Monday, April 29, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ruto ọ̀ bụ̀ ónyé ǹdú ìzìzì nà Afrịka ḿbà USA kpọ̀rọ̀ òkù ńlétá kámgbè áfọ̀ ìrí àbụ̀ọ́

Ruto ọ̀ bụ̀ ónyé ǹdú ìzìzì nà Afrịka ḿbà USA kpọ̀rọ̀ òkù ńlétá kámgbè áfọ̀ ìrí àbụ̀ọ́
March 18
11:57 2024

William Ruto, nke Kenya, kwuru na ọ́ bụ̀ onye isiala mbụ nà Afrịka nke gọọmentị mba USA kpọrọ òkù nleta, ịbịa hụ onye ndu há kamgbe afọ iri abụọ gara aga.

Ruto kwuru nke a na nnukwu ọgbakọ Benny Hinn, onye na-ezisa ozi ọma n’ihe onyonyo, hibere na Nairobi, Kenya site n’ụbọchị iri abụọ n’anọ ruo ụbọchị iri abụọ n’ise nke ọnwa Febụwarị.

“Onye isiala mba USA akpọla onyeisi ala Kenya òkù. Nke a emebeghị kamgbe afọ iri abụọ gara-aga. Onwebeghị onye ndu mba Afrika USA kpọrọ òkù,” o jiri obi aṅụrị kwuo.

Ihe ngosị ebe o kwuru nke a bụ nke e biputara n’ọba ozi Citizen TV. Ihe onyonyo a nwetara nkiri karịrị narị abụọ na iri atọ n’itoolu (239,000) n’ótù ọba ozi nwere ndị nsọnye karịrị nde anọ na narị isii (4.6 million).

Advertisement

Okwu Ruto nwetara ọtụtụ ntụnye ọnụ ndị Kenya na X, nke a mabụrụ dịka Twitter. Ebe ụfọdụ na-ekesa okwu Ruto, ndị ọzọ na-aṅurị n’ihi nya bụ okwu.

Otu onye ji X ezịsa ozi bụ́ Sirengo Maurice kwuru na Ruto na-àkwádó ime kà Kenya bụrụ obodo ama ama. Mana onye ntụnye ọnụ ọzọ bịara jụọ ihe kpatara Ruto ji akọ akụkọ òkù nleta n’ọgbakọ okpukpere chi.

Advertisement

 

 

Advertisement

GỊ́NỊ BỤ̀ ŃLÉTÁ ÓNYÉ ÍSÍÀLÀ?

Nke a bụ nleta onye isiala ótù obodo nye onyeisiala ọ̀zọ́, nke na-abụkarị na nzite onye isiala nke ọzọ.

Advertisement

Osita Agbu, onye professor ọka nkuzi International Relations na mahadum Baze University, kwuru na nleta onye isiala “na-adị óké mkpa” ma “zuo òkè” n’ihi na ọ bụ ohere ndị ndu ji àkpá ńkàtá dị mkpa.

Nyere mba USA, nleta onyeisi ala n’ọnọdụ dị otu a na-egosị mmekọ há nà obodo ahụ dịka enyi. Ọ na-abụkarị ụbọchị anọ, nke na-enwe mmemme.

Advertisement

Nleta a, na-enwekarị oriri abalị n’ụlọ ọchịchị, oriri nke ehihie, nzite ịnọ na Blair Bouse ebe ndị ndu obodo bịara ileleta Washington DC na-anọkarị. Blair House bụ ebe obibi ndị ọbịa onyeisiala mba USA.

 

Advertisement

Nleta obodo abụghị ohere itule ndọrọndọrọ ọchịchị obodo. Kama, ọ na-egosị mmekọta ọma dị n’etiti obodo na obodo ọzọ.

ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ RUTO

Ịmata eziokwu dị n’okwu Ruto, TheCable lebara anya na nleta ndị ndu mba Afrịka nye mba USA, na mbụ ruo ugbu a.

Onyeisiala Edwin Barclay, nke Liberia, bụ onye ndu mbụ na mba Afrịka inweta nzita ịga mba USA n’ọnọdụ dị otu a, n’afọ 1943, n’okpuru ọchịchị Franklin Roosevelt, onyeisiala iri atọ n’abụọ nke USA.

K’osiladi, n’afọ 2008, afọ iri na isii gara-aga, John Kuffor, onye isiala Ghana na nwunye ya nwetara nzite a ịbia USA, n’okpuru ọchịchị George Bush, onyeisiala nke iri anọ n’atọ nke USA.

Bush kelere ya na ndị so ya wee bịa nya bụ nzite, ma too ya n’ihi mgbo ọ na-agba n’ime ọchịchị onye kwuo uche ya.

Tupu Kuffor aga na nleta a n’afọ 2008, Mwai Kibaki, onyeisi ala atọ nke Kenya, bụ onye nke Bush nabatara n’ọnọdụ nleta obodo n’afọ 2003.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu onyeisi ala Ruto bụ asị. N’agbanyeghị na ọ bụ onyeisiala mbụ nke obodo Kenya inweta nzite a n’afọ iri abụọ gara-aga, ọ bughị onyeisi ala mbụ nke mba Afrịka inweta nzite mba USA n’afọ iri abụọ gara aga.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.