Saturday, May 4, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ḿbà, ọ́kụ́ na-agba n’ọhịa Canada ábụghị ǹkè ḿmádụ̀ mà-ụ̀má mụ̀nyé

Ḿbà, ọ́kụ́ na-agba n’ọhịa Canada ábụghị ǹkè ḿmádụ̀ mà-ụ̀má mụ̀nyé
August 05
14:55 2023

Kemgbe ọ́kụ́ na-agba n’ọhịa obodo Canada bidoro na mmalite afọ a, ọtụtụ okwu ụgha àgbásàla gbàsárá ya, n’ọba ozi ịntanetị dị iche iche.

“Ọ bụ aghụghọ há kpàrà àkpá,” nke à bụ ihe ótù n’ime ozi ndị a dèpụtara nà Instagram. Nya bụ ókwú e dèrè n’ọnwa June nwere mmadụ puku iri na asatọ nà narị iri asatọ kwéré nà ya.

Ihe ngosị ọzọ n’ọba ozi Instagram na-akọwakwa n’ọkụ ọhịa a bụ̀ nkata ọjọọ a kpàrà àkpá.

N’ihe nkiri à na-efàghárị́, ị ga-anụ ólú ndị na-ele onyonyo. N’ime ihe nkiri a, a hụrụ ébé ụgbọelu helikopta na-agbanye ọkụ n’osi ọhịa.

Advertisement

Ótù onye na-ele onyonyo a kwùrù sị: “Ótú ahụ kà há sìrì bido ọkụ ahụ. Há mà ụ̀má me ya.”

‘’Ihe nkiri na-egosị kà ụgbọelu helikopta sì n’elu atụ ọ́kụ n’osisi dị n’obodo Canada,” nke a bụ ihe ozị ọzọ na soshal midia kwùrù.

Ọ́KỤ́ NA-AGBA Ọ́HỊ́A ǸKÈ CANADA ÁHỤTỤ̀BÈGHỊ̀ M̀BỤ́

Advertisement

Sịte na mbido afọ 2023, enwela ọtụtụ ọkụ na-agba n’ọhia ná mba Canada, nke aṅụrụ ya na-erute ọtụtụ akụkụ mba US.

N’ọnwa June, Canada enwela ndekọ ọnụ ọgụgụ ọkụ na-agba n’ọhia nke ruru narị anọ. Ọtụtụ n’ime ha na-agba ótù m̀gbè. Ihe ruru ọkara n’ime ha enweghị njikwata.

Ihe mberede à achụpụla ọnụ ọgụgụ mmadụ karịrị ọtụ puku n’ụlọ ha na Canada, ma mekwa kà obodo a kwụsịtụ imepụta mmanụ ụgbọala na gas.

N’ụbọchị Thursday, n’abalị asaa nke ọnwa Juli, ndị ma ihe ekwe na-ekwu kwuru na mberede ọkụ a na-agba ọhịa bịara mee ka e nwee ọnụ ọgụgụ ala gbara ọkụ ahụtụbeghị mbụ, tinyere ego e jiri menyụọ ya bụ ọkụ, ya na ọnụ ọgụgụ mmadụ ọkụ a chụpụrụ n’ụlọ ha ana enwetụbeghị mbụ.

Advertisement

Mànà ọkụ a ọ̀bụ̀ ihe mmadụ mụnyere?

TheCable nyochara ihe onyonyo na-efegharị, ma chọpụta njirimara ụlọrụ British Columbia Wildfire Service n’okpuru ya.

Ńyómì anya mèrè kà anyị chọpụta ihe ònyònyò mbụ e bipụtara n’ọba ozi YouTube nke isi okwu ya bụ: “Ọkụ n’agba n’ọhia Donnie Creek – ozị gbasara nkwado atumatụ iji ọkụ emenyụ ọkụ nke abalị abụọ nke ọnwa June 2023”.

Ị́HÉ ÒNYÒNYÒ NÀ-ÈGÓSỊ́ ÁTỤ̀MÀTỤ̀ ÍJI Ọ́KỤ́ ÈMÉNYỤ́ Ọ́KỤ ǸKÉ GA-ÀKWỤ́SỊ́ ÓKÉ Ọ́KỤ Ị́GBA Ọ́HỊ́A

Advertisement

Dịka ị hụrụ n’ihe onyonyo YouYube ahụ, ịji ọkụ emenyụ ọkụ nke ndị ngalaba British Columbia Wildfire sònyèrè nà yá bụ ótù n’ime uzọ ha sì ebelata ọkụ na-agba ọhịa.

Ihe ngosị ebe ụgbọelu helikopta na-atụ ọkụ n’elu osịsị abụghị ịhe ngosị nà ọkụ m̀bụ́ ahụ bụ ihe mmadụ màrà ụ̀má mụnye.

Advertisement

Kama, ịhe ngosị ahụ bụ atụmatụ iji beleta ọkụ ọgbụgba, nke emere n’ọnwa June n’obodo Donnie Creek.

Atụmatụ iji ọkụ emenyụ ọkụ bụ ótù n’ime ụzọ dị mkpa e sì emenyụ ọkụ n’ọhia. N’ụzọ a, ndị omenyụ ọkụ ga-esite n’ísí-ísí wèé kwụsị ya bụ ọkụ. Nke à pụtara na há ga-eji ọkụ nke há wèré kapụta òké àlà ébé há chọrọ kà nya bụ ọkụ mbụ kwụsị.

Advertisement

Ndị na-emenyụ ọkụ na-eji ụzọ à ebelata nfesa ọkụọgbụgba. Usoro a pụtara nà há ga-ewepu ihe ọbụla gá-ényé nya bụ ọkụ íké.

Advertisement

Ihe nkiri a dị n’ọba ozi YouTube ndị British Columbia Wildfire Service, gosịrị ebe ndị ọkachamara n’ịhe gbasara imenyụ ọkụ ọgbụgba kọwara òtú iji ọkụ emenyụ ọkụ sì enye aka “ịbeleta ọkụ ọgbụgba sịte n’ịwepu ihe ọbụla gá-ényé nya bụ ọkụ ike’’.

Ọ nà-abụkarị nà okirikiri ọkụ ọgbụgba ọbụla. Ijiri nwayọ gbanye ọkụ n’okirikiri ọkụ mbụ ahụ na-enye aka ịgbatị okirikiri ọkụ ọgbụgba, n’ihi n’ótù ébe adịghị àgbá ọkụ ùgbòrò abụọ.

Ótú à, ndị omenyụ ọkụ nwere ike ịrụ ọrụ ha n’ụzọ dị m̀fé.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe nkiri ahụ nke sịtere na Instagram abụghị eziokwu. Ọ naghị egosị n’ụzọ ọbụla na ọkụ na-agba n’ọhia Canada bụ nke mmadụ màrà ụma mùnyé. Kama, ọ na-egosị atụmatụ iji ọkụ emenyụ ọkụ nke ngalaba na-ahụ màkà imenyụ ọkụ bụ́ British Columbia Wildfire Service jì alụso ọkụ na-agba ọhịa agha

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.