya.”

Onye isi obodo Zambia ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ya bụ ihe nkiri.

Advertisement

K’osiladị, ndị uweoji mba Zambia kwùrù nà há ebidola ileba anya ịmata ebe ihe ngosị ahụ sì, mà nwuchikwa onye mere nya bụ m̀pụ́.

Advertisement

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.