Saturday, May 4, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Íhé ńkírí ụ́lọ̀ élu nà-ádà ésighị nà àlà.ọ̀má jìjìjì ǹké Taiwan

Íhé ńkírí ụ́lọ̀ élu nà-ádà ésighị nà àlà.ọ̀má jìjìjì ǹké Taiwan
April 15
09:55 2024

Ihe nkiri na-ewu ewu gosịrị ebe ogologo ụlọ elu nà-èzé. Ndị mmadụ sị na ọ sì n’ihe mgberede ala ọma jijiji mere n’obodo Taiwan.

Na ihe ngosị ahụ, a hụrụ ka ogologo ụlọ na-eze, ma na-abọlị aja elu, ebe ndị mmadụ nọ n’akụkụ ya na-eti mkpụ.

Ihe nkiri nkeji iri n’atọ a, nke pụtara na X, enwetala nkiri puku iri ise n’ise (55,000), nkesa iri atọ (30), nkwenye iri isii n’asaa (67), na nchekwa ịgụ mgbe ọzọ iri atọ n’atọ (33).

“Ọtụtụ ụlọ dara mgbe nnukwu ala ọma jijiji ike ya ruru asaa na ụma ise (7.5) mere, nke kpaliri nnukwu ide mmiri nke ndị oyibo na-akpo tsunami,” @patrickhsu0906, onye ji X agbasa ozi dere n’okpuru ihe ngosị ahụ.

Advertisement

Ihe ngosị ahụ bu nke ọtụtụ ndị ndị ọzọ na X kwuru n’osị na ala ọma jijiji nke Taiwan.

“Ala ọma jijiji nke Taiwan nke owụwa anyanwu Asia! Ajọ ihe ebe ogologo ụlọ nà-ádà. Ala ọma jijiji a, nke mebiri ụlọ ma mee ka ana zéé, bụ ihe mgberede kacha metụta Taiwan kámgbè afọ iri abụọ n’ise. Ọ bụ nke so kwa metụta ụfọdụ akụkụ China, Philippines, na Japan.

“Taipei, isi obodo Taiwan. Alà ọma jijiji nke íké ya ruru asaa na ụma ise (7.5) bidoro n’osimiri ọwụwa anyanwụ nke Taiwan. Nke a gburu mmadụ itoolu (9) ma merụọ mmadụ ruru narị itoolu na iri isii n’atọ (963) ahụ, dịka ndị mmenyụ ọkụ ogbụgbu Taiwan kwụrụ,” @ZubairSpanish dere na X.

Advertisement

ÀLÀ Ọ̀MÁ JÌJÌJÌ ǸKÉ TAIWAN

N’ụbọchị Wednesday gara aga, ala ọma jijiji nke ike ya ruru asaa n’ụma abụọ (7.2) mere n’obodo Taiwan, nke kpatara ọdịda ọtụtụ ụlọ, gbuo mmadụ itoolu, ma merụọ ihe karịrị mmadụ otu puku ahụ.

Central Weather Administration (CWA), ụlọrụ na-ahụ maka ihu igwe n’obodo Taiwan, kwuru na ọ bụ mmegharị n’ime óké osimiri Philippine n’ebe dị ala nsọ kpatara nya bụ ihe mgberede.

N’agbanyeghị na ala ọma jijiji abụghị ihe ọhụrụ na Taiwan, nke ụbọchị Wednesday bụ nke kacha metụta obodo ahụ kamgbe afọ iri abụọ n’ise gara aga.

Advertisement

N’afọ 1999, ala ọma jijiji nke ike ya ruru asaa n’ụma asaa (7.7) kpatara ọnwụ mmadụ puku abụọ na narị anọ (2,400), ebe mmadụ puku iri (11,000) merụrụ ahụ. Ihe mgberede a mebiri ụlọ puku iri.

Taiwan bụ obodo dị na ọdịda anyanwụ nke etiti osimiri Pacific Ocean. Ọ nọ n’elu ebe a na-enwekarị ala ọma jijiji (nke akpọrọ ring of fire).

ÍNYÒCHÀ ÍHÉ ŃGÓSỊ́ À

TheCable jiri ngwa ọrụ InVID nyochaa akụkụ niile nọ na ihe ngosị a, ma chọpụta na e bipụtara ya kamgbe ụbọchị iri abụọ n’asaa nke afọ 2021 n’ọba ozi The Paper Yunan Information Platform nke China.

Advertisement

Dịka ọba ozi a kwuru, ogologo ụlọ iri na ise bụ nke ama ụma kutuo n’ọnọdụ nlezị anya na Kunming, isi obodo Yunnan dị na China.

A kuturu ụlọ ndị a n’ihi na ha erughị ógó ụlọ obibi na ihe ndị mmadụ na-achọ. Ụlọ ndị a nwekwara óké mmebi, dịka a hapụrụ ịrụcha ha ngwa ngwa.

Advertisement

Ebibutakwara nya bụ ihe ngosị na YouTube n’oba ozi USA TODAY n’ụbọchị iri atọ n’otu nke ọnwa August nke afọ 2021.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Advertisement

Ihe ngosị ebe ụlọ ogologo na-ada esighị na ala ọma jijiji nke mere n’obodo Taiwan. Kama, ọ bụ nkutu ụlọ a ma ụma kutuo na China n’afọ 2021.

Advertisement

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.