Saturday, April 27, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

APC ònwètàrà ḿmérí íkpe ná-ńtùlị́áka níile émèrè màkà ị́zọ ọ́kwá gọ́vanọ̀

APC ònwètàrà ḿmérí íkpe ná-ńtùlị́áka níile émèrè màkà ị́zọ ọ́kwá gọ́vanọ̀
December 08
13:11 2023

Ọ̀tụ́tụ́ mmadụ n’ọ́bá ozi soshal midia tụnyere ọnụ n’okwu ọha, sị na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị All progressive Congress (APC) mèrìrì na steeti niile ébé há tụ̀rụ̀ íkpé gbasara ọzịzọ ọkwa gọvanọ.

Dịka emechara ntụlịaka n’ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa March, ọ̀tụ́tụ́ mmadụ ndị mpụta nya bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị amasịghị wepụrụ ókwú n’úlọ̀ ikpe, nke á na-akpọ election tribunal.

Ọbuladị kà óbì lọ̀rọ̀ ụfọdụ mmiri n’ụzọ ịchọta ịkpe nkwụmọtọ, mànà ọtụtụ enwetala mmeri n’otu ụ́zọ̀ áhụ̀.

Mànà dị́kà ịkpe ndị a, jì ịke n’ábàtá ọtụtụ ndị Nigeria na soshal mịdia ébólá APC maka ịkwanye ọ́ká ị́kpé ndị a maka ikpela ịkpe ndị a n’ị́hú ha.

Advertisement

“APC jì ụlọikpe émérị́ ebe niile. O nweghị ótù mkpụrụ ùgwù dị́zí n’ulo ịkpe dị nà Naijiria,” @Edozietech1, ónyé jiri X zipu ozi, bipụtara n’ụbọchị iri n’itoolu nke ọnwa Novemba.

“Ndị gara akwụkwọ erela ùgwù há n’ọ́nú ala nye ndị mgbochi agam n’ihu. Chineke gbatara anyị ọsọ enyem aka,” @Gyranyajnr, onye ọzọ jikwa X ezịpu ọzị dere si: ”Ọ́nà-átọ́ ọchị̀…n’ime steeti niile, APC n’emeri n’ikpe niile. APC bụ̀ ha tinyere anyi n’ọnọdụ ọjọọ a anyị nọ n’ime ya, bụ nke atunyere na ntùlịáka 2023. Hmm, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Naijiria bu nnọọ ihe ejije…”

Ọzọkwa na X, @SirChely kwuru sị na APC meriri ntùlịáka síté “na inwogharị ihe ndị eji atụ-votu, ya na ị́zú votu, na-imado ụlọrụ maka ntụli aka elu na Naịjiria bu Independent National Electoral commission (INEC), ya na “ị́zú ndi lọ́yà na ọka ịkpe.”

Advertisement

“Onweghị ụ́zọ̀ ịga-n’ihu, ọbụrụ n’anyị enweghị ụlọikpe ị́kpé nkwu m’ọ́tọ́, o nweghị òlìlé ányá dị́, ọbụrụ n’anyi enweghị usoro ndọrọ ndọrọ kwụrụ onwe ya, n’enweghị nrúrù aka n’ime ya,” ọ gbakwunyere.

Ịchọpụta ma okwu a ọ bụ eziokwu, TheCable bịara nyocha ikpe niile na steeti ebe anwalere nsòn’ázụ́ ntùlịáka elu ọkwa gọvanọ.

LAGOS (APC)

N’ubọchị ịrị nke ọnwa Nọvemba, ụlọikpe appeal nà Lagos wezugara mkpésá nke Abdulazeez ‘Jador’ Adediran, onye jiri partị People’s Democratic Party(PDP) zọ́ ọkwa ọchịchị gọvanọ, nke megidere mmeri Babajide Sanwo-Olu.

Advertisement

Ụlọ ikpe tribunal nke Lagos dị̀ mbụ́ wezụga mkpésá Adediran, n’ubochi ịrị abụọ na ise, nke méré Adediran jìrì wegazie ya bu mkpesa n’ụlọikpe appeal.

ENUGU (PDP)

N’ubọchị iri nke ọnwa Nọvemba, ụlọikpe appeal kwàdòrò mmeri onye jí partị PDP bu Peter Mbah zọ́ ọkwa gọvanọ, dika gọvanọ Enugu steeti.

Nzukọ panel a , kwụrụ na Labour Party(LP) na onye jírí LP dọ ọkwa gọvanọ na ntuli aka ahu, enweghị ị́ké ịkọwa òtù Mbah sịrị hapụ ịtozụ ókè ịzọ ọ́kwá ya bu gọvanọ na-steeti ahu.

Advertisement

BENUE (APC)

Mmeri Hyacinth Alia, gọvanọ Benue bu nke ụlọikpe appeal nabatara n’Abuja, n’ubochi ịrị n’abuo nke ọnwa Novemba.

Advertisement

Kà INEC kwuputachara mmeri onye jí partị APC zọ́ ọkwa gọvanọ na-steeti a, Titus Uba, onye jí PDP zọ́ ọkwa gọvanọ na stéétị̀ ahu, wegara mkpesa nke na-ámà mmeri Alia, mana onwetghi mmeri ọbụla n’uloikpe tribunal n’onwa September.

Ụlọikpe appel gara n’ihu kwado mmeri Alia, ma kwụọ sị́ na Uba enweghị ike ikwado ebubo ya na òsò-áchị́ gọvanọ Alia gosiri akwụkwọ ikikere isonye na-ntuliaka elu nke n’ezighi ezi.

Advertisement

KEBBI (APC)

N’ubochi ịse nke ọnwa ọktọba, uloịkpe tribunal diị́ na Kebbi steeti kwadoro mmeri Nasir Idris nke APC, dịka onye mmeri ọkwa gọvanọ steeti ahụ.

Advertisement

Ụlọ ịkpe tribunal wezụgara mkpesa PDP na Aminu Bande, onye zọ́rọ́ ọkwa gọvanọ, ma kwuo sị na mkpesa ahụ enweghị ikike ịkwado mkpesa ha.

NASARAWA (APC)

Ụlọ ịkpe appeal n’ubochi Thursday n’Abuja kwadoro ntụli aka Abdullahi Sule dịka gọvanọ Nasarawa steeti.

N’ubochi abụọ nke ọnwa ọktọba, ụlọikpe tribunal dị na Lafia kagburu mmeri Sule ma kwupụta David Ombugadu nke PDP dịka onye mmeri na ntuli aka ahụ.

Ná nkwuputa ikpe ahu, Uchechukwu Onuemenam, onye guputara ịkpe a, sịrị na ihe akaebe egosiri na ulọikpe ahu gosiri na nya bụ ụlọ ikpe dabere n’akaebe ịwụ kwadoro ị́jí kwuputa Ombugadu dika onye mmeri.

PLATEAU (APC)

N’ubochi ịrị na itoolu nke ọnwa Novemba, uloikpe appeal n’Abuja chuturu Caleb Mutfwang nke APC n’okwa govano Platau steeti.

N’agbanyeghị na INEC kwuputara Mutfwang dịka onye mmeri na-ntuliaka elu, nwetara votụ pụku narị ise na ịrị abụọ na ise na narị abụọ na ịrị itolu n’itolu, ebe Nentawe Yilwatda nke APC nwetara votụ pụku narị anọ na ịrị asaato n’otu na nari atọ na ịrị asaa nwalere mpụta ntuli aka ahụ na ụlọ ikpe tribunal.

K’osiladi mkpesa ya, bu nke ụlọikpe ahụ wezugara n’ihi na onweghi ikike inwale mmeri Mutfwang.

N’anabataghiị ịkpe tribunal kpere, APC n’onye jị́ patị ha azọ ọkwa gọvanọ gawara ụlọikpe appeal, nke mere ụlọikpe appeal jiri nye ịwụ ka INEC napụ akwụkwọ ikịkere enyeburu Mutfwang dika gọvanọ steeti ahụ ma nye onye jị́ pati APC azọ okwa ahu akwukwo ikikere ohuru.

ADAMAWA (PDP)

Ahmadu Fintri nke PDP merichara dị ka gọvanọ Adamawa, Umar Ardo nke Social Democratic Party (SDP) nwalere mmeri Fintri.

K’osiladi, ụlọ ịkpe tribunal nke onye ịsị ya bụ Theodora Uloho anabataghị mkpesa ya n’ihi na ha amaghị were kpesa nya bụ mkpesa ọ ụma.

Ardo kpesara na ịkpe tribunal n’ulo ikpe appeal, mana n’ụbọchị Tuesday ụlọikpe appeal biara kwenye n’ikpe tribunal kpere.

AKWA IBOM(PDP)

N’ubochi ịrị atọ nke ọnwa Septemba, ụlọikpe tribunal na Akwaibom kwadoro mmeri Umo Eno dịka gọvanọ steeti ahụ.

Ụlọ ịkpe tribunal ahụ wezụgara mkpesa Akanimo Udofia, nke APC ma kwado na Eno egosighị ásámbódò WAEC n’ezighị ézì dika Albert Bassey nke Young Progressive Party(ypp) kpesara.

Ịzụ ụka abụọ gara-aga, ụlọikpe appeal nke dị na Lagos wezụgara mkpesa nke Action Alliance (AA) yana nke Accord Party(AP) kpesara megide mmeri Eno.

Ụlọikpe a biara nabata ịkpe sịrị na Eno meriri dịka gọvanọ.

BAUCHI (PDP)

PDP meriri na Bauchi dịka ụlọ ịkpe appeal kwadoro mmeri Bala Mohammed dịka gọvanọ steeti ahụ.

Sodique Abubakar nke APC, nwalere mmeri Mohammed na tribunal, mana ụlọikpe ahụ wezụgara ya ma kwụọ sị na nya bụ mkpesa dara ịgosi òtù esiri ji BVAS rụ́ruọ́ aka na-ntuliaka ahu.

Ná mkpebi ekwekorotara ọnụ n’ubochi ịrị n’asaa nke onwa Novemba dika Abubakar nwalere ịkpe tribunal na ụlọikpe appeal, ya bu ụlọikpe appeal biara kwubie na Mohammed bu onye nke meriri na ntụli aka ahu.

DELTA (PDP)

Uloikpe tribunal kwadoro mmeri Uba Sani nke APC, site ị́gwè ọzị intanet akpọrọ Zoom, ebe anọrọ guputa nya bụ ikpe, mà wezụga mkpesa Sherriff Oborevwori nke PDP kpesara nke kwụrụ na enwere “nruru aka na igwe eji eziga nsonazu ntuliaka”.

K’osiladi, PDP nke dị́ na Kaduna jùrù inabata ikpe a, ma ga n’ihu wega ya bu ikpe n’ulo ikpe appeal.

TARABA (PDP)

N’ụbọchị ịrị atọ nke Septemba,ụlọ ịkpe tribunal kwupụtara Kefas Agbu dịka onye meriri na- ntuliaka elu ọkwa gọvanọ steeti ahu.

Ụlọikpe tribunal ahụ kpebiri na Muhammed Yahaya na New Nigeria People’s Party (NNPP) dàrà ikwuputa kpomkwem òtù Agbu jìrì hapu imezu ịwụ nke ntuliaka elu akpọrọ Electoral Act.

OGUN (APC)

APC meriri n’Ogun n’ubochi mbụ nke ọnwa Ọktọba mgbe ụlọikpe tribunal kwadoro ntuliaka kwuputara Dapo Abiodun dika gọvanọ steeti ahu.

Ụlọikpe tribunal áhù wezugara mkpesa PDP na Ladi Adebutu, ma sị́ “n’ochighi mmiri magharakwa ịnwe eziokwu n’ime ya”.

Ka ha wepuru ịkpe ahụ an appeal, ụlọikpe appeal nabatara ikpe nke tribunal, ka-anutara mkpesa akụkụ abuo. Uloikpe appeal bịara kwụọ na ubochi ha ga aguputa ya bu ịkpe bu nke aga-eme ka onye ọbụla ya bu ịkpe gbasara mata mgbe oge ruru, ma sikwa na ha ga-agwa ha ubochi atọ tupu ubochi ahu eruo.

SOKOTO (APC)

N’ubochi mbụ nke ọnwa Ọktọba ụlọikpe tribunal kwupụtara Ahmed Aliyu nke APC dịka onye meriri na ntuliaka elu emere na steeti ahu.

Tribunal ahu nke mmadu ato mejuputara, nke Haruna Msheila nọ n’isi ya tụfuru mkpesa PDP na Saidu Uma nke APC, n’ọnọdụ na ha enweghị ịke ịkọwa ọ ụma ihe kpatara ha jí mee mkpesa ha.

K’osiladi, ụlọikpe appeal dị́ na Abuja, nabatara ịkpe ahụ nke PDP na Umar kpesara.

CROSS RIVER (APC)

N’ubochi Wednesday, ụlọikpe appeal nke Lagos nabatara mmeri Bassey Otu nke APC dịka onye gọvanọ Cross River steeti.

Sandy Onor nke PDP, mwalere mmeri Otu mana tribunal tụfuru mkpesa ya.

GOMBE (APC)

N’mmeri ọhụrụ na ụbọchị Thursday, ụlọikpe appeal n’Abuja kwadoro mmeri Inuwa Yahaya dịka gọvanọ Gombe nke ugboro abụọ.

Jibrin Barde nke PDP Nyere mkpesa na Yahaya nke APC bu onye ọtụtụ n’atunyereghi na-ntuliaka ahụ. Mana ya bu mkpesa bu nke tribunal tuzugara tupu atuzụgakwa ya ọzọ na ụlọikpe appeal.

OYO (PDP)

Ụlọikpe tribunal n’ubochi ịrị n’ato nke ọnwa Julai,dịka atufuchara mkpesa nke Allied People’s Movement (APM) nke na-anwale mmeri Seyi Makinde nke PDP.

Babatunde Ajala nke Action Alliance (AA), nwalekwara mmeri Makinde na ụlọikpe tribunal, mànà ụlọikpe ahụ tụfuru mkpesa ya.

ABIA (LP)

Ụlọikpe tribunal no n’ubochi isii nke ọnwa Oktọba nabatara mmeri Alex Otti dịka gọvanọ Abia steeti.

Nya bụ ụlọikpe wezụgara mkpesa nke Okey Ahiwe nke PDP na Ikechi Emenike nke APC kpesara n’onodu n’onweghị eziokwu nọ n’ime ya.

EBONYI (APC)

N’ubochi ịrị abụọ n’asaato, ụlọikpe tribunal nke Ebonyi stéétị̀ wezụgara mkpesa nke patị All Progressive Grand Alliance (APGA) na PDP, ma nabata Francis Nwifuru nke APC dika onye mmeri n’ntuliaka ahu.

K’osiladi, PDP sí na há ga eweje mkpesa ha n’ụlọikpe appeal.

KANO (APC)

N’ubochi Friday, ụlọikpe appeal n’Abuja kwadoro ịkpe tribunal dị na Kano nke chụrụ Abba Yusuf nke NNPP dịka gọvanọ steeti ahu. Yusuf Gawuna nke APC bu onye ekwuputara dịka gọvanọ Kano steeti.

Mànà akwukwo ebe edere ịkpe ha bịara n’ekwu na ọbụ Abba Yusuf meriri, ébé ihe aguputara n’uloikpe chụrụ ya n’ótù aka ahu dịka gọvanọ.

Umar Bangari onye odee akwụkwọ bu registrar n’ulọ ịkpe ahu kwụrụ n’obu ndeghe aka, nke na emetutaghị mkpebi ụlọikpe ahu.

Ana-atu anya inụta mkpesa ha n’ụlọ ikpe okpecha ọ́gwú bu Supreme court.

ZAMFARA (ÉKPÉBÌBEGHÌ YA)

N’ubochi ịrị na isii nke ọnwa Novemba, ụlọ ịkpe appeal n’Abuja kagburu mmeri Dauda Lawal nke PDP, ma kwupụta na ntuliaka elu Zamfara steeti bụ nke ana ekpebibeghị. Ụlọikpe gwara INEC ka ha megharịa ntuliaka élú ọ̀zọ́ na steeti ahu.

N’agbanyeghị na tribunal akwadola mmeri Bello Matawalle nke APC , mana onye bu minister nchekwa na steeti ahu gbàghàrà ikpe ahu n’ulọ ịkpe.

NCHỊKỌTA

Ọ̀ bụghị eziokwu ikwu na APC na-emeri na “steeti niile”. N’ime steeti iri abụọ na asatọ ebe enwere ntuliaka ọkwa gọvanọ, ụlọikpe enyela ikpe metụtara steeti iri abụọ n’abụọ.

APC emeriela na steeti iri na atọ, PDP nwetala asatọ, ebe LP nwetara naani ótù. N’ime steeti niile ebe APC nwetara mmeri n’ụlọ ịkpe, naanị steeti abụọ (Kano na Plateau) bụ ndị ụlọikpe kpere ikpe nyere ha mmeri. Ndị ọ̀zọ́ bụ na ha meriri na ntuliaka emere, nke mere ụlọikpe jiri kwado “mmeri ha gasị”.

Steeti isii ndị ahụ fọrọnụ (Borno, Jigawa, Kwara, Kastina, na Niger) ebe enweghị ikpe bụcha APC merigasịrị na ntuli aka há.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.