Monday, April 29, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Tiketi sinima Naijiria ọ̀ kàchàsị̀rị̀ dị́ ọ́nụ n’ụ̀wà níile

Tiketi sinima Naijiria ọ̀ kàchàsị̀rị̀ dị́ ọ́nụ n’ụ̀wà níile
March 11
11:09 2024

Ótù onye ọchụnta ego nà Abuja kwùrù na ọnụ ego tiketi sinima na Naijiria dịkarịchara ọnụ n’ụwa niile.

Nya bụ onye ọchụnta ego bụ Yinka Ade-Aluko, onye nwe ụlọ ọrụ Doddle-Film Hub, nke na-emepụta ma na-egosị ihe onyonyo nà sinima Abuja.

Ade-Aluko kwùrù na sinima dịgasị nà Naijiria nà-àkpányéré sọ ndị ọgaranya, ma gbaghapụ ọtụtụ ndị ọzọ bụ ntorobịa enweghị ego.

Ónyé à na-eme ihe onyonyo kwùrù na nnyocha ụlọ ọrụ yá mèrè gosịrị na sinima Naijiria “dịkarịchara ọnụ n’ụwa”, nke pụtara nà ndị ogbenye “agaghị azụtanwu” tiketi yá.

Advertisement

K’osiladị, Ade-Aluko ekwughị mgbe ó mèrè nya bụ ihe nnyocha.

Mana òlé n’ime okwu nya bụ onye na-eme ihe onyonyo bụ̀ eziokwu?

KÈDÚ ÍHÉ MÉJÙPÙTÀRÀ Ọ́NỤ́ ÉGO TIKETI SINIMA?

Advertisement

Ọnụ ego á nà-èré tiketi sinima bụ mkpokọta ego nnabata íle ihe nkiri, ego gbàsárá ụ́zọ̀ esiri zụta nya bụ tiketi, ego ụ̀tụ́ gọọmentị, íbè ego metụtara oge nzụta nya bụ tiketi, ego ihe òrírí, na mgbakwunye ụgwọ ihe ndị ọzọ onye gòrò.

Ísí égo tiketi sinima bụ ụgwọ nya bụ onye nkiri kwụ̀rụ̀ kà á wèré nabata ya ile ihe onyonyo na sinima. Nke à gbakwunyere ego e ji ekiri ihe ngosị à, dịka ḿgbárì ọnụ ego sinima jì zụta ikikere ígosị nya bụ ihe onyonyo, ego eji ákwàdó ụlọ sinima, ya na úrù ndị nwe ụlọ sinima gà-èríté.

Ụfọdụ sinima na-enye ńlétá pụrụ ịche, dịka nke a nà-akpọ IMAX, nke na-eme ka ihe ngosị dịka ọ dị ìrè. Ọ na-enwe mkpọtụ dị iche mà é jírí sinima ndị ọzọ tùléé ya.

Dịka sinima 3D maọbụ nke ndị okomoko, ha na-agbakọnye ụgwọ ya n’elu isi ego tiketi sinima.

Advertisement

Ụfọdụ sinima nà-èkwé ka ndị mmadụ zụta tiketi na ịntanetị. Ụfọdụ mgbe, á na-akwụ ụgwọ mgbakwunye màkà tiketi ndị a zụtara òtú áhụ̀, nke na-eme ka ọnụ ego tiketi gbagotụ elu.

Ụfọdụ sinima nwere ike ịna ego mgbakwunye ma mmadụ rúó ụlọ nkiri tupu ọ̀ zụ́rụ́ tiketi.

N’ebe ìwú obodo nọ, ọnụ ego tiketi sinima nwelụ ike ịgbakọnye ụ̀tụ́ gọọmentị màkà ntụrụndụ, nke na-emekwa kà tiketi gara ọnụ.

Ụlọ sinima nwere ike íbè ọnụ ego tiketi, iji dọta ndị ahịa. Nke à gụnyere mà há léé ihe nkiri ọbụla n’oge ọzọ n’abụghị nà ḿgbèdè. Ọnụ ego tiketi ụmụ akwụkwọ maọbụ ndị ágádi zụ̀rụ̀ nwekwara ike ịdịtụ ọnụ ala.

Advertisement

Há na-enwekwa ọnụ ego há na-enye màkà ndị ahịa ugboro ugboro maọbụ ọtụtụ mmadụ zụrkọrọ tiketi ọnụ.

Ụfọdụ sinima nwere ike inye nleta pụrụ iche nà íhé ọ́ṅụ̀ dịka ịdebere mmadụ óché, nri, mmanya, maọbụ oghere n’ime ụlọ nkiri dị okomoko. Há nwèrè ike ịgbakọnye yá n’isi ego tiketi maọbụ nárá ya dịka ụgwọ dịrị onwe ya.

Advertisement

Ọ́NỤ́ ÉGO TIKETI N’ÒBÒDÒ ŃDÍ Ọ̀ZỌ́

Ego òné á nà-èré tiketi màkà ótù ihe nkiri n’òfú obodo maọbụ obodo abụọ nọ́ ònwé ha nwèrè ike ịdị iche site nà ébé sinima nọ̀.

Advertisement

Tiketi ndị sinima nọ n’etiti obodo mepere emepe na-ada ọnụ karịa ndị nke nọ n’ime obodo.

Sinima nà-agbakọnye ego ụgwọ ụlọ, ụgwọ ọnwa ndị ọrụ, na ego ha ji edokwa ụlọ nkiri.

Advertisement

Ikike igosị ihe nkiri oge ọ pụtara ọhụrụ bụ nke á na-enye ụlọ nkiri, nke nwere ike ịdị iche n’ụlọ nkiri ọzọ n’ihi nà ótú ndị mmadụ siri mara ihe nkiri ahụ.

Oge nkiri, tekinuzu, nà ima-aka dị n’etiti ọtụtụ ndị ụlọ nkiri nwere ike imetụta ọnụ ego e ji ele ihe nkiri na sinima.

Ọ̀rị́rị́ ọnụahịa nke bekee na-akpọ inflation nà ọnọdụ ndị nkiri n’obodo dị íchè íchè nwere ike imetụta ọnụ ego tiketi, mà méé kà ọ́ gbadata mà ego dị ụkọ.

N’ụwa niile, ahịa sinima bụ nke ndị azụmahịa na-abanye n’ime ya n’ihi uru dị na ya. Nke à pụtara nà há na-agbakọnye uru.

Ihe ndịa na ndị ọzọ bụ ihe mere ego eji ele ihe nkiri ịpịa ọ̀kpọ́ nke afọ 2014 dịka “The Bee Keeper” jiri daa ọnụ rụọ dollar iri ($10) n’ụlọ nkiri dị na California na USA, ma daa ọnụ ego dị ọnụ ala bụ́ dollar anọ ($4) n’ụlọ nkiri IMAX dị na Lekki nke Lagos steeti.

Obodo ndị nwere ndị azụmahịa ri nne nwere ikikere iwetu ọnụ ego sinima há site na nnukwu ọnụ ọgụgụ mmadụ na-abia ile ihe nkiri.

ÁHÍÁ SINIMA NÀ NAIJIRIA

Ụfọdụ sinima á mara na Naijiria gụnyere Silverbird, Lighthouse, Ozone, Filmhouse, na Genesis.

Ikiri ihe ejije nà mbara bidoro tupu sinima dị iche iche bata obodo Naijiria.

Silverbird bụ ụlọrụ mbụ mepere sinima na Naijiria, nke a na-ahụtakarị n’okporo ama ndị mepere emepe na Naijiria, dịka nke Silverbird Galleria dị na Victoria Island, Lagos nke mepere n’afọ 2004.

Ọ́ ga-ewe ndị na-emepụta ihe nkiri na Naijiria iwenite aka nà udiri onyonyo há na-eme tupu ndị na-aga sinima màkà ihe ngosị ndị mba ofesi wèré lelebe nke Naijiria mepụtara.

N’afọ 2015, DVD àdàbálá n’ajọ aka ndị ohi ihe nkiri bekee na-akpọ “pirates”, mà mechaa bụrụ ụzọ ochie eji ele ihe nkiri. Ndị na-emepụta ihe nkiri bịara chọba ụzọ ọzọ ha ga-esi réé ihe nkiri ha.

“I nwere íké jiri nde naira iri abụọ (₦20 million) mepụta ihe nkiri na DVD, ma reta naanị nde naira ise (₦5Million) n’ihi ndị ohi ihe nkiri,” bụ ihe onye na-emepụta ihe onyonyo Allen Onyige kwuru. “Mgbe ahụ kà sinima jiri bụrụ ihe pụtara ihe n’afọ 2016.

Netflix batara Sub-Saharan Afrịka n’afọ 2016. Kà afọ anọ gachara, ihe mgberede ọrịa COVID ga-emecha mee ka ndị mmadụ bido ikiri ihe ngosị na intanetị, nke beletara ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na-aga sinima.

Ụlọ nkiri sinima Naijiria bịara nwee ọtụtụ ịma aka n’ihu. Nkiri na ịntanetị nyere ndị mmadụ oghere ile ihe ha chọrọ, ile ya ebe ọbụla ha chọrọ, inweta nkiri kacha mma, nya na ọnụ ego dị ala karịa nke ndị sinima.

Nnyocha nke Inside Nollywood mèrè gosịrị na ọnụ ọgụgụ tiketi sinima Naijiria rèrè gbagoro site na nde abụọ na puku narị anọ na iri ise (2.45 million) n’afọ 2015 ruo nde ise na puku narị anọ na iri atọ (5.43 million) n’afọ 2018. Ọ́ bịara hụta ọdịda n’afọ 2019 nke ihe mgberede COVID kpalikwuru n’afọ 2020.

Kamgbe ahụ, sinima Naijiria na-agba mbọ ịnagachi n’usoro òtító a.

N’ihi nkea, onyeghị aka na ndị dịka Netflix na-akpatalụ ndị na-eme ihe nkiri ego dị ụ́kwụ́ karịa sinima. Há bịara na-akwụ há ihe dịka ego dollar puku iri itoolu ($90,000) màkà ịzụta ikikere igosị ndị mmadụ ihe nkiri há, maọbụ ọnụ ego karịrị ego dollar nde atọ nà puku narị asatọ ($3.8 million) ịrụ ihe nkiri ọfụrụ.

Na Naijiria, ndị na-emepụta ihe nkiri na ndị nwe sinima jì pasentị 40-40-20 eke ego há kpatara. Pasentị iri anọ ụzọ abụọ dị na ya na-agara ndị mepụtara nya bụ ihe nkiri na ndị nwe sinima. Pesentị iri abụọ fọrụ ga-abịa gaziere ndị mere ka ọ̀hà nụ maka nya bụ ihe nkiri nke ndị sinima na-egosị.

Nke a pụtara na ndị na-eme ihe nkiri na Naijiria anaghị enweghachitacha ego ha ụfọdụ mgbe site n’igosị onyonyo nà sinima.

Ọ kpatara nà há bịara gbakwuru ndị ngosị ịntanetị dịka Netflix.

N’otu aka ahụ, ụfọdụ ndị ụlọ sinima bịara bido iweli ọnụ ego tiketi há maọbụ bido ịrụ ihe nkiri n’onwe há iji nọrọ n’ahịa.

Ọrịrị ọnụahịa nà Naijiria nọ naj pasentị iri abụọ n’itoolu. Ọrịrị ọnụ ego diesel na ihe é ji esi ihe oriri dịka shuga nà ọ́kà emela ka ndi ụlọ sinima welie ọnụ ego tiketi ha.

Ego Naijiria na-ereta nà tiketi na-arị n’afọ kwa afọ. Mànà nke a bụ màkà nà tiketi adịgo ọnụ. Ọ bughị nà ọtụtụ mmadụ nà Naijiria azụbago tiketi ri nne.

“Ahịa kà anyị na-azụ. N’ezie, ọnụ ego tiketi anyị gbagọrọ. Mana o nwere ihe kpatara ya,” bụ ihe Patrick Lee, onye bụbu onye isi òtù Cinema Exhibitors Association of Nigeria (CEAN), kwùrù.

“Anyị welie ọnụ ego tiketi, ọ bụ màkà iwu gọọmentị nke na-ebute ọrịrị ọnụahịa. Nsogbu bụ na ụgwọ ọnwa ndị mmadụ anaghị àrị́ kà o kwesịrị.”

SINIMA NAIJIRIA Ọ̀ DỊ̀KÀRỊ̀CHÀRÀ Ọ́NỤ

TheCable kpọtụrụ Yinka Ade-Aluko, iji nata ya nnyocha ụlọrụ ya mèrè. Nke a bụ iji mata uche obi ya ó jiri kpebie na ọnụ ego tiketi sinima na Naijiria dịkarịchara ọnụ. Mànà nya bụ onye isi ụlọrụ Doodle Film Hub jụrụ, ma sị na ọ bụ màkà na ozi ahụ bụ nchopụta ozizo nyere ụlọrụ ya.

“Ọ bụrụ nà ị́ tulee ụgwọ ọnwa kachasịrị ńta nke bekee na-akpọ ‘minimum wage’ n’elu ọnụ ego tiketi sinima n’obodo dị che iche, maọbụ ọnụ ọgụgụ ńrétá tiketi n’elu pasentị ọnụ ọgụgụ mmadụ nọ nà obodo Naijiria, USA, nà India, ó dòrò ányá,” onye ahịa ihe nkiri à mechara kwuo.

Uche obi Ade-Aluko gbàsárá ihe dị nà “ọnụ ego” bụ̀ ịpịkọ ụgwọ ịgbata tiketi na sinima ọbụla dịka pasentị ụgwọ ọnwa gọọmentị kachasịrị dị nta n’obodo ọbụla.

Nke a pụtara na ụgwọ ọnwa puku naira iri atọ (₦30,000) na Naijiria, nke gafere dollar iri na asatọ ($18) n’ọnụ mgbanwe otu puku naira na narị isii n’iri isii n’ise màkà otu dollar, ya na ụgwọ nkiri Silverbird bụ puku naira asatọ (₦8000) nke pụtara dollar anọ na cent iri asatọ ($4.8), gosịrị na onye na-eje ile ihe nkiri ga-atụ anya imefu pesentị iri abụọ n’asaa na ụma asaa n’ime ụgwọ ọnwa ya.

N’otu aka ahụ, onye nkiri sinima ọbụla bụ́ nwa afọ obodo USA ga-emefu sọsọ otu pasentị n’ụma irí anọ n’isii (1.46%) n’ụgwọ onwa yá inwe ótù oghere ahụ.

TheCable lenyere anya n’ozi si nà ótù ihe nnyocha afọ 2021 màkà ọnụ ego tiketi sinima nà obodo iri abụọ nọ nà kọntinentị dị iche iche.

Anyị bịara tulee ọnụ ego tiketi sinima obodo iri abụọ à n’elu ụgwọ ọnwa kachasịrị dị nta nà há ncha niile, ébé uche obi anyị bụ̀ ịchọpụta mà ọ̀ bụ̀ eziokwu nà ọnụ ego ikiri onyonyo nà Naijiria kachasịrị dị ọnụ.

Venezuela, ebe ụgwọ ọnwa kachasịrị dị nta n’ọnụ ihe karịrị dollar anọ ($4) nke pụtara ego boliver otu narị na iri atọ (130 bolivers), pụtara dịka obodo ébé ọnụ ego tiketi sinima kachara dị ọnụ. Ọ́ gbàrà nà pasentị iri asaa n’anọ. TheCable chọpụtara nà obodo ndị tiketi óké ọnụ à kachasịrị metụta na-abụkarị ndị ụgwọ ọnwa há kacha péé m̀pé.

Okwu Ade-Aluko dịka ọ̀ hapụrụ ikwupụta ihe dị iche nà isi ego é ji azụta tiketi na ḿgbàkọ́tá ọnụ ego ihe ndị ọzọ dịgasị n’elu ya.

TheCable nyochara ozi ụlọ ọrụ ndị CEAN iji mata ọnụ ego tiketi nà-ada site n’afọ 2018 rụọ 2024.

Ihe anyị nwetara gosịrị na nkezi ọnụ ego tiketị n’afọ 2018 bụ otu puku naira na otu narị na iri atọ n’asaa (₦1138) nke mechara gbagoo ruo puku naira abụọ na narị ise na iri asaa n’otu (₦2571) nke pụtara otu dollar na cent iri ise n’anọ ($1.54) màkà ótù tiketi n’ọnwa Januwari nke afọ 2024.

Nnyocha amụma gosịrị na e rere ótù tiketi ihe dịka narị naira ise (₦500) n’afọ 2015.

Ihe ngosị ndị a anyị jiri gbakọọ bụ ‘A Tribe Called Judah’ n’ọnụ puku naira atọ nà narị itoolu na iri abụọ (₦3920), ‘Maliaka’ n’ọnụ puku naira atọ nà narị isii n’iri asaa (₦3670) na ‘Aquaman: The Lost Kingdom’ N’ọnụ pụku naira anọ na narị iri abụọ (₦4020) nke pụtara ego dollar abụọ na cent iri anọ ($2.4) n’ọnụ puku naira na narị isi n’iri isii n’ise (₦1665) maka otu dollar n’afọ 2024.

Ụ́ZỌ̀ KÁ ḾMA ÍJI GBÀKỌ́Ọ́ Ọ́NỤ́ EGO TIKETI

Ope Ajayi, onye nwe ụlọ ọrụ nkesa ihe nkiri bụ́ Cinemax mà bụrụkwa onye isi ndọkwa sinima Genesis nà mbụ, tara ụkwa jaa eze mgbe a sịrị ya tinye ọnụ n’okwu ahụ Ade-Aluko kwuru.

“Echeghị m na onye ahụ mere nnyocha ya ọfụma,” onye azụmahịa sinima à kwuru.

Patrick Lee, onye ọkachamara n’azụmahịa ihe nkiri, gbarụrụ ihu nyé echiche iji ụgwọ ọnwa dịkarịchara nta wèré gbakọọ ezi ọnụ ego tiketi sinima.

Ọ gbakwunyere na ọ̀ ụughị onye ọbụla na-aga sinima na-erita ụgwọ ọrụ gọọmentị dịkarịchara nta.

“Ole ndị na-aga sinima? Ndị ọrụ nwere ego? Nke a bụ eziokwu,” o kwuru.

“Mana anyị ọ̀ nabatara na naira iri atọ (₦30,000) bụ nkezi ụgwọ ọnwa gọọmentị dịkarịchara nta? Ò nweghị ihe aka ebe kwadoro na ọ bụ ọnụ ego à kà onye ọbụla na-anata, nke mere ó jiri ghàrá ịdị mfe iji ụgwọ ọnwa à tulee obodo ndị ọzọ.”

N’ihi nke à, TheCable mere nnyocha ọzọ, iji wepu nkewa dị na ụgwọ ọrụ ndị Naijiria.

Anyị were nkezi ọnụ ego tiketi anyị nwetara mbụ, gbakọọ ya dịka pasentị GDP per capita màkà ótù ọnwa n’obodo iri abụọ anyị jiri mee nnyocha à.

GDP per capita bụ ótú ndị ọkachamara ego si agbakọ nrụpụta maọbụ ákụ̀ n’ụba obodo màkà ótù onye. Inweta nke a, há na-eji ọnụ ọgụgụ mmadụ nọ nà obodo, kèwáá akụ n’ụba obodo ahụ nwètèrè n’otu àfọ̀.

Inweta ihe nke à gbàrà n’otu ọnwa, há na-abịa jiri iri n’abụọ kewakwuo mpụta ya.

Lebanon pụtara dịka obodo dịkarịchara ọnụ. Ọnụ ego tiketi na nya bụ obodo ga-erite ruo pasentị asaato n’ụma iri isii n’anọ (8.64%) GDP per capita màkà ótù ọnwa.

Obodo ọzọ sochiri ya bụ Cambodia nke pụtara pasentị asaa na ụma iri asatọ n’anọ (7.84%). Mali pụtara pasentị isii n’ụma iri anọ na ise (6.45%). Kenya gbàrà pasentị anọ na ụma iri asaa n’otu (4.71%).

Naijiria no na ọnọdụ nke ise n’usoro a. Ọ́ gbàrà na pasentị atọ n’ụma iri atọ n’asaa (3.37%).

ŃSÒGBÚ ŃJỌ́ÁHỊ́A

Dịka Ade-Aluko kwuru, TheCable jiri ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ nọ nà Naijiria tulee ndị nkiri òlé gara sinima bido n’afọ 2015 ruo 2023.

Anyị nwetara ọnụ ọgụgụ ndị nkiri sinima n’aka akwụkwọ akụkọ Inside Nollywood.

Anyị bịaziri tụnyere nke à n’ọnụ ọgụgụ ndị obodo Naijiria nà afọ niile ahụ, site n’ozi anyị nwetara n’aka ọba ozi Statista.

Anyị tụrụ anya nà ótù orire tiketi sinima n’otu afọ bụ nke ótù onye zụrụ, n’agbaghaghị na ótù onye nwere ike ịga sinima karịa ótù ugboro n’afọ ọbụla.

Ihe anyị chọpụtara gosịrị na sinima Naijiria nwèrè njọ ahịa dị iche.N’afọ 2023, naanị ótù pasentị na ụma iri n’isi (1.16%) ndị obodo ka Naijiria nwetara dịka ndị nkiri sinima n’ime mmadụ nde narị abụọ na iri abụọ n’isi (226 million).

Iji tee obodo ndị ọzọ, ozi anyị nwetara kwuru na sinima nọ na USA nke bụ Hollywood retara tiketi nde narị asaato na iri anọ n’itoolu, puku narị ise n’iri itoolu na asatọ, na narị isii n’iri isii n’otu (849,598,661) n’afọ 2023. USA nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ nde narị atọ na iri atọ na puku narị itoolu na iri itoolu n’isi na narị ise n’iri isii n’atọ (339,996,563) n’afọ ahụ, nke ga-etinye ọnu ọgụgụ mmadụ gara sinima nà pasentị narị abụọ na iri anọ n’itoolu na ụma iri asatọ n’asatọ (249.88 %).

N’afọ 2020, India retara tiketi nde narị itoolu na iri asatọ n’otu (981 million). Site n’ọnụ ọgụgụ mmadụ otu ijeri, nde narị anọ na iri n’asaa, otu puku na iri asaa n’atọ, nà otu narị n’iri asaa n’atọ (1,417,173,173), pasentị iri isii na itoolu n’ụma iri abụọ n’abụọ (69.22%) gara sinima nà India n’afọ 2022.

Naijiira enwebeghị mgbe ọ bịara ǹsó ruo ọnụ ọgụgụ ndị a, n’agbanyeghị na ahịa mmepụta ihe nkiri na Naijiria bụ ndị nke abụọ kacha emepụta ihe nkiri n’ụwa niile.

Nchọpụta ndị à metụtara òtú ndị Naijiria si ahụta omenala ịga sinima, íhé omume ndị ụlọ nkiri, nà ọnọdụ obodo. Mànà ò metụtaghị ngara ọnụ ticket sinima nà Naijiria kpọmkwem, dịka Ade-Aluko chọrọ ikwu.

ḾKPÉBÌ

Ijiri ụgwọ ọnwa gọọmentị dịkarịchara nta tulee ya, ọnụ ego tiketi sinima Naijiria adịkarịchaghị oke ọnụ n’ụwa niile.

Ijiri GDP per capita màkà ótù ọnwa tulee ya, ọnụ ego tiketi sinima Naijiria adịkarịchaghị oke ọnụ n’ụwa niile.

Obodo dị iche iche nwere ọnọdụ akụ n’ụba nke há, nke na-emetụ ọnụ ego tiketi sinima na-ada. Ndị ụlọ nkiri onyonyo nwekwara ọnụ ego dịkarịchara nta há na-akpachara anya ijiri nọdụ n’ahịa.

Nchọpụta anyị niile na-átụ̀ aka n’otu ebe. Ọ́ bụ̀ asị ikwu na tiketị sinima Naijiria dịkarịchara oke ọnụ n’elu ụwa niile.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.