Advertisement

Peter Obi tùlèrè bọ́jetị̀, ọ́nọ́dụ̀ ị́dà ógbènyè nke Naijiria nà China. Ókwú ya ọ̀ bụ̀ ézí?

Peter Obi Peter Obi

Ọ́gbákọ̀ nke afọ iri abụọ na asatọ nke United Nations Climate Change Conference, nke ámàrà dịka COP28, bidoro nà Dubai, United Arab Emirates (UAE) n’ubọchị iri atọ nke ọnwa Novemba.

Ọgbakọ à nà-èmé ná afọ ọbụla, mà bụrụ nke ụwa niile jì ekpebi n’okwu gbasara íhú ígwe. Ó fọrọ obere kà ḿbà ụwa niile sònyé nà nya bụ ọgbakọ dịka ndị òtù.

Ọ́ bụ̀ ebe mkpebi màkà òtú á gà-èsí mezie nsogbu ajọ ihu ígwe na-ebute dịka ibelata okpomọkụ ụwa ruo 1.5°C. Á na-ekpebikwa ótú ùwà ga-esi kwàdó obodo ndị nsogbu ajọ ihu ígwe metụtara. COP nà-emetụtakwa ibelata mmepụta izu ọjọọ na-emebi ígwe ya na itinye ego n’ịkwàdó imezi íhú ígwe.

Ọnụ ọgụgụ ndị nnọchianya dị́ puku iri asatọ n’ótù na iri abụo n’asaa (81,027) bụ ndị bịara ọgbakọ COP28, nke gụnyere ndị ǹdú ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ndù azụmahịa, ndị nnyocha ihu ígwe, nà ndị ọnụ na-eru n’okwu ndị ọ̀zọ́.

ADVERTISEMENT
Advertisement

Naijiria, nke n’òtù nzukọ COP28, nwere ndị nnochite anya nke onye isi àlà Bola Tinubu dù gá nya bụ ọgbakọ.

K’osiladị, enwela nkọcha nye ọnụ ọgụgụ mmadụ gárá ịnochite anya Naijiria n’ọgbakọ áhù.

N’ọtụtụ mbipụta Peter Obi, onye jiri Labour Party (LP) zọ́ ọkwa onye isi ala nà ntuliaka afọ 2023, dèrè, ọ́ kọrọ ọnụ ọgụgụ ndị nnọchite anya gárá nya bụ ọgbakọ ọnụ. Obi kpọrọ ya “íméfù akụ n’ụba”.

Advertisement

Obi, kà ọ́ na-atụnye ọnụ n’okwu a, bipụtara ọtụtụ ihe ná asafe X ya.

TheCable bịara tụlee okwu ónyé ndọrọ ndọrọ ọchịchị a.

ÓKWÚ M̀BỤ́: Ọ́NỤ́ Ọ̀GỤ́GỤ́ ŃDỊ́ ŃNỌ̀CHÍ ÁNYÁ NAIJIRIA BỤ̀ ÓTÙ ÍHE DỊ́KÀ ǸKÈ CHINA

Mkpebi: Eziokwu

Advertisement

N’ózí Obi bipụtara, o ” kelere” Nijiria màkà inwe ótù ọnụ ọgụgụ ndị nnọchị anya dịka China n’ọgbakọ COP28.

“N’ihe dịka ọ gbagwojuru anya nke ọjọọ, kà m kèléé Naijiria maka ísòrò nzọụkwụ obodo úkwú dịka China n’inwe ọnụ ọgụgụ ndị nnochịte anya kacha ri nne nà nzukọ ụwa na-eme na Dubai, UAE,” Obi kwuru.

Ndekọ ndị nnọchite gosịrị na ndị nnọchite anya Naijiria na COP28 gbakọtara ọnụ ọgụgụ ótù pụku nà narị anọ n’iri n’otu. (1,411), ótù ihe dịka nke ndị China.

Yá mere, Naijiria nà China nwèrè ọnọdụ nke atọ n’ọnụ ọgụgụ obodo nwekarịchara ndị nnọchite anya.

Advertisement

UAE, ébé á nọ eme nya bụ ọgbakọ nwetakarịchara ọnụ ọgụgụ ndị nnọchi anya dị puku anọ nà narị anọ n’itoolu, osote Brazil nke nwere puku atọ na iri asatọ n’otu.

ÓKWÚ ÀBỤ̀Ọ́: Bọjetị China nke afọ 2024 bụ ihe dịka ijeri dollar anọ

Advertisement

Mkpebi: Obụchaghị eziokwu

Ịrụ aka n’ọnụ ọgụgụ ndị nnọchi anya bụ̀ mmefu n’ime obere ego Naijiria nwere ụgbua, Obi kwùrù nà bọjetị Naijiria bụ íhé dịka nde dollar iri atọ n’atọ, adịghị kà nke China, ndị nke ha bụ tarị dollar anọ.

Advertisement

“Bọjetị China màkà 2024 bụ tarị dollar anọ, nke pụtara puku abụọ nà narị asatọ na iri isii màkà ótù nwa onye,” Obi kwuru.

China na-ekwụputa bọjetị há mgbe há na-eme ọgbakọ afọ ndị ụlọ omeiwu, nke bekee na-akpọ parliamentary session.

Advertisement

Bọjetị afọ 2023 bụ nke ha kwupụtara n’ọnwa March, nke pụtara nà China enwebeghị Bọjetị nke afọ 2024.

Maka Bọjetị́ afọ 2023, China tụ̀rụ̀ ányá inweta égó ruru RMB tarị iri abụọ n’atọ n’ụma ijeri isii (nke gbakọtara tarị dollar atọ n’ụma anọ) mà débé ego màkà ḿméfù nà RMB tarị iri abụọ n’asaa n’ụma ndè ịse (nke gbakọtara tarị dollar anọ). Ó jiri RMB tarị atọ n’ụma nde itoolu (ijeri dollar narị ise n’iri isii n’anọ n’ụma otu puku) gbaa m̀pé.

K’osiladị, Obi kwuru eziokwu maka bọjetị Naijiria nke dị tarị dollar iri atọ n’atọ. Ónyé isi àlà Bola Tinubu ekwupụtala bọjetị tarị Naira iri abụọ n’asaa n’ụma ijeri ise (₦27.5 trillion) maka afọ 2024. Nke à pụtara ijeri dollar iri atọ n’isii ($36 billion) n’atụmanya ọnụ mgbanwe ego bọjetị narị Naira asaa n’iri ise màkà ótù dollar (₦750/$), maọbụ ijeri dollar iri atọ n’atọ n’ụma nde ise ($33.5 billion) n’ọnụ mgbanwe ego narị Naira asatọ na iri abụọ màkà ótù dollar (₦820/$) n’ụbọchị iri abụọ nà n’itoolu nke onwa Novemba.

ÓKWÚ ATỌ: Ọnụ ọgụgụ ọnọdụ ndụ ndị mmadụ nà China bụ̀ iri asaa n’itoolu n’ime otu narị n’iri itoolu n’otu (79/191) ébé nke Naijiria bụ otu narị na ịrị itoolu n’otu (163/191)

Mkpebi: Eziokwu

“China nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ ndị ndụ há dị̀ mma akpọrọ High Human Development Index (HDI) nke ruru iri asaa n’itoolu n’ime obodo otu narị n’iri itoolu n’otu, ebe Nijiria nọ n’ógó otu narị n’iri isii n’atọ n’ime òbòdò otu narị n’iri itoolu n’otu,” Obi kwuru.

Òtù United Nation kọwara nkwalite ndụ mmadụ bụ “human development” dịka ị́nwàlè akụ n’ụ̀bá mmadụ, ya bụ ịkwalite ndụ karịa ichekwube nà òtító akụ n’ụba obodo gà-emetuta ndụ ndị mmadụ. Ọ na eleba anya na mmadụ, òhèrè dịrị ha, ya nà ihe há chọrọ.

Ótù n’ime ihe mere ńgụ́kọ́ a jiri dị mkpa bụ kà ó gosị na atụmatụ ego dịka nkwanye nrụpụta ihe n’obodo ahụ bụ Gross Demestic Product abụchaghị ụ́zọ̀ e sì akwalite ndụ ndị mmadụ.

N’ọnụ ọgụgụ émèrè na nso-nso a, China nọ n’ọnụ ọgụgụ iri asaa n’itoolu n’ime obodo otu narị n’iri itoolu n’otu, ebe Naijiria nọ n’otu narị n’iri isii n’atọ.

Switzerland bụ ndị mbụ ebe South Sudan bụ ndị ikpazụ.

ÓKWÚ ÀNỌ́: Naijiria nwèrè ọtụtụ ndị dara óké ogbenye karịa China

Mkpebi: Eziokwu

“Naijiria nwere ọtụtụ ndị mmadụ bi n’oke ubiam karịa China, n’agbanyeghị nà á ga-enwete ọnụ ọgụgụ mmadụ Naijiria nwere ugboro asaa n’ime nke China nwèrè,” Obi gbakwunyere.

Óké ubiam maọbụ ida óké ogbenye gụnyere enweghị ahụike, enweghị ézí agum’akwukwọ, ajọ ọnọdụ ndụ, ibi n’ógbè n’adịghị ndụ mma, dịka ngalaba na-ahụ maka nkwalite ézí ndụ bụ Oxford Porverty Human Development Initiative kwùrù.

Ózí ndekọ UN bipụtara nso-nso a kwụrụ nà pasentị atọ n’ụma itoolu (29%) nke ndị obodo China bi nà óké ubiam, ebe nke Naijiria nọ nà pasentị iri atọ n’atọ (33%).

Ágbàdòrò ọnụ ọgụgụ à ná mbipụta ozi ọhụrụ nke ngalaba áhù bipụtara n’afọ 2021.

Ọnụ Ọgụgụ nke sitere nà World Bank sị n’ọnụ ọgụgụ China nọ n’otu ijeri nà ụma nde anọ (1.4 billion), ebe nke Naijiria nọ nà nde iri abụọ na iri n’asato (218 million).

Dịka UN kwùrù, China nwèrè ndị bi n’oke ubiam rúrú nde iri ise n’anọ n’ụma puku isii, ébé Naijiria nwere nde iri asaa n’otu n’ụma puku itoolu.

N’ọnwa Novemba nke afọ 2022, ụlọrụ ndekọ ọnụ ọgụgụ nà Naijiria bụ National Bureau of Statistics (NBS) kwùrù na otu narị na iri atọ n’atọ ndị Naijiria nke pụtara (pasentị ịrị isii n’atọ) bu ndị bi n’oke ubiam.

Ńgàlàbá abụọ à kwàdòrò okwu Obi n’ọtụtụ ndị mmadụ bì n’oke ubiam nà Naijiria karịa nà China, n’agbanyeghị ọnụ ọgụgụ mmadụ obodo China nwèrè.

Add a comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: Content is protected from copying.