Monday, April 29, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Matawalle ò lìrì úgbọ́àlà dị́ ọ́nụ n’ọ́wárá àlà ǹzúzó?

Matawalle ò lìrì úgbọ́àlà dị́ ọ́nụ n’ọ́wárá àlà ǹzúzó?
January 12
07:04 2024

Ihe ngosị a hụtara n’ọba ozi soshal midia ekwuola sị na Bello Matawalle, onye bụburụ gọvanọ Zamfara steeti lìrì ókómókó ụgbọala ọhụrụ n’ime ọwara ala nzuzo.

Dịka ihe e dere n’okpuru nya bụ ihe ngosị, ụgbọala ndị Matawalle—onye bụzi minista steeti maka nchekwa—lìrì bụ ndị ọhụrụ.

“Bèéré òbódò anyị ákwá!” bụ ihe isi okwu ahụ kwuru.

“Ọ̀tụ́tụ́ ụgbọala ọhụrụ á zụtara bụ ihe gọvanọ Matawalle nke Zamfara steeti zòrò-ezoro lìé n’àlà. Kedụ ihe mere agbụrụ ọjị jiri nwe óbì ọjọọ?”

Advertisement

N’ihe ngosi a, ụgbọala ndị bụgasị SUV, ka a hụ̀rụ̀ kà e lìrì n’àlà kpóchíé ha ája.

Ihe ngosị a nke ekesara n’ọba ozị́ WhatsApp, k’ahụtakwara n’ásáfè X nke VANPDP, otu na-ákwàdó People’s Democratic Party (PDP).

Dịka asafe a kwùrù, ụgbọala ndị a bụ ndị “enyopụrụ mà naghara onye bụburu gọvanọ Zamfara steeti, minista ụ́nụ̀ na-ahụ maka nchekwa obodo”.

Advertisement

Kamgbe e bipụtara nya bụ ozi n’ụbọchị iri n’anọ nke ọnwa Decemba, ó nwetala nkiri karịrị ótù narị na iri asaa, ńkwàdó narị ise n’iri itoolu n’asatọ, nkésà iri atọ na iri asaa n’anọ.

“Ekwesịrị ka ékpé ya ikpe maka izu ohi,” bụ ihe ótù ntụnye Emmanuel Eniola, onye ọka ikpe Naijiria ma bụrụkwa onye bụbu onye ndụmọdụ nyere PDP, dere n’okpuru ihe ngosị a.

Okwu a pụtakwara na TikTok n’asafe a kpọrọ awakeningafrica1 ebe ó nwetara nkiri karịrị narị asatọ na iri n’otu, nkwado puku narị iri n’abụọ, nchekwa narị asaa n’iri atọ n’itoolu, ntụnye ọnụ narị anọ n’iri isii n’itoolu, ya nà nkesa narị atọ n’iri ise n’atọ.

Mana ọ̀ bụ̀ eziọkwu na minista liri ọtụtụ ụgbọala n’àlà?

Advertisement

ŃNYÒCHÁ

Advertisement

Nnyocha TheCable jiri ngwa ọrụ Reverse Image Search mee gosịrị na e biputara nya bụ íhé ngosị n’izu ụ́kà atọ gara-aga tupu à hụtazie ya ebe niile na soshal midia Naijiria.

“Lee ihe ndị uwe ojii IES chọpụtara na Balkh Province,” ótù ozi na X e bipụtara n’ụbọchị iri n’atọ nke ọnwa Novemba kwuru.

Advertisement

Balkh bụ obodo n’úgwú obodo Afghanistan, nke dị na South-Central Asia. Òtù ndị agha Taliban naghara ọchịchị obodo ahụ n’afọ 2021 mà kwupụta ya dịka obodo okpukerechi Allah bụ Islamic Emirate of Afghanistan (IEA).

Nbiputa ọzọ n’ọba ozi Reddit kwuru na ụgbọala ndị aka “onye bụbu onye ndọrọndọrọ ọchịchị nrụrụ áká liri tupu ọ hapụ ọchịchị”.

Advertisement

Ọchịchọ anyị mere na intaneti gosịrị n’ózí nke ebiputara n’ụbọchị anọ nke ọnwa Decemba kwuru na dịka emerichara Matawalle na nghoputa ọ́zọ́, asịrị na ọ burula ụgbọala ruru iri ise dịka ọ na-apụ

Dauda Lawal, gọvanọ Zamfara steeti, bòrò Matawalle onye hapụrụ ya ọchịchị, ebubo maka ijide ọtụtụ ụgbọala steeti.

Advertisement

K’osiladị, onwebeghị Nbiputa ụlọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi kwuru na élìrì ụgbọala n’àlà ébé ọbụla na Naijiria—ébé enwebeghị kwanu nke ọbụla ga-ekwupụta ns élìrì ụgbọala ọbụla na Afghanistan.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu nke na-ásị́ na Matawalle lìrì ọtụtụ ụgbọala n’ala abụghị eziokwu. Onweghị ihe ákáébe na-ákwàdó ya.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.