Monday, April 29, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Hushpuppi ọ̀ pụ̀tágó nà ǹgá?

Hushpuppi ọ̀ pụ̀tágó nà ǹgá?
December 08
13:57 2023

Ótù ihe ńkírí á hụtara n’ọba ozi soshal midia ekwuola na Ramon Abbas, onye ụwa màrà dịka Hushpuppi, apụtala n’ụlọ ǹgá.

Ihe onyonyo à enwetala nkiri karịrị ótù nde na puku narị itoolu, nkesa puku abụọ na narị anọ, ntụnye ọnụ narị itoolu na iri ise na asaa, ya na mmasị puku asaa, n’ọ́bá ozi X, nke bụbu Twitter.

Isi okwu ihe ngosị à, nke onye ákàrà asafe yá bụ @praiseoghre dere, kwùrù: “Hushpuppi apụtana nga, k’anyị chekwube na ọ mụtala ihe síté na mmehe ya.”

N’ime ihe ngosị ahụ, ahụrụ kà ndị mmadụ dịka ha abụ ndị òtù ya na-anabata ma na-ekele Hushpuppi n’ọ́dụ̀ ụgbọelu, ebe ó bù akpa n’aka ya.

Advertisement

Ọtụtụ mmadụ pụtara n’ihe ngosị ahụ jì ekwentị ha ésèré Huspuppi onyonyo.

Ihe ngosị à àgbágó n’asafe dị iche iche n’ọba ozi Facebook, ebe ọtụtụ mmadụ na-akọwa nà Huspuppi apụtago nga.

ÒNYÉ BỤ̀ HUSHPUPPI?

Hushpuppi bụ onye amara amara n’ọba ọzị nà ojikọmba Naijiria, nke ndị bèkéè na-akpọ internet. Á tụ̀rụ̀ ya nga afọ iri na otu na mba United States of America (USA) màkà mpụ “igwu ndị mba òfèsì wàyó”.

Advertisement

Ásị̀rị̀ na ó mere mpụ dịka ịkpata ego n’ụzọ n’ezighị ezi, igwu ụlọ akụ wayo, ya na izunarị njirimara mmadụ ruru ótù ijeri Dirham na ụma nde narị isii (atụmatụ ego ruru otu ijeri narị na iri isii n’asatọ).

N’ọnwa June 2020, ndị uweojii mba US bụ́ Federal Bureau of Investigations (FBI) jiri njirimara Google yá chọta mà kpọchie ya na ala Dubai nke obodo United Arab Emirates (UAE).

Otis D. Wright II, onye ọkaikpe mba US, màrà Huspuppi ikpe dịka ésì Dubia webata ikpe ya USA n’ọnwa Julaị n’afọ 2020.

Wright nyere iwu kà ọ kwụghachie dollar otu pụku nde, narị pụku asaa na iri atọ n’abuọ na narị asatọ na iri anọ n’otu ($1,732,841) nye mmadụ abụọ ó gwuru wayo. Nke a bụ dịka Hushpuppi kwetara na sọsọ otu ebubo nà ó sonyere n’ịkpata ego n’ụzọ n’ezighi ezi.

Advertisement

ŃNYÒCHÁ

Anyị jiri isi okwu mee nnyocha, nke gosịrị na nya bụ ihe nkiri bụ nke iLiteTV bipụtara na YouTube n’afọ 2018, mgbe Hushpuppi mere ncheta ọmụmụ ya na Cyprus.

Advertisement

Ihe ngosị ahụ pụtakwara ọzọ na YouTube n’afọ 2020, dịka akpọchịchara ya, na-ekwu na nya bụ Huspuppi apụtala na ǹgá.

Iji mátá ebe Hushpuppi nọ̀, TheCable lèrè anya n’akwụkwọ ndekọ áhà ndị ome mpụ niile nọ na nga US, Federal Bureau of Prisons.

Advertisement

Nya bụ akwụkwọ ndekọ aha ndị mere mpụ nwere ọtụtụ ozi dịka aha, afọ ọmụmụ, ébé na mgbe ndị akpọchiri na nga ga-apụta.

Ihe anyị chọpụtara gosịrị na Hushpuppi nọ n’ụlọ nga Fort Dix Federal Correctional Institution. Há dèrè na ụbọchị mpụta ya ga-abụ n’ọnwa April nke afọ 2019.

Advertisement

ŃCHỊ́KỌ́TÁ ÓKWU

Okwu na Huspuppi apụtala na nga bụ asị. Ihe ngosị ahụ na-ekwu na ọ pụtara na nga bụ ihe nkiri ochie kamgbe afọ 2018.

Dịka ihe ndị anyị hụtara n’akwụkwọ ndị nọ n’ụlọ nga US Federal Bureau of Prisons, Hushpuppi kà nọ na nga na-eme nga afọ iri na otu.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.