Advertisement

Ḿbà, Woodberry ápụtàbèghị̀ nà ǹgá

Ótù ozi na soshal midia ekwuola na Olalekan Ponle, onye a mara dịka Woodberry, apụtala na nga.

Ozi a nwetara nkiri puku iri n’anọ (14,000 views), nkwenye narị abụọ n’ụma iri n’atọ (213 likes), ya na nkesa iri asatọ n’atọ (83 reposts).

ÒNYÉ BỤ̀ WOODBERRY?

Woodberry bụ ótù onye a mara ọfụma na ịntanetị Naijiria, ma bụrụkwa ezi ényì Ramon Abbas, onye a mara dịka Huspuppi, onye Naijiria ọzọ a tụrụ ǹgá maka ígwù ndị mmadụ wayo n’onwa November nke 2022.

N’ụbọchị iri nke ọnwa June nke afọ 2020, ndị uwe ojii nwụchiri mmadụ abụọ a na Dubai nke dị n’obodo United Arab Emirates maka igwu ndị mmadụ wayo na ịntanetị.

Advertisement

A bịara kpọga mmadụ abụọ mba United States ikpe ha ikpe.

Woodberry, onye a sịrị na o siri n’ụzọ n’ezighị ezi napụta ótù ụlọrụ nọ na US ego ruru ótù puku dollar ótù narị na iri asaa n’asaa ($188,000), gọnayiri nya bụ ebubo ruo afọ abụọ.

K’osiladị, ọ gbanwere ọnụ, ma kweta na o mere ótù ebubo nrụrụ áká nke eji ụlọ ọba ego èmé bụ “wire transfer fraud” n’ọnwa April 2023 n’ụlọ ikpe US District Court nke Northern Illinois.

Robert Gettleman, onye ọka ikpe n’okwu ahụ, nabatara mgbanwe à Woodberry mere n’ụbọchị asatọ nke ọnwa April ebe ọ nọrọ maa ya ikpe maka ebubo asatọ.

Advertisement

N’ụbọchị iri n’otu nke ọnwa Julaị, a tụrụ Woodberry mkpọrọ afọ asatọ, ma nye iwu ka ọ kwughachie nde dollar asatọ nye mmadu asaa o gwuru wayo.

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

Advertisement

Inyocha okwu a mà chọpụta ebe Woodberry nọ, TheCable lebara anya n’ime akwụkwọ ndekọ ụlọ nga Federal Bureau of Prisons.

Nya bụ akwụkwọ ndekọ aha ndị mere mpụ na-egosị aha, afọ, ébé, na mgbe ndị a kpọchiri na nga ga-apụta.

Advertisement

Ihe anyị chọpụtara gosịrị na Woodberry nọ n’ụlọ nga Fort Dix Federal Correctional Institution. Ha dere na ụbọchị mpụta ya bụ n’ọnwa Ọktoba nke afọ 2027, afọ abụọ tupu Huspuppi emecha nga nke ya.

 

Advertisement

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu na Woodberry apụtala na nga bụ asị.

Site n’ozi si na US Federal Bureau of Prisons, Woodberry kà nọ na nga na-eme nga afọ asatọ.

Add a comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: Content is protected from copying.