MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Shell ò nà-àkwụ́sị́ ọ́rụ nà Naijiria

Shell ò nà-àkwụ́sị́ ọ́rụ nà Naijiria
January 23
05:30 2024

Ka Shell kpebichara ịkwụsị azụmahịa ịmịpụta mmanụ crude na Naijiria, nke bekee na-akpọ onshore exploration, ọ́tụ́tụ́ edemede na soshal mịdia ekwuola na nya ụlọrụ Britain ámàrà ọfụma maka nrụpụta mmanụ petrol na-ahapụ Naijiria.

Ịtụnye ọnụ na nkwupụta Shell mèrè, ụfọdụ nwa afọ Naijiria na soshal media nyèrè ntụnye ha dị iche-iche ndị abụchaghị eziokwu.

Ụfọdụ mbiputa a, ndị nwetara puku kwuru puku mmasị nà nkesa n’ọbá ozi X, kwuru na Shell adọchiela akwa nye ọnụnọ ọrụ afọ iri asatọ ya na Naijiria.

“Shell ekwuputala na ha na-ahapụ Naijiria. Gịnị kà ndị ọcha á na-ahụ, nke anyị anaghị ahụ?”

Advertisement

Onye ọzọ bụ @_pheranme, biputarakwara ozí ọzọ na-ekwu maka ọpụpụ Shell, ma na-ajụ “gịnị na-eme?”

Nyere @ThisIsNot1967_, okwuru na “Shell BP ahapụla Naijiria n’émí-émí ka afọ iri asatọ n’ise ha nọrọ n’obodo a gachara”.

 

Advertisement

Ị́HỌPỤ̀TÁ ǸKÉ BỤ ÉZÍÓKWU

Kà ha kwuputara nwogharị ọtụtụ ihe n’ụlọrụ ha nà Naijiria, ụlọrụ Shell kwuru na dịka ha na-eso usoro ìwú nkwado ọrụ ha, ha ga-ere Shell Petroleum Development Company of Nigeria Limited (SPDC).

Azụmahịa mmịpụta mmanụ n’ala bụ nke ụlọrụ Renaissance—mbịakọta ọnụ ụlọrụ ise gụnyere ụlọrụ anọ n’amịpụta mmanụ crude na ụlọrụ mba ofesi. Ụlọrụ ndịa bụ ND Western, Ardel Energy, First Exploration and Production ( First E&P), Waltersmith, nà Petrolin.

Ụlọrụ SPDC bụ ndị nwe NNPC/SPDC/Total Energies/ NAOX joint venture, nke gụnyere Nigerian National Petroleum Company Limited (nke ha ji pasenti iri ise n’ise nwere), SPDC (pasentị iri atọ), Total Energies (pasentị iri), na ụlọrụ na-emepụta mmanụ petrol bụ Nigerian Agip Oil company Limited (pasentị ise).

Na mbipụta gbàsárá nkwụsị ịmịpụta mmanụ na Naijiria nke ụlọrụ Shell, ha kọwara nà orire ótù n’ime ụlọrụ ha na Naijiria apụtaghị ọpụpụ ha na nya bụ obodo. Ha kọwara na há nwere “azụmahịa atọ ndị ọzọ” na Naijiria.

Ụlọrụ a bịara gụpụta azụmahịa ndị ahụ dịka Shell Exploration and Petroleum Company Limited (SNEPCo), Shell Nigeria Gas Limited (SNG), ya na Daystar Power Group, nke na-enye ọ́kụ́ nyere ụlọrụ ndị eji akpata ego na ụlọrụ na-arụpụtagasị akụrụ ngwa n’akụkụ niile nọ na West Africa.

“Na mgbakwunye, Shell nwe mmụba pasenti iri abụọ na ụma isii na NLNG, nke na-emepụta ma na-erepu LNG nye ahịa mba ofesi. Mmụba Shell nwe esoghị n’usoro azụmahịa a,” ozi a dere.

SHELL Ọ̀ KÀ NỌ̀ NÀ NAIJIRIA?

SNEPCO, ndị nọ n’isi mmepụta deep-water oil and gas nke si Bongo na mba Gulf of Guinea, bụ ndị atụrụ anya na ha ga-ágá n’ihu n’irụpụta na imepụta mmanụ petrol.

Tinyekwara Daystar, nke ụlọrụ Shell zughara n’ọnwa December 2022, ka ga-anọ na Naijiria.

ÍHÉ MÉRÉ SHELL JÌ ÈRÉ Ụ́LỌ̀ ÓRỤ HA NÁ-ÁMỊ́PỤ̀TÁ ḾMÁNỤ́ CRUDE

Mkpebi Shell ire ụlọrụ ha na-amịpụta mmanụ crude n’ala ebidoghị taa. Ụlọrụ há na-aya óhí mmanụ, mmebi mmanụ, ya na nsogbu ụlọrụ nke na-ebute nrụgharị ngwa orụ dị óké ọnụ nà ikpe nnukwu ego.

Ikpe ndị a ha nwegasịrị, egbochiela ha na mbụ ire ụlọrụ nke na-amịpụta mmanụ crude.

Na nnọkọ há mere n’afọ 2021, Ben Van Beeurden, onye bụbu onye isi ụlọrụ Shell, kwuru na nnukwu ụlọrụ à amara màkà mmanụ petrol na gọọmenti Naijiria nọ na mkpakọrịta ụka ire ụlọrụ ha na-ahụ maka mmịpụta mmanụ crude n’ala, ma sị n’ọbụ mmebi mgberede nke ụlọrụ ahụ.

N’ọnwa March nke afọ 2022, ụlọikpe Appeal dị na Owerri mabidoro Shell ire ụlọrụ ọbụla ha nwe bụ asetị na Naijiria, ruo mgbe e kpebiri ikpe ha ịkwụghachi ego karịrị ijeri dollar abụọ ($2 billion) maka nwufu mmanụ n’obodo dị na Naijiria.

N’ọnwa Julaị nke afọ 2022, Shell kwụsịrị irepụ ụfọdụ ụlọrụ ha na-amịpụta mmanụ crude ruo mgbe e kpebichara ikpe ahụ na ụlọikpe ókpécháá ọ̀gwụ́ bụ Supreme Court.

Ụ́LỌ̀Ọ́RỤ ÀZỤ́MÁHỊ́Á ḾMANỤ Ọ̀TỤ́TỤ́ ÒBÒDÒ NA-ERE ǸGÀLÀBÁ ÁHỊA HA

Ụfọdụ ụlọrụ ndị ọzọ na-emepụta mmanụ crude, nke a na-kpọ international oil companies (IOCs), agaala ahịa ire ụlọrụ ha.

Na Febụwarị nke afọ 2022, ụlọrụ Seplat Energy Plc, kwetara ịzụrụ ExxonMobil síté na nkwado Mobile Producing Nigeria Unlimited.

K’osiladị, k’otu afọ gachara, á nà-éché k’abịanye aka n’akwụkwọ n’ihi nsogbu iwu dịgasị ịche-iche.

N’ọnwa April nke afọ 2022, TotalEnergies kwupụtara atụmatụ ire mpakala há nwè ná mmekọrịta ụlọrụ nke azụmahịa mmanụ nà Naijiria. Nke a gbakwunyere ha n’ime ụlọrụ ndị ọzọ na-etinye ego ha ihe ndị ọzọ n’abụghị ịmịpụta mmanụ crude.

N’otu aka ahụ, Oando, n’ọnwa Septemba nke afọ 2023, kwuru na ọ ga-azụ òkè ụlọrụ na-ere mmanụ petrol bụ Eni nà Agip Oil Company Limited (NAOC).

Equinor, ụlọrụ mmepụta mmanụ petrol nke obodo Norway nwe, n’ọnwa Novemba, kwuru na okwetala ire ụlọrụ ya nọ na Naijiria, nke gụnyere òkè ha nwe n’ụlọrụ Agbami Oil Field, nye Chappal Energies, ụlọrụ na-ere mmanụ petrol Naijiria nwe.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu à na nnukwu ụlọrụ na-amịpụta mmanụ petrol bụ Shell na-apụ Naijiria bụ asị. Ụlọrụ à nwere abakala atọ ndị ọzọ na Naijiria.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.