Monday, April 29, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Ònyònyò ébé ńdị́ na-eme ńgághárị́ íwe na agbataobi Emir Ilorin dị̀ óchíè

Ònyònyò ébé ńdị́ na-eme ńgághárị́ íwe na agbataobi Emir Ilorin dị̀ óchíè
February 25
12:06 2024

N’ụbọchị Satọde, ótù ihe onyonyo ebe ndị na-eme ngagharị iwe na agbataobi Emir nke Ilorin na steeti Kwara pụtara ihe n’ọtụtụ ebe na soshal midia.

N’ime ihe onyonyo a, ọtụtụ ndị a n’eme ngagharị iwe a bụ ndị ntorobịa ndị anụrụ ka ha ekwu n’olu Yoruba, “Ebin palu”(agụụ dị na obodo)”.

Ihe ngosị a ngwa-ngwa gazụrụ ebe níílé na soshal midia, ebe ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na nya bụ ngagharị iwe mere na ụbọchị Satọde nke ha sị na ọ bụ ajọ ọnọdụ obodo Naijiria kpatara ya.

Naijiria na-agabiga ịma-aka n’ahụ na nchekwa obodo, mgbádà úrù égó Naira, ya na nwelị ọnụ ego na-ere ụfọdụ ihe.

Advertisement

Nke a ebutela ọtụtụ ngagharị iwe na ọtụtụ akụkụ steeti dị na Naijiria.

N’ụbọchị ise nke ọnwa Febụwarị, ụfọdụ ndị bị́ na Minna, ísí steeti Niger, mechiri ọtụtụ okporo ụzọ na ngagharịwe n’obodo Kpakungu, iji gosi ọnọdụ ihe isike na Naijiria.

Ka ụbọchị ole na ole gachara, ndị Suleja LGA nke steeti ahụ n’otu aka ahụ bidoro ngagharị iwe megide oke ọnụ ibi ndụ na Naijiria dị.

Advertisement

N’otu aka ahụ, n’ụbọchị iri nke ọnwa Febrụwarị, ụfọdụ ndị na-ere ahịa bidoro ngagharị iwe maka ọnu elu ibi ndụ dị na Naijiria.

Ụmụ nwanyị ndị a bù ihe akwụkwọ edegasịrị “Nna Tinubu, agụ na-agụ ndị Naijiria”, na ” Tinubu, bịa zọpụta anyị”, n’ime ihe ndị ọzọ ha dere.

ŃGÁGHÁRỊ́ ÍWE À Ò MÈRÈ NÀ ǸSÓ ǸSÓ A?

TheCable chọpụtara dịka anyị nyochara ihe onyonyo a ọfuma, ya na inyocha ebe esere ihe onyonyo ahụ ma kweta na ebe esere nya bụ ihe ngosị bụ n’ụlọ Emir nke Ilorin.

Advertisement

Mana TheCable chọpụtara, ka anyị mechara ọtụtụ nnyocha na soshal midia, na ọ bụ naanị ótù ihe ngosị a ka ahụtara n’ìgwè soshal midia, nke mere ka anyị na-enyo ya n’onwere ike ịbụ asị.

Ótù onye na X, @omoelerinjejare, dere ” ọzị mberede: ezigbo ngagharị iwe n’óbị̀ Emir nke Ilorin nke Kwara steeti! “Steeti anyi nọ na-ágụ́”.

Mbipụta a nwetara nkiri karịrị ihe karịrị puku narị atọ na iri isii (360,000), nkesa karịrị puku abụọ na soshal mịdia.

Onye ọzọ na X @_weyimi dere “Ọbidola!!! N’óbị̀ Emir nke Ilorin| anyị nụrụ ka ha n’ekwu na “Agụ n’ágụ́ anyị” obodo n’ala n’ihi”.

 

Mana nà nnyocha ọzọ anyị mere, TheCable chọpụtara n’ọtụtụ ndị mmadụ ekesala ótù ihe ngosị a na soshal midia na 2021.

 

 

Ọzọkwa, na mbipụta na Sunday, Ibrahim Sulu Gambari, Emir nke Ilorin, kwuru n’ihe ngosị ahụ dị ochie n’ọbụghị maka ọnọdụ Naijiria nọ n’ime ya ugbua.

“Anyị anụla maka ihe onyonyo dị ebe niile na soshal mịdia, ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-étị́ ma na ákwá ákwá arịrị gbasara ubiam n’ihe ịsị ike n’ihu ụlọ Emir nke Ilorin,” ozi a dere.

“Anyị chọrọ ikwu n’ihe onyonyo a, bụ ihe sị na ntụli aka emere na 2019.

“Ihe onyonyo a, enweghị ka-osị gbasata ọnọdụ obodo Naijiria nọ n’ime ya ụgbụ a, m’ọbụrụ na ihe dị otú a dị, Emir nke Ilorin na onye ịsị oche ndị eze ọdịnala na Kwara bụ Alhaji Ibrahim Sulu-Gambari, ga-agbọ mgbọ hụ ihe emere maka ya, ịjị kwalịte ụdọ n’ịbị n’otu na n’obodo Kwara.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe onyonyo ngagharị iwe a nke ndị mmadụ sị na o mere na Satọde bụ nke na-emeghị nso-nso a.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.