Saturday, April 27, 2024
MARKET UPDATE
Advertisement Topt

TheCable

Advertisement lead

Timipre Sylva ò kèlèrè Douye Diri kà á zọ̀chàrà ọ́kwá gọ́vanọ̀ nà stéeti Bayelsa

Timipre Sylva ò kèlèrè Douye Diri kà á zọ̀chàrà ọ́kwá gọ́vanọ̀ nà stéeti Bayelsa
November 26
07:56 2023

Íhé ngosị ébé Timipre Sylva, onye bụbu minista na-ahụ màkà mmanụ petrol nà steeti Bayelsa, na-ekwe Douye Diri, gọvanọ Bayelsa, n’aka apụtala nà soshal mịdia.

Dịka ndị bipụtara ya bụ ihe ngosị sìrì kọwa, Sylva na-ekele Diri, kà Diri meriri nà ntuli aka há mere nà Bayelsa n’ụbọchị Saturday.

Diri, onye zọrọ ọchịchị n’okpuru òtù People’s Democratic Party (PDP), nwetara votu puku ótù narị n’iri asaa n’ise nà ụma ótù narị n’iri itoolu na isii were merie Sylva nke All Progressive Congress (APC), onye nwetara votu puku ótù narị na iri n’ụma ótù narị na asatọ.

Ihe ngosị à bịara nwee ọtụtụ ntụnye ọnụ na soshal mịdia, ọkachasị nà X, ebe ó nwetara nkiri na ntụnye ọnụ karịrị ótù puku.

Advertisement

“Chief Timipre Sylva, onye ji parti APC azọ ọkwa gọvanọ, ekelela Gov Douye Diri. Biko ánụ̀kwàlà n’agha dị n’etiti há. Kedu màkà ndị tufuru ndụ ha n’efu. Ọ dị ńwúté,” íhé à kà onye ji X ezisa ozi dere.

 

N’ihe ngosị à ekesara ofụma, á hụrụ Sylva kà ọ na-ekwe Diri n’aka ọfụma, dịka há nà-àkpá ńkàtá anaghị anụ ihe há na-ekwu.

Advertisement

Onye ọzọkwa ji X ezịsa ozị dere sị: “Chief Timipre Sylva, onye ji APC azọ ọkwa gọvanọ Bayelsa state, ékèlélá Gọvanọ Douye Diri nke parti PDP na mmeri o meriri na ntuli aka ọkwa gọvanọ. Ndị nwuru dịka a na-eme ntuliaka #BayelsaDecides2023 nwụrụ n’efu. Ihe mara mma ebe à bụ na Gọvanọ Diri ga-etinye obi na mmepe steeti Bayelsa.”

ÍHÉ Ó JÌRÌ DỊ́ ḾKPÀ ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ À

N’agbanyeghị na enweghị onye íro nke ebighebi nà ndọrọndọrọ ọchịchị, Sylva nà Diri ejighị anya ahụ onwe ha, kà ntuliaka okwa gọvanọ steeti Bayelsa gachara.

N’ụbọchị ntụli aka ahụ, Diri tara Sylva ụta, mà bóó ya ebubo nà ọ́ kwanyere ọ́kụ́ ọgbaghara mgbe á na-atụ votu.

Advertisement

“Timipre Sylva bụ onye tigbuo zọgbuo kamgbe ndụ ya n’ihe gbasara ntuliaka. Cheta nà onye ǹdú agbụrụ Ijaw, nke bụ́ Edwin Clark, dègàrà yá akwụkwọ kà ọ̀ chọghị ịhapụ iji áká íke azọ ọchịchị,” íhé à kà Diri kwùrù kà ọ́ tụchara votu ya.

“K’osiladi, Chineke nọ n’igwe. Anyị na-akwubido ajọ ụzọ ọ na-eji emeri na ntuliaka.”

Advertisement

N’aka nke ya, Sylva kwụrụ na PDP kpatara ọgbaghara mgbe á na-eme ya bụ ntuli aka. Ọ kọwara na “ndị nchekwa obodo na-akwụnyere ndị òtù PDP”.

“Enwere ọtụtụ ọgbahara ebe ndị PDP na-achọ ịmerụ ndị bịara ịtụ votu ahụ, sịte n’enyemaka ndị nchekwa obodo. K’ọdi ugbua, anyị kwenyere na ndị anyị na-àmá aka bụ ndị nchekwa obodo. Ọ bụzighị PDP. Mana anyị na-ebeleta ya bụ m̀pụ́” Sylva kwuru.

Advertisement

ŃNYÒCHÁ

TheCable nyochara ákùkù niile nke ihe nkiri ahụ, nke gosịrị nà ebe ahụtara ya m̀bụ́ bụ̀ n’otu asafe na TikTok á kpọrọ GbaramatuTV. Ihe ngosị ahụ bụ nke GbaramatuTV bipụtara n’ọnwa May 2023, afọ isii tupu emee ntuli aka Bayelsa.

Advertisement

Ihe ngosị ahụ bịara nwee isiokwu sonyere ya, nke gụrụ, “HE Timipre Sylva gara akwam’ozu nna Douye Diri na Sampou.”

Nna Diri, Pa Abraham, onye isi ụlọ akwụkwọ nà mbụ, nwụrụ n’ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Febụwarị nke afọ 2023. Ọ gbara afọ iri asatọ n’asatọ. É liri ya n’ụbọchị isii nke ọnwa May.

Asafe TikTok à bụ́ Gbaramatuvoice TV nwèrè ọtụtụ ihe ngosị mmemme, nke dịka agbam akwụkwọ ya nà ụbọchị ncheta agbama akwụkwọ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ihe ngosị ahụ dị ochie. Ọ bụghị ihe ngosị ebe Sylva na-ekele Diri màkà mmeri ya na ntuli aka gọvanọ emere nà Bayelsa.

E sere ya bụ ihe ngosi mà bipụta ya n’ọnwa May 2023, mgbe Sylva gara ị́kwàdó Diri n’ọnwu nna ya.

N’agbanyeghị na Diri kelere Sylva, maka udo á hụtara nà ntuli aka ahụ, parti APC ajụla ịnabata mmeri Diri meriri, ma gwa INEC kà ó jiri ótù izu ụka, lebanye anya na mpụta ya bụ ntuli aka.

Click on the link below to join TheCable Channel on WhatsApp for your Breaking News, Business Analysis, Politics, Fact Check, Sports and Entertainment News!

Tags

0 Comments

No Comments Yet!

There are no comments at the moment, do you want to add one?

Write a comment

Write a Comment

error: Content is protected from copying.