Saturday, April 27, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Yahaya Bello ò sò ńdị́ gọ́vanọ̀ gá ọ́gbákọ̀ Tinubu kpọ̀rọ̀?

Yahaya Bello ò sò ńdị́ gọ́vanọ̀ gá ọ́gbákọ̀ Tinubu kpọ̀rọ̀?
February 21
01:16 2024

Ọ̀tụ́tụ́ mmadụ na soshal midia ekwuola na Yahaya Bello, onye bụburu gọvanọ steeti Kogi, gara ọgbakọ mgberede onye isiala Bola Tinubu kpọrọ ndị gọvanọ na council chambers nke Abuja n’ụbọchị Thursday.

N’ọgbakọ ahụ, Tinubu na ndị gọvanọ kwekọrịtara na ọ dị mkpa íwè ọtụtụ ndị Nigeria n’ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, iji kwalite nchekwa Naijiria.

Ka ọgbakọ a bịara na njedebe, ótù onye na X (nke a na-akpọ Twitter na mbụ) bipụtara ihe nkiri gosiri ebe Bello na ndị gọvanọ ndị ọ̀zọ́ kwụ̀ n’ogige presidential villa.

“Yahaya Bello ka na-eje ọgbakọ FEC, n’agbaghaghị nà ọ ritugo n’ọchịchị dịka gọvanọ Kogi,” mbipụta a kwụrụ.

Advertisement

Ndị ọzọ na X kwuru na Bello ka na-eje ọgbakọ ndị gọvanọ nọ n’ọchịchị kwesịrị ije, n’agbanyeghị na o nyela onye ọzọ ọchịchị na Januwari.

Mbipụta à agala n’ihu nweta puku kwurupuku nkwenye, nkesa, na ntụnye ọnụ.

N’ime ihe ngosị ahụ, Bello ka ahụrụ kà ọ́ kwụ̀ n’etiti Hope Uzodinma, gọvanọ Imo steeti, na Babajide Sanwo-Olu nke Lagos steeti, ebe Tinubu nọ n’etiti dịka ndị gọvanọ ndị ọzọ gbara ya okirikiri.

Mana Bello ọ̀ gara nya bụ ọgbakọ?

Advertisement

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ

Bello bụ gọvanọ steeti Kogi n’okpuru ótù ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressive Congress (APC), site n’afọ 2016 ruo 2024. O nyefere Usman Ododo ọchịchị n’ụbọchị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Januwari.

Advertisement

Dịka onye bụburu gọvanọ, Bello enweghị ike inọchite anya Kogi n’ọgbakọ ndị gọvanọ na Tinubu. Kama, ọ bụ onye isi ododo maọbụ osote ya kwesịrị ije nya bụ ọgbakọ.

Nnyocha TheCable mere gosịrị na ihe ngosị ahụ á na-ekesa na soshal midia bụ nke ebiputara na asafe onye ịsịala n’ọba ozi X. Ihe ngosị ahụ bụ nke esonyere nchịkọta ọgbakọ ahụ ha nwere.

Inyomi anya ọfụma gosiri na ihe ngosị ahụ bụ nke e sere na ọgbakọ mbụ Tinubu na ndị gọvanọ nwere ka ọ́ bara n’ọchịchị dịka ọnye isiala. Bello ka bụ gọvanọ nke steeti a dị na north central oge ahụ.

Nyocha TheCable mere gosiri na ihe hgosi a putara kamgbe onwa June 2023.

Ọzọkwa, akwa nke ndị ndú ahụ yi n’ihe ngosị ahụ dị iche na nke há yì n’ihe ngosị nke ọgbakọ ụbọchị Thursday.

Ọchịchị ala Naijiria abịala wepụ ihe ngosị ahụ nke ọgbakọ ochie n’asafe X ha, tinyezie ihe ngosị nke ọgbakọ Thursday

Ododo gara nya bụ ọgbakọ, onye nke esetere n’ihe ngosị a.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

N’agbanyeghị na asafe onye isiala so tinye ọgbaghara a, okwu na Bello gara ọgbakọ nke Tinubu na ndị gọvanọ nwere n’ogige presidential villa n’ụbọchị Thursday bụ àsị́.

Lee ihe ngosị nke e sere n’ọgbakọ ahụ.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.