Tuesday, May 14, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Íhé ńkírí na-akọwa nà á kpọ̀chìrì ónyé ísí senate n’òbòdó Gabon dị̀ óchíè

Íhé ńkírí na-akọwa nà á kpọ̀chìrì ónyé ísí senate n’òbòdó Gabon dị̀ óchíè
September 12
18:43 2023

Íhé nkiri pụtara nà Facebook na-egosị kà ndị ọchịchị nà-emepe àkpà ego, mà sị́ nà onye bụbu onye isi oche senate n’obodo Gabon chọ̀rọ̀ ísi n’obodo ya gbapụ ozugbo ndị agha napụrụ ọchịchị ha n’ike.

Ókwú à bụ nke ekesara site n’ọba ozi á na-akpọ Nigeria News Update. Nya bụ ozi nwetara nkiri ruru ótù nde na puku narị ise. O nwetara ntunye ọnụ puku narị atọ na narị abụọ.

Ihe ngosi à, nke wuru èwù n’ọba ozi soshal midia nke gunyere WhatsApp, X, yana TikTok gosịrị ebe ndị uwe ojii nà ìgwé mmadụ na-emepe ụfọdụ àkpà juputara n’ego.
Ńgwùgwù ego ndị à bụ nke eji akwụkwọ mgbado ego edere “BEAC”, nke pụtara Bank Of Central Africa, were jikọta ọnụ.

Advertisement

BEAC na-àrụ́rụ́ obodo isii nọ́ n’etiti ḿbà Africa, nke mejupụtara òtù Economic and Monetary Community of Central Africa, ọrụ. Obodo ndịa gụnyere Cameroon, Gabon, Central Africa Republic, Chad, Republic of Congo, yana Equatoria Guinea.

Ọ́ bụ̀ Central African Franc (CFA) bụ ego á màrà nà BAEC nwèrè.

ŃNÁGHÁRÁ Ọ̀CHỊ́CHỊ́ N’íKÉ ǸKÉ ÒBÒDÓ GABON

Advertisement

Gabon, ótù n’ime obodo na-emepụta mmanụ crude ọfụma, bànyèrè nà òtù Commonwealth n’ọnwa Julaị nke afo 2022, n’agbanyeghị nà ọ bụbu France chịrị há n’ike tupu ha enwere onwe ha. Òké àlà ruru pasentị iri itoolu nà etiti ḿbà Africa bụ nke óké ọhịa kpuchiri, ma n’anata ọtụtụ aṅụrụ carbon karịrị ihe obodo ahụ na-enyepụta.

N’ubọchị iri atọ nke ọnwa August, ndị agha army naghara ọchịchị n’ike n’obodo Gabon, kamgbe onye isi obodo há bụ Ali Bongo laghachitara n’ọchịchị nke ugboro atọ.

Nnagharara ọchịchị n’íké à wetara ọchịchị afọ iri ise nà ise nke Bongo na ezinụlọ ya ná njedebe.

Òtù ndị agha bịara kwupụta Brice Oligui Nguema dịka onye isi òtù à naghara ọchịchị n’ike. Há kpochiri onye isi ala há napụrụ ọchịchị n’ụlọ. Há kpochikwara ótù n’ime nwa ya nwoke.

Advertisement

“Anyị ekpebiela ichekwa udo site n’iweta na njedebe ọchịchị nke ugbua n’obodo Gabon,” ótù n’ime ndị agha à kwuru n’ọwa ígwè onyonyo á na-akpọ Gabon 24.

Mgbe ha mere nkwupụta à, ọ bụ ndị agha iri na abụọ nọ kwuo sị na há ga-akagbu mpụta ntulika ahụ ndị naghara ọchịchị obodo Gabon jụ̀rụ̀. Há gbakwunyere na “há agbasago ngalaba ọchịchị niile obodo ahụ nwere.”

N’ụbọchị asaa nke ọnwa September, ụbọchị asatọ kà achụpụchara Bongo n’ọchịchị mà debekwa ya ụlọ, ndị agha mechara hapụ ya màkà “ọnọdụ ahụ ike ya”.

N’otu ozi há bipụtara na ihe onyonyo obodo ha, Ulrich Manfoumbi, onye nkwuchite ọnụ nyere òtù ndị agha à kwuru sị: “O nwèrè íké gaa obodo ọzọ gá nara ọgwụ, mà ọbụrụ na ọ chọ̀rọ̀.”

Advertisement

ŃNYÒCHÁ

TheCable jiri ngwa ọrụ nnyocha bụ Yandex were nyocha akụkụ n’ile nọ na ihe ngosị a, mà chọpụta na e mepụtara ihe ngosị ahụ n’ọnwa 2022.

Advertisement

Ihe ngosị ochie a bụ nke ebipụtara mgbe akpochiri Guy Nzouba Ndama, onye bụbu onye isi senate mà bụrụkwa onye isi òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ama ọchịchị obodo ahụ aka, n’oke ala Gabon na Congo ebe o bu ego ruru nde Euro abụọ agbapụ n’obodo ya.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Advertisement

Ihe ngosị nke na-ekwu na onye bụbu onye isi senate Gabon na-achọ ịgbapụ n’obodo ya, ka ndị agha naghara ọchịchị bụ̀ àsị́. Ihe ngosị à bụ nke ebipụtara ọtụtụ afọ gara aga tupu ndị agha anara ọchịchị.

Advertisement

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.