MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Onyonyo na-egosị ụgbọ ala dị ọcha idei mmiri bùrù ò sì nà Naịjirịa?

Onyonyo na-egosị ụgbọ ala dị ọcha idei mmiri bùrù ò sì nà Naịjirịa?
October 26
17:05 2022

Dakore Egbuson Akande, onye na-eme ihe nkiri Nollywood, tinyere onyonyo na ásáfè Instagram ya nke zikọrọ ebe idei mmiri juru na mpaghara Niger Delta na obodo Nigeria. 

Na nya bụ vidiyo akụkụ isii, nke o bipụtara na ụbọchị Sundae, e gosịrị gburugburu ébé obibi kà ọ nọ na ọnọdụ na-atụ égwù. Ótù n’ime ha zikọrọ ụgbọ ala dị ọcha nke na-agbalị ịgafe ebe idei mmiri juru.

Ótú ọ́ dị̀, nya bụ ụgbọ ala tọrọ n’ime idei, ǹké pịara ya n’akụkụ, wèré kwábàá ya n’okporo mmiri.

Onyonyo ahụ gosịkwara ebe ndị na-ekiri ọdachi a kà há na-eti mkpụ tupu nya bụ ụgbọ ala ànárìé.

Advertisement

N’okpuru mbiputa ya maka onyonyo a, Egbuson-Akande dere sị: “Ọkụ na-agba n’ugwu! Ihe dị egwu na-eme na ọtụtụ ebe na Naijiria, ma Naija Delta. Obi m na-agba ọbara maka obodo a. Kedu mgbe ndi isi anyị ga-egosi nchegbu maka ọdịmma ndị mmadụ?”

Ndị na-eso Dakore na Instagram karịrị ótù nde na narị puku anọ.

Advertisement

Foto si na onyonyo a na ndị ọzọ na-ezikọ idei na Naijiria masịrị ọtụtụ mmadụ.

TheCable nyochara ihe nkiri a. Nke a bụ ihe anyị chọpụtara.

NCHỌPỤTA

Anyị jì Labnol, ngwa orụ dijitalụ e jị achọpụta ebe foto sì ma ndị yiri ya na ịntanetị, wèré nyochaa nseta ihuenyo nke pụtara màkà onyonyo ụgbọala ọcha ahụ idei bùrù.

Advertisement

Anyị chọpụtara na onyonyo a ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ nke e kere kamgbe afọ 2017.

E ji ya wee gọsi ihe mberede idei mmiri nke na-eme na ụwa niile, gụnyere Cyclone Dineo nke okpomọkụ, otu n’ime ajọ ifufe okpomọkụ kacha egbu egbu nke mere na south-west Indian Ocean na southern hemisphere.

Otú ọ dị, nnyocha TheCable mèrè zikọrọ na e sere onyonyo ahụ na Chaman, Pakistan mgbe nnukwu mmiri ozuzo kpara obodo ahụ aka ọjọọ n’ọnwa Jenụwarị n’afọ 2017.

Na onyonyo ọzọ nke zuru ezu, ma gosikwa oge idei bùrù nya bụ ụgbọ ala, ọ pụtara na ndị na-ele anya gbara mgbọ izọpụta ụgbọ ala ahụ ma ndị nọ n’ime ya.

Advertisement

IKPE

Onyonyo pụtara maka ụgbọ ala ọcha nọ n’ime idei adịla kamgbe afọ 2017. O sì na Pakistan, ọ bụghị na Naijiria dị ka onye na-eme ihe nkiri Nollywood siri kwuo.

Advertisement

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.