Saturday, April 27, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ḿmánụ́ ụ́gbọ́àlà ọ̀ kàchàsị̀rì dị́ ọ́nụ́-àlà nà Naijiria, dị́kà Eniola Badmus kwùrù?

Ḿmánụ́ ụ́gbọ́àlà ọ̀ kàchàsị̀rì dị́ ọ́nụ́-àlà nà Naijiria, dị́kà Eniola Badmus kwùrù?
July 30
14:50 2023

Eniola Badmus, onye ejije Nollywood, kwùrù sị na ọnụ ego mmanụ ụgbọala kachasịrị dị́ ọnụ-ala na Naijiria, n’agbanyeghị nkwụsị ego enyemaka, ǹkè ndị bekee na-akpo “fuel subsidy”.

Nya bụ onye na-eme ihe nkiri, ma bụrụkwa onye ńkwàdó á mà àmá nke Bola Ahmed Tinubu, onyeisi ala Naijiria, tụnyere ọnụ n’okwụ mgbe onye nta akụkọ bụ Daddy Freeze nwèrè mkparitụka na Instagram.

Badmus kwuru na ọtụtụ ndị na-akọtọ ọchịchị Tinubu amaghị úrù nkwụsị nya bụ ego enyemaka subsidi maka mmanụ ụgbọala bàrà.

Ọ kwùrù sị: ‘’Dika nwa afọ Naijiria,  Enwere m ike ịnwe uche óbì nkem. Enwekwaram ike ịkwado onye ọbụla m chọrọ.

Advertisement

“Ọtụtụ ndị a ji usoro mgbasa ozi ịntanetị dị iche iche wèré akọtọsị ọchịchị Tinubu amaghị ihe ọbụla gbasara subsidi.

“Ọ bụ mgbe e wepụrụ ya bụ subsidi kà ụfọdụ ndị mmadụ matara ịhe gọọmenti na-eme. Ruo ugbu a, anyị na-àzụ́ mmanụ n’ọnụ dikarịchara ọnụ-ala.”

ŃKWỤ́SỊ́ SUBSIDI MÀKÀ ḾMÁNÚ Ụ́GBỌ́ÀLÀ

Advertisement

N’ụbọchị  ịrị na itoolu nke ọnwa May, onyeisi ala Bola Tinubu, ka ọ na-enye ozị mbụ ya dịka onye ịsị ọchịchị, kwùrù na mgbe gọọmenti na-akwụ ụgwọ subsidi maka mmanụ ụgbọala agaala.

O kwuru sị: ‘’Ọ bụ ihe nwute na bọjetị nke dị tupu m bata dịka onye ịsị ala eweputaghị ego maka subsidi. Nke a pụtara na oge ịkwụnye ego enyemaka bụ subsidi agaala.”

Tinubu gara n’ihu gbakwụnye na ego e jì ágbàchí subsidi bịara na arịzi elu nke ukwu, nke na ọ naghịzi arụ  ọrụ ejị webata ya.

“Anyi na-ekele gọọmenti na-apụ apu màkà mkpebi ha nwere n’iwepu subsidi dị na mmanụ ụgbọala, nke bịara dịka ọ kachasịrị menyere ndị ọgaranya karịa ndị  ogbenye.

Advertisement

“Kámà, ihe anyị ga-eme bụ̀ iwere nya bụ ego susidi mmanụ tinye ya n’ọtụtụ  atụmatụ màkà mmepe obodo dịka agụmakwukwọ, ahụike, ya na ịrọputa ọrụ nke ga ákwàlíté ndụ ọtụtụ mmadụ.”

Nwantinti oge kà Tinubu kwụchara ịhe ndị a, ọnụ ego mmanụ ụgbọala bịara sí na ótù narị Naira na iri itoolu kwa lita ruo ịhe karịrị narị Naira ise kwa ótù lita.

N’ụbọchị iri n’asatọ nke ọnwa Julaị, ndị na-ere mmanụ esibeghị esi, nke ndị bekee na-akpọ “crude oil”, welịri ọnụ ego ha na-ere mmanụ ụgbọala ọzọkwa ruo narị Naira isii na iri n’asaa kwa lita na Abuja. Na Lagos, o ruru narị Naira ise na iri isii na asatọ kwa lita.

Fuel a na-ere na Naijiria ọ̀ dịkarịchara ọnụ ala? TheCable nyochara ọnụ ego a na-ere mmanụ n’ụwa niile. Ihe ndị a kà anyị chọpụtara.

Advertisement

ŃNYÒCHÁ Ọ́NỤ́ ÉGÓ ḾMÁNỤ N’Ụ̀WÀ NÍÍLE

Globalpetrolprices bụ̀ ndị ǹdú ahịa á màrà màkà ilenye ányá n’ọnụ ego mmanụ ụgbọala , nke ọkụ eletrik, yana nke natural gas n’obodo karịrị ótù narị na iri ise. Ha kwùrù na ọnụ ego a na-ere mmanụ ụgbọala na Venezuela bụ Naira atọ n’uma ótù puku, nari abụọ n’iri asaa n’anọ kwa lita. Ọnụ ego a, dịka ha kwùrù, bụ nke dịkarịchara ọnụ ala n’ụwa niile.

Advertisement

TheCable nyomikwuru anya ma chọpụta na, ewepu Venezuela, a na-ere mmanụ ihe n’erughị narị Naira isii na iri na asaa n’obodo iri  abụọ.

Obodo ndị ahụ gụnyere Iran, Libya, Algeria, Kuwait, Angola, Egypt, Turkmenistan, Malaysia, Kazakhstan, Bahrain, Bolivia, Iraq, Qatar, Azerbaijan, Russia, Oman, Saudi Arabia, Ecuador, Kyrgyzstan, ya na Afghanistan.

Advertisement
NỌMBA OBODO ỌNỤ EGO NA DỌRLA NKE ỤBỌCHỊ IRI N’ABUO NKE ỌNWA JULAỊ MGBAKỌ EGO CBN NKE ỤBỌCHỊ ỊRỊ N’ANO NKE ỌNWA JULAỊ ỌNỤ EGO NA NAIRA
1. Venezuela 0.004 781.85 3.1274
2. Iran 0.029 781.85 22.67365
3. Libya 0.031  781.85 24.23735
4. Algeria* 0.34 781.85 265.829
5. Kuwait* 0.342 781.85 267.3927
6. Angola 0.364  781.85 284.5934
7. Egypt* 0.372 781.85 290.8482
8. Turkmenistan 0.429 781.85 335.41365
9. Malaysia* 0.448 781.85 350.2688
10. Kazakhstan 0.488  781.85 381.5428
11. Bahrain 0.531  781.85 415.16235
12. Bolivia* 0.542  781.85 423.7627
13. Iraq 0.573  781.85 448.00005
14. Qatar* 0.577  781.85 451.12745
15. Azerbaijan 0.588  781.85 459.7278
16. Russia* 0.589 781.85 460.50965
17. Oman* 0.621 781.85 485.52885
18. Saudi Arabia* 0.621 781.85 485.52885
19. Ecuador* 0.634 781.85 495.6929
20. Kyrgyzstan* 0.741 781.85 579.35085
21. Afghanistan 0.743 781.85 580.91455
22. Nigeria 0.778 781.85 608.2793
23. UAE* 0.787 781.85 615.31595
24. Tunisia 0.832 781.85 650.4992
25. Bhutan 0.845 781.85 660.66325
26. Lebanon* 0.863 781.85 674.73655
27. Indonesia* 0.864 781.85 675.5184
28. Colombia* 0.867 781.85 677.86395
29. Pakistan* 0.878 781.85 686.4643
30. Argentina* 0.924 781.85 722.4294
31. Belarus* 0.935 781.85 731.02975

Mara amara na obodo iri na itoolu n’ime iri abụọ na-ere mmanụ ihe n’erughị narị Naira ise na iri isii na asatọ màkà ótù litre, nke  bụ ọnụ ego mmanụ dịkarịchara ọnụ nà Naijiria taata.

NCHỊKỌTA

Advertisement

Okwu ahụ onye na-eme ihe nkịri bụ Eniola Badmus kwùrù, na mmanụ ụgbọala a na-ere na Naijiria dịkrichara onu ala n’uwa niile, abụghị eziokwu.

K’ọdi ugbu a, obodo iri na itolu n’ụwa niile na-ere mmanụ ụgbọala ihe n’erughị narị Naira ise na iri isii n’asatọ ana-ere na Lagos.

Ngbakọ ego anyị jiri kọọ akụkọ a bụ $1 = 781.85, dika ụlọ ọba ego ala anyị bụ Central Bank of Nigeria (CBN) kwupụtara n’ụbọchị iri na anọ nke afọ 2022, mgbe onye omee ihe ejije a kwụrụ okwu ya.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.